Ihe ise mere ndị mmadụ ji eme 'japa' na Naịjiria

Ọtụtụ ndị ntorobịa na-agbapụ Naịjriịa dịka ha na-ekwu na ihe na-esiri ha ike na Naịjirịa.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị ntorobịa na-agbapụ Naịjriịa dịka ha na-ekwu na ihe na-esiri ha ike na Naịjirịa.
    • Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist

Kemgbe ọnwa ole na ole ugbua, ihe na-ewu n'ọnụ ụfọdụ ndị Naịjiria bụ etu ha ga-esi si Naịjiria gbaga mba ofesi.

Mba ndị kacha ewu ewu nke ọtụtụ n'ime ha na-achọ ụzọ ha ga-esi gbaga gụnyere UK, Amerịka, Canada, Australia, New Zealand nakwa ụfọdụ mpaghara Yurop ndị ọzọ.

Ọtụtụ n'ime ndị na-agbapụ na-achọ ụzọ ha ga-esi "gaa gụọ akwụkwọ" na mba ofesi, dịka ha hụrụ na nke a abụrụla otu ụzọ dịtu mfe mmadụ ga-esinwu gafee mba ofesi.

Mba UK wepụtara akwụkwọ ozi gosiri na ndị ha nyere akwụkwọ ikike ịnọ na mba ha gụọ akwụkwọ (student visa) n'afọ 2022 ji ọtụtụ pasentị karịa ndị ha nyere n'afọ 2021. Nke a na-egosi na ndị wụbatara mba ha ịgụ akwụkwọ riri elu karịa na 2022.

UK Home Office data

Ebe foto si, UK Home Office

Nkọwa foto, Akwụkwọ ozi si n'aka ụlọọrụ na-ahụ maka ndị ọbịa na UK bụ UK Home Office.

Ụfọdụ ndị ọzọ bụ ndị gbara mbọ nweta ọrụ nyere aka kpọfee ha mba ofesi.

Ngụkọ a si n'aka mba UK gosiri mmadụ ole ha nyere akwụkwọ ikike ịrụ ọrụ na mba ha (work visa) rikwara elu. Mba Naịjirịa bụ mba nọ n'ọwa atọ n'ime mba ndị ozo e nyere ikike ịrụ ọrụ na UK.

UK Home Office data

Ebe foto si, UK Home Office

Ihe mere ndị mmadụ ji agba ọsọ 4-40

'Japa', nke bụ otu ụzọ ndị Yoruba si ekwu "ịgbapụ ọsọ", bịara dị ka ihe na-ewuru ndị Naịjirịa na soshal midia ọkachasị ndị ntorobịa nke ọtụtụ n'ime ha kwuru na afọ ejula ha ibi na Naịjiria.

Ha kwuru na ọ bụ etu ọnọdụ Naịjiria dị ugbua mere ka ha chọrọ ụzọ ha, iji nye onwe ha ohere ịga mba ebe ihe na-aga ọfụma nakwa "ebe ụmụ anyị ga-enwe ohere ibi ndụ bara uru."

Lee ihe ise kacha anụ ndị mmadụ ọkụ n'obi mere ha ji eri mbombo ọsọ:

  • Ọnọdụ nchekwa Naịjirịa: Ọtụtụ ndị na-agbapụ ọsọ na Naịjirịa ekwuola na ọnọdụ enweghi ezi nchekwa Naịjiria nọ n'ime ya bụ ihe kacha achụ ha ọsọ. Nke a si n'ụdịrị akụkọ na-apụta aghara aghara kwa ụbọchị site n'Ugwu ruo na Ndịda Naịjirịa gbasara mwakpo, ntọrị na ogbugbu ndị mmadụ na Naịjiria. Iji maa atụ, ozi UN zipụtara na nso nso a kwuru na n’ebe ngwụcha afọ 2020 na mwakpo si n’aka otu Iswap na Boko Haram, tara isi ihe ruru mmadụ 350,000 ma mee ka mmadụ nde kwuru nde bụrụ ndị gbara ọsọ ndụ ma ghara inwe ebe obibi na Naịjirịa. Naịjirịa danyere n'ọnọdụ enweghị nchekwa pụrụiche dịka otu ndị ojiegbe dị iche iche malitere na-akpa ike dịka ha na-awakpo ma na-atọ ndị ọrụ nchekwa, ndị ọchịchị nakwa ndị nkiti. Gọọmentị Naịjirịa akatọọla mwakpo ndị a ma kwuo na ha na-gba mbọ ịmemina ndị omekome ndị a ma weghachịte udo na Naịjirịa mana ihe na-ebe kana ebe.
Ndị nọ n'ime ụgbọelu
Nkọwa foto, Ọnọdụ enweghị nchekwa so n'isi sekpụ ntị mere ndị mmadụ ji agbapụ Naịjirịa ugbua.
Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

  • Nlekọta Ahụike: Ọtụtụ ndị mmadụ ekwuola na ọ bụ 'obere ọrịa' na-ekwesịghị igbu mmadụ na-ememila ndị mmadụ na Naịjiria. Nke a bụ n'ihi etu ọnọdụ ọrụ ahụike na Naịjirịa dị. N'ọnwa Ọgọọst 2022, otu jịkorọ ndị dọkịnta welitere isi na Naịjirịa bụ Nigeria Association of Resident Doctors kwuru na 6 n'ime 10 ndị dọkịnta Naịjirịa na-akwado ịpụ dịka ọtụtụ ndị otu ha pụrụla. Nke a metụtakwara ndị nọọsụ na ndị ọrụ ahụike ndị ọzọ. Otu onye dọkịnta gbapụrụ ọsọ gbagaa mba Ireland na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo 'Ọ bụ ihe mwute na m gbapụrụ Naịjirịa dịka ọnọdụ ọrụ ahụike Naịjirịa na-akpụ afọ n'ala ugbua.' Ọ ghara amasị m ịnọ nyere ndị mmadụ aka mana ndị gọọmentị anaghị elete ndị ọrụ ahụike anya dịka ha na-eji anyị ụgwọ aghara aghara.' Egọ gọọmentị Naịjirịa wepụtara na bọọjeetị maka mwulite ọrụ ahụike n'afọ ole m ole gara aga kpọrọ afọ n'ala karịa ntuzi aka ndị isi ọchịchị mba dị iche iche n'Afrịka kpebiri, mkpebi nke a kpọrọ 'Abuja Declaration'. Nke a pụtara na ọrụ ahụike na Naịjirịa na-akpụ afọ n'ala nke mere ndị mmadụ ji awụpụ ma awụga mba ebe ọrụ ahụike na-aga nke ọma maka ọdịnma ha na nke ezinụlọ ha. Ọtụtụ ndị ọchịchị Naịjriịa enwetela nkatọọ n'okwu a dịka ha anaghị aga ụlọọgwụ ndị dị na Naịjirịa ma ha rịawa ọrịa ma ha na-awụgaa mba ofesi. Nke a gụnyere onyeisiala Muhammadu Buhari, aka chịbụrụ Legọs bụ Bola Tinubu, nakwa na nso nso nwa Sịnetọ Ike Ekweremadu.
  • Ndakpọ agụmakwụkwọ: Ọtụtụ ndị mmadụ ekwuola na agụmakwụkwọ akpụọla afọ n'ala na Naịjiria. Iji maa atụ, otu jikọtara ndị nkuzi mahadum na Naịjiria bụ Academic Staff Union of Universities (Asuu) na-agba abụbụ ọrụ kemgbe ọnwa Febrụwarị afọ 2022, nke a mere e ji gbachịe ọtụtụ mahadum kemgbe ọnwa asaa gara aga. Nke enyeghi aka n'ime ka ndị mmadụ nọrọ Naịjriịa dịka ha na-agbapụ ebe ha ga-enweike gụọ akwụkwọ nke ọma. Ọnọdụ enweghị nchekwa sokwa emetụta agụmakwụkwọ na Naịjirịa dịka otu ndị ojiegbe dị iche iche na-atọrọ ụmụakwụkwọ aghara aghara ma na-awakpo ụlọakwụkwọ dị ịche ịche. Na nso nso a, ọtụtụ katọrọ onyeisi ụlọ omeiwu nta Naịjriịa bụ Femi Gbajabiamila maka etu o siri zipụta ozi mmalite agụmakwụkwọ ya na mba Amerịka. Ndị mmadụ tụrụ ya aka ma kwuo na ndị ọchịchị dị ka ya ma na agụmakwụkwọ Naịjirịa na-akpụ afọ n'ala nke mere ha na ụmụ ha ji agbapụ agbaga ofesi maka agụmakwụkwọ mana ha anaghị eji ikike ọrụ ha mezie agụmakwụkwọ Naịjirịa. Gbajabiamila zipụtara ozi saa ndị a ma rịọ mgbaghara maka iwe ha.
Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2

  • Ọchịchị: Ọtụtụ ndị mmadụ ekwuola na ọnọdụ ọchịchị so achụ ha ọsọ eru ala n'ala Naịjiria. Ọtụtụ ozi na-apụta nke na-egosi na ndị ọchịchị na-agba ọnyụpa n'ọrụ ha nke gụnyere etu ha siri elekọta ego gọọmentị, etu ha siri elekọta ndị ha na-achị nakwa ebubo ndị na-apụta maka etu ha si etinye aka na nrụrụaka nakwa mpụ. Otu onye gbapụrụ Naịjirịa gbagaa ma Jamịnị aha ya bụ Chima Sanchez gwara BBC Igbo na ọ bụ iwe etu ndị ọchịchị Naịjirịa si eji aka ike achị ndị mmadụ n'oge ọchịchị onye kwuo uche ya a bụ ihe mere o jiri foro ntụtụ taa ma gbapụ Naịjirịa. Ọ tụrụ aka na ihe gbawara ya obi nke mere o ji pụọ Naịjirịa bụ mmachị gọọmentị Naịjirịa machiri Twitter n'afọ 2021. O kwuru na agwa ahụ egosighị nkwado ọchịchị onye kwuo uche ya. Na nso nso a, ụlọọrụ EFCC na-egbuso mpụ agha wepụtara aha ma wuchịe onye odebego gọọmentị etiti bụ Ahmed Idris maka ebubo izufe ego gọọmentị ruru ijeri N109.4.
Ọnụ ahịa nrị na ihe ndị ọzọ eji ebi ndụ arịala elu nke ukwuu na Naịjriịa kemgbe afọ anọ gara aga.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọnụ ahịa nrị na ihe ndị ọzọ eji ebi ndụ arịala elu nke ukwuu na Naịjriịa kemgbe afọ anọ gara aga.
  • Ndakpọ akụnaụba: Nke a emeela ka ọnọdụ ibi ndụ nke Bekee kpọrọ 'cost of living' rịa oke elu. Ihe isi ike mbụbanwaye ọrịa Covid-19 kpatara n'ụwa tinyere agha mba Ukraine na Rọshịa nakwa etu esi emefu ego gọọmentị na Naịjirịa mere ka ọnọdụ ibi ndụ na Naịjirịa danye n'ọnọdụ ọjọọ. Ọnụ ahịa nrị, ọgwụ, ime njem ele ọkụ latrịk, mmanụ agbịdị nakwa ihe ndị ọzọ malitere rịwa elu n'afọ ole m ole nke mere ihe siere ndị mmadụ ike n'ụzọ ọjọọ. Ihe isi ike nke a kpatara emeela ka ndị mmadụ malite ịpụ Naịjirịa ma wụba mba ebe ihe ka dịịrị ha mfe. Ụlọọrụ National Bureau of Statistics (NBS) zipụtara ozi na Julaị nke kwuru na ọtanasị Naịjirịa eruola 19.64% ọnụ ọgụgụ kacha elu kemgbe afọ 17 gara aga. Onyeisi ụlọọrụ Centre for the Promotion of Private Enterprise bụ Muda Yusuf, kwuru na nke a pụtara na ndị dara ogbenye na Naịjirịa ga-adakwụnye n'ọnọdụ ogbenye ka njọ. Otu nwaada bụ Chizitere kwuru na ọrere ihe niile o nwere duru ezinaụlọ ya gbap Naịjirịa n'afọ 2021 gbabaa Kanada n'ihi etu ọnụ ahịa ihe niile nakwa etu akụnaụba Naịjirịa siri danyezie n'ọnọdụ ọjọọ.
Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 3

Ọtụtụ ndị gụrụ akwụkwọ e jiri maka ahụhụ na-arụzị ọrụ ha ekwesịghị

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị gụrụ akwụkwọ e jiri maka ahụhụ na-arụzị ọrụ ha ekwesịghị
  • Enweghi ọrụ: Ụlọọrụ National Bureau of Statistics kwuru na 2021 na mmadụ 33.3% na Naijirịa enweghị ọrụ nke bụ ọkwa nke abụọ n'ọnọdụ n'ụwa niile. Nnyocha gosiri na otu onye n'ime ndị ntorobịa atọ na Naịjirịa enweghị ọrụ, ha nọ ọnọdụ obibi ndụ nke njọọ n'ihi enweghị ego nke a pụtara na ọtụtụ n'ime ndị ntorobịa Naịjriịa isi na-anụ ọkụ ma nwee echiche ọhụrụ ga-ahọrọ iji ịga mba ọzọ karịa ịbị na Naịjirịa maọbụ ịlaghachi ala Naịjirịa. Ọtụtụ ndị gụrụ akwụkwọ ma guzuo ya oke enweghị ike chọta ọrụ dịka ụlọọrụ dị ịcheiche na-achụzị ndị ọrụ ha n'ihi ihe isi ike ndakpu akụnụba Naịjirịa nakwa mefesa ọrịa Covid-19 n'ụwa kpatara na-eme ka ha ghara ịnwe ike kwụọ ndị ọrụ ha ụgwọ ọrụ. Otu nwaada aha ya bụModupe Osunkoya gwara BBC na 2021 na ọ chọrọ ọrụ aghara aghara na Naịjirịa mana ọhụghị agbanye na ọ gụrụ akwụkwọ guruo ya n'isi, nke a kụdara mmụọ ya ma mee o si Naịjria wụba Belgium ma malite ịgụ akwụkwọ ọ na-achọghị ịgụ nke nyere ya ohere ibi ma rụọ ọrụ na mba ahụ. Ọtụtụ n'ime ndị na-agbapụ Naịjirịa kwuru na nke ka njọ bụ na azụmahịa na ijiegoachụego ataala oke akpụ na Naịjiria. Ya bụ na ọnọdụ ihe nke Bekee kpọrọ 'ease of doing business' dakporo adakpo, nke a mere na ndị mmadụ chọro iji aka ya mepere onwe ya ụlọọrụ na ya bụ ihe anaghị adị mfe n'ihi iwu na usoro ọrụ gọọmentị Naijirịa na-ewepụta na-abụzị ọgbata uhie nye atụmatụ ahụ.
Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 4

Dịka ụmụafọ Naịjirịa ji ọṅụ agbapụ, ọpụpụ ha na-erị Naịjirịa ihe ugbua

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Dịka ụmụafọ Naịjirịa ji ọṅụ agbapụ, ọpụpụ ha na-erị Naịjirịa ihe ugbua

Ihe 'Japa' na-ebutere Naịjirịa ugbua

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ọtụtụ ụlọọrụ na-agabiga oge 'ihe isi ike' ọkachasị n'ebe o metụtara ndị ọrụ. Ọpụpụ ndị ọrụ dị mkpa nke Bekee na-akpọ 'Brain drain' abụrụla ihe egwu nye ọdịnaihu Naịjirịa dịka ndị mmadụ ji ụjọ elee etu ihe ga-adị na ngalaba dị ịcheiche na afọ ole m ole na-abịa.

Ihe dị ka ndị ọrụ ịntanetị, ndị ọrụ ahụike nakwa n'ụfọdụ ụlọọrụ ndị ọzọ apụọla, nke mere ka ọtụtụ ngwaọrụ ndị ụlọakụnaụba dị iche na-ada mba kwa mgbe kwa mgbe. Ndị nwere echeche ọhụrụ nakwa ndị isi na-anụ ọkụ ghara itinye aka mezịe Naịjirịa ejirila maka ọnọdụ ihe na-agbapụ dịka nke a na-emetụtazị ma ndị ụlọọrụ dị iche iche nakwa Naijirịa.

Ọtụtụ ụlọakụ dị na Naịjiria na-enwezi nsogbu igboro ndị mmadụ mkpa ndị ha na-esibu n'ịntanetị eme.

Ọtụtụ n'ime ndị a na-apụ agwaghị ụlọọrụ ha na ha na-apụ ozugbo ozugbo, nke so etinye nsogbu mgbe ha pụọ n'ike. Ụjọ ọtụtụ ndị mmadụ bụ na Naịjirịa ga-danye n'ọnọdụ etu o si kawanye njọ n'ihi etu nsogbu ndị a edepụtarala n'elu akụkọ a si akwanye njọ.

Ọpụpụ ndị mmadụ a ga-emetụta Naịjirịa n'ụzọ dị ịcheiche nke gụnyere ego ụtụisi ghara ịbara Naịjria na-agazịrị mba ndị ọzọ dịka ndị mmadụ na-apụ, ego ejiri zụọ ndị mmadụ n'agụmakwụkwọ nakwa ọrụ ghara abaara Naịjirịa uru abụrụla ihe nrite nye mba ndị ọzọ.

Ugboro ugboro, gọọmentị Naịjirịa ekwuola na ọ na-agba mbọ ime ka ihe dịịrị ndị bi na Naijirịa mfe nakwa ịrụ ọrụ dị mfe na Naịjriịa mana ọ dị ka ihe ekwe n'akụ n'ama dị iche.