Europe by road: Etu enyi m si ree m nye ndị tinyere m n'ọrụ akwụna na Morocco
Morocco bụ obodo bụ sọ mma ọtụtụ ndị njem na-abịa nleta na ya. Mana e nwere ihe ọzọ mere ọtụtụ ndị mmadụ ji na-awụchi n’obodo a.
Ọ dị nsọ Yurop nke mere ọtụtụ ndị mmadụ ji awụchị ya ka ha nwee ike zobanye n’ime Yurop.
Ndị Naịjirịa chọwara ụzọ ha si agbapụ Naịjirịa kọwara etu ha si gbaa ọkporoụzọ rute Morocco.

Ọtụtụ n'ime ha na-etinye onwe ha n'ihe izendụ, ụfọdụ, isi ha anaghị apụta na ya.
Otu nwaanyị anyị na ya kpara na Morocco gwara BBC na ike obodo Morocco agwụla ya.
Na ọ hụ ụzọ ọ ga-esi alọta, ọ ga-alọta.
Mgbe anyị jụrụ ya ihe mere o ji bịa Morocco, o kwuru na ọ bụ enyi ya nwaanyị ghọrịrị ya.
Ọ sị na ọ gwara ya ka ha gaa Ọljirịa ga biri, na ebe ahụ ka obodo Naịjirịa mma. Ka ha pụrụ n'ụzọ, enyi ya nwaanyị ahụ e ree ya nye ndị wakporo ya n'ike n'ụzọ, ma jirikwa ya atụ mgbere ego, dịka o bidoro gbawa akwụna iji kwụghachi ha ụgwọ isi ya.
N'aka nke ọzọ, dịka nwaanyị a na nwaanyị ọzọ gwakwara anyị okwu, na-achọzi ụzọ ha ga-esi alaghachite Naịjirịa, enwekwara otu onye Naịjrịa gwara anyị na ọ mechara chọta ụzọ o ji zobanye mba Spen.
Mana ka ọ nọchara afọ abụọ na Spen, achụlata ya Naịjirịa.
N'ihi na ọ na-ahụta Naịjirịa dịka obodo ndị mmadụ na-ata oke ahụhụ, ọ gbarakwa okporoụzọ lagahchitekwa Morocco.
Ugbua, o nweela akwụkwọ ikike iji birizie na Morocco. E nwere ọtụtụ ndị Naịjirịa dịkwa ka nwamadi a na Morocco.
Ụfọdụ n'ime ha ka na-agbasi mbọ ike izobanye na Yurop, ebe ụfọdụ ndị ọzọ ekpebiela na ha ga-anọrọzi na Morocco.
Cheta na n’ụbọchị Friday, 24 Juun 2022, e gburu ihe ruru mmadụ 23 dịka ọtụtụ mmadụ chọrọ iji ike gbabanye na Spen, site na Melilla Morocco.
Nke abụ nke mbụ igwe mmadụ pụtara iji ike agbafe okeala Spen.
Otu National Agency for the Prohibition of Trafficking in Persons bụ NAPTIP depụtakwara na n’afọ 2019, a zọpụtara mmadụ 212 e rere ere n’ofesi, bụ ndị e gotere ka e jiri gbaa akwụna.
Otu World bank kwuru na pasenti 50 ndị ntoroọbịa Naịjirịa na-achọ ụzọ ha ga-esi apụ Naịjirịa.
Onye mere akụkọ a bụ Nnamdi Agbanelo.


