Transatlantic Slavery: Ndị ụka Anglican ekwetela na ha tinyere aka na mgbere ohu n'Afrịka

Ebe foto si, Getty Images
N'ime akwụkọ ozi ndị ụka Anglican nke England depụtara ka ha kwuru na n'ezie na aka ha dị na mgbere ohu agbara site n'Afrịka gaa mba ndị ọzọ n'ihe dịka ebe afọ 1800.
Nke a sitere na ihe nyocha emere maka akwụkwọ ndị ụka a ji edokwa ego ka a chọpụtara nke a.
Nchọpụta a gosiri na ọ bụ ngalaba Church Commissioners bụ nke ehiwere maka ịdọkwa ego eji arụ ọrụ ịzịsa ozioma wepụtara ya bụ ego ha ji kwado ịgba mgbere ohu site na mpaghara ndịda anyanwụ Afrịka maka uru ahịa.
Lee ihe anyị maka mkpughe ọhụrụ a
- Uka Anglikan tinyere ọtụtụ ego ịjị kwado ma rite uru na mgbere ohu site n'Afrịka
- Ọ bụ ngalaba Church Commissioners ndị ọrụ ha bụ ihazi ego ndị ụka mere nke a oge ochie.
- Ọ bụ akpa ego nke Queen Annes Bounty nke ehiwere n'afọ 1704 ka ha siri wepụta ego a ha ji gbaa mgbere ohu.
- Ọnụ ego nọ n'akpa Queen Annes Bounty ugbua bụ ijeri pawụnd iri na otu ụma.
- Ndị nyocha chọpụtara nke a mgbe ha na-enyocha akwụkwọ ndekọ ego edere n'ihe karịrị afọ 200, nke ha hụrụ n'ime Lambeth Palace bụ ebe obibi Archbishop Canterbury.
- Ha nyere ụlọọrụ South Sea Company ego a iji gbaa mgbere ohu ma rite uru.
- South Sea Company bụ ụlọọrụ eji ịgba mgbere ohu mara mgbe ochie
- Ha nwetekwara ọtụtụ nkwado n'aka ndị ritere uru site n'ịgba mgbere ohu.
Ihe ndị Uka Anglikan na-ekwu maka ya ugbua?
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ndị ụka Anglican wepụtara akwụkwọ ozi n'ụbọchị Tuzde ebe ha nọrọ rịọ mgbaghara maka etu aka ha siri kwado ịgba mgbere ohu site na mpaghara ndịda anyanwụ gawa Yurop na ebe ndị ọzọ.
Onyeisi ụka Anglican bụ Justin Welby ma bụrụkwa onyeisi Anglican Community ụwa niile kwuru sị," O wutere anyị nke ukwu".
Welby gara n'ihu kwuo, " Oge eruola mgbe anyị ga-eme ihe maka ihe ihere anyị mere oge ochie".
N'aka nke ọzọ ka ngalaba Church Commissioners kwuru sị, " Enweghị ihe ọbụla anyị ga-eme ugbua kamgbe afọ narị pụrụ narị gachara ga-enyeghachi ndị a erepụrụ n'ohu ndụ ha ọzọ".
Ha gara n'ihu sị, " Anyị kwetara na ịgba ohu bụ ihe jọgburu onwe ya ọkachasị mgbe aka ụka dị na ịgba ohu site n'Afrịka gawa Yurop na ebe ndị ọzọ. Kama anyị ga-esite n'ihe anyị na-ekwu chọwa ụzọ anyị ga-esi nyere aka maka ihe mpụ a butere".
Ihe ndị uka Anglican ga-ebido mewe ugbua

Ebe foto si, Archbishop of Canterbury/Twitter
Ngalaba Church Commissioners ewepụtala nde naịra otu narị dịka ụzọ ịkwado mpaghara ndị ịgba ohu mgbe ochie metụtara.
Ha kwuru na ha ga-ekesa ya bụ ego n'ime afọ itolu.
Gịnị bụ Transatlantic Chattel Slave

Ebe foto si, Iwaria
Transatlantic Chattel Slave bụ mgbere ohu nke a sitere n'Afrịka ree ihe ruru mmadụ nde 12 ruo nde 15 site n'afọ 1500 ruo afọ 1800.
Erere ụmụ Afrịka ndị a ga ha gawa rụo ọrụ dịka ohu na mba Caribbean, North America, Central America, ụfọdụ ene na Europe na South America.
A na-eche na ihe ruru ndị a na-ere mmadụ nde abụọ nwụrụ na njem a nke a kpọrọ Middle Passage.
Ịgba mgbere ohu a mere ka ọtụtmba nke gụnyere Briten baa ụba ebe ọ dị ukwu.
Ọdọ ụgbommiri nke London, Liverpool na Bristol bara ụba nke ukwu maka mgbere ohu.









