'Mmerụ ahụ so ihe gbara ka ogbunigwe na Kano ka na-emetụta mụ na ọrụ m'

'Mmerụ ahụ so ihe gbara ka ogbunigwe na Kano ka na-emetụta mụ na ọrụ m'
    • Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi & Vining Ogu
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist/Video Journalist

N'ọnwa Mee afọ a ka akụkọ pụtara gbasara ọdachi dapụtara na mpaghara Sabon Gari dị na Kano Steeti.

Ọdachi a bụ nnukwu ụda dara ka ogbunigwe n'akụkụ otu ụlọ akwụkwọ n'Aba Road, Sabon Gari, nke dulara mmadụ itoolu mmụọ n'ụbọchị 17 nke ọnwa Mee 2022.

Otu n'ime ndị ihe ọdachị ahụ metụtara kọwara etu o si gbalahụ ọnwụ.
Nkọwa foto, Otu n'ime ndị ihe ọdachị ahụ metụtara kọwara etu o si gbalahụ ọnwụ.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Ebe ụlọ dara
Nkọwa foto, Ebe ụlọ dara

Ha hibekwara kọmitii nke ọrụ ha bụ ịchọpụta ndị ya bụ ihe metụtara ma nye ha ihe iti aka n'obi iji sị ha ndo.

Ka ọnwa olemole gachara, BBC Igbo gara n'ebe ahụ ya bụ ọdachi dapụtara iji mara etu ihe si kwụrụ nakwa etu ndị o metụtara si nọrọ ugbua.

Ogige ya bụ ọdachi mere
Nkọwa foto, Ogige ya bụ ọdachi mere

Ha kwuru na ya bụ ihe bụ ogbunigwe gbara ebe ahụ, gbuo ọtụtụ mmadụ, mebie ọtụtụ ngwaahịa, ma lakwaa ọtụtụ ihe e ji ebi n'ụlọ n'iyi.

Ụfọdụ n'ime ha kwukwara na ọ bụ ezie na gọọmenti wepụtara ego iji nyere ndị mmadụ aka, mana ha onwe ha enwetaghị ya bụ enyemaka.

Naanị otu n'ime ha, onye nwanne ya nwoke nwụrụ na ya bụ ọdachi, kwuru na otu nde naịra rutere ha site n'aka gọọmenti.

Ndị nke ọzọ anyị na ha nwere mkparịtaụka ka na-ayọkwa gọọmenti ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka, maka na ọdachi ahụ mebiri ihe niile ha ji enyere ndụ ha aka.

Kirie akụkọ a n'uju n'ihe onyonyo dị n'elu.

Onye ọdachi a metụtara
Nkọwa foto, Nwoke ọdachị a gburu nwanne ya nwoke