'O nweghi ịlaghachi azụ anyị nwere' - ndị mere njem Yurop n'ụkwụ

Aha onyonyo, "O nweghi ịlaghachi azụ anyị nwere" - ndị mere njem Yurop n'ụkwụ

Kwa afọ, puku kwuru puku ndị ntorọbịa Afrịka na-eme njem siri ike iji ụkwụ febanye mba Yurop.

Ike Nnaebue na-arụpụta ihe onyonyo na Nollywood nwara njem ahụ afọ iri abụọ gara aga.

Ugbua, ọ laghachiri ị ga hụ etu ndị ọhụrụ na-eme njem ahụ si eme ebe ha nọ. Ọ na-anụ maka ihe kpalitere mmụọ ha ime ya bụ njem nakwa olileanya ha bu n'obi iru ebe ha na-aga.

Africa Eye
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Ihe ọzọ ọ hụrụ ebe ahụ bụ ọdachi niile chere ha n'ụzọ njem ahụ: site na ndị na-agba mgbere mmadụ, rue na ndị e zuru ohi nakwa ndị ego gwụrụ n'aka.

Ụfọdụ n'ime ndị a eruola mba Moroko mana Yurop ka na-eme ha ọ nọ nso eru aka. N'ihe onyonyo a, Afrịka Eye esila Naịjirịa gaa Moroko iji hụta ụfọdụ ahụhụ ndị ahụ na-ata n'ụzọ.