Nigerian Passport: Lee ebe ị nwereike gaa nata 'Passport' ọhụrụ gị n'ala Igbo

Nigerian Passport

Ebe foto si, Twitter/Nigeria Immigration Service

Dika onyeisi ngalaba na-ahu maka njem na Naijiria bụ Nigeria Immigration Service kwuru, emepeela websaịt eji akwụ ụgwọ ndị chọrọ akwụkwọ njem ọhụrụ. Ime mkepsa nara akwụkwọ njem a ga-ebido n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Juun, 2021.

Lee kwa ebe nịịle n'ọwụwa anyanwụ Naijiria ebe ị nwere ikike ịga nwete akwụkwọ njem ọhụrụ gi:

  • Abia Passport Office - 72 School Road, Umuahia
  • Anambra Passport - Command Headquaters, Awka
  • Ebonyi Passport Office - 2 Afor Ezuna Road Abakaliki
  • Enugu Passport Office - Federal Secretariat, Ogui Layout Enugu
  • Imo Passport Office - Onitsha Road, Federal Secretariat Owerri
Nigeria Immigration Service

Lee kwa usoro eji anara akwụkwọ njem ọhụrụ na Naijiria:

  • Onye ọbula chọrọ ịnara akwụkwọ njem ga-aga na websaịt ndị ngalaba na-ahụ maka njem
  • Onye ahụ ga-etinye aha ya, foto ya nakwa akara ndi ozo di mkpa maka nyocha. Etinyekwa teknzu eji anara ozi makwa zaa ajụjụ obula onye chọrọ inara akwụkwọ nwere na websaịt ahu
  • Akwụkwọ gi na akara gi gafecha nyocha, ị nwezikwara ikike iga na websaịt ahụ kwuputa ubochị n'ebe ị ga-acho ime ajụjụ ọnụ nke kachasi diri gị mfe
  • Oge nara akwụkwọ njem ga-abuzikwa izu ise maka onye chọrọ inara akwụkwọ njem ahụrụ makwa izu atọ maka onye chọrọ igbanwe akwụkwọ njem ya
  • Agaghi ekwe onye obula na agabeghi na websaịt ndi ngalaba na-ahu maka njem tinye akara ya banye na oba nnara akwụkwọ obula n'ala Naijiria
  • Mgbe ejiri mechaa akwụkwọ njem gi, ndị ụlọọrụ Nigeria Immigration Service ga-ezitere gị ozi sịte n'akara ekwentị gị maobụkwanu akara ozi-e nke bekee na akpọ 'email'
  • Obukwura na ikwere mkpesa obula maka usoro naara akwụkwọ njem gị, inwere ikiki izigara ndị ulo oru NIS n'ichafụ ozi sịte na akara ekwe ntị ha.