Plane Crash: A hụla ụmụaka anọ na-efu abalị 40 ụgbọelu bu ha kpọkasịrị

Ụmụaka a hụụ n'oke ọhịa

Ebe foto si, Reuters

A hụla ụmụaka anọ na ndụ ka ọ gachara abalị 40 ụgbọelu ha kpọkasịrị.

A zọpụtara ụmụaka ahụ gbara afọ 13, itoolu, anọ na otu afọ bụ ndị nne ha na ndị ọkwọụgbọelu abụọ so na njem ugboelu ahụ nwụrụ, n'ime oke ọhịa mba Kolombia.

Onyeisiala mba Kolombia bụ Gustavo Petro kwuru na nzọpụta ha bụ ndị ụgbọelu ha kpọkasịrị n'abalị mbụ nke ọnwa Mee 'bụ "ihe ọṅụ" nye mba ha nile.

Petro sịrị na ịchọta ha dịka "anwasi" ma sị, Ha nọ onwe ha na-enweghị enyemaka ọbụla were zọta ndụ ha onwe ha nke bụ ihe ịmaatụ agaghị e chefu echefu."

Ndịagha mba ahụ na ndị obodo na-achọ ha kemgbe ya bụ ọchadị dara. The missing children became the focus of a huge rescue operation involving dozens of soldiers and local people.

Onyeisiala Petro wepụtara foto nke gosiri ụmụaka ahụ na 'etiti ndị agha na ndị obodo gbakọtara ileta ha.

ụmụaka Kolombia na-efu efu

Ebe foto si, Reuters

Ihe onyonyo nke Ministrị nchekwa mba ahụ wepụtara gosiri ka e ji ụgbọelu fsi n'oke ọhịa fega ụmụaka ahụ n'isiobodo mba ahụ bụ Bogata, ebe ụgbọala ụlọgwụ bugara ha ụlọọgwụ maka nleta zuru oke.

Mama nnukwu ụmụaka ahụ bụ Fatima Valencia,kwuru sị, Obi dị m ụtọ, ekele keele Ala mere ka ha nwere onwe ha."

Mama nnukwu ka kọwara na onye nke kacha bụrụ okenye n'ụmụaka anọ ahụ na-elekọtabu ụmụnne ya ma nne ha gawa ọrụ, na o so n'ihe mere ka ha dị ndụ n'ime oke ọhịa bụ ebe ajọọ anụ dịka agwọ na ihe ndị ọzọ na-ata ata bi.

Etu e si chọta ha

Ndị ọrụ gbatagbata hụrụ ozu mmadụ atọ n'ebe obere ụgbọelu'Cessna 206' bu ụmụaka na nne ha nke si Araracuara, dị n' Amazonas province, aga San José del Guaviare, kpọkasịrị n'ihi nsogbu ingini mana ahụghị ụmụaka ahụ nke mere ka e nwee olile anya na ha dị ndụ.

Ka ọ gara ihe dịka izụụka abụọ, a hụrụ ekpem mmiri nwata, cizọsụ, eriri nkeisi nakwa ebe ndọ arụkọlatara nakwa nzọụkwụ ụmụaka nke mere ụfọdụ ji zipụta ozi na a hụla ụmụaka ahụ.

E mechara were ụgbọelu helikọpụta fegharịa n'oke ọhịa ahụ na-agba ozi nke e ji olu mama nnukwu ụmụaka ahụ ziri n'asụsụ obodo ha bụ Huitoto na-agwa ụmụaka ahụ ka ha kwụsị otu ebe ghara ịbamila n'ime oke ọhịa ahụ ka ịchọta ha dị mfe.

O bụ ezie na a hụrụ ụmụaka anọ n'ọhịa izuụka abụọ ụgbọelu bu ha na nne ha kpọkasịrị?
Onye agha na nkịta

Ebe foto si, Reuters

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Akụkọ kwuburu na ahụla ụmụaka anọ ka ọ gachara abalị 16 ụgbọelu bu ha na nne ha na ndị njem ndị ọzọ ji kpọkasịa.

Ụmụaka ndị a gbara agbata afọ ọnwa 11 na afọ 13 na nne ha, n'ọkwọụgbọelu nakwa ogbo ya si Araracuara dị n'Ọdịda Anyanwụ mba Kolobia na-eme njem aga San José del Guaviare oge ụgboelu ha furu n'oke ọhịa Amazon n'abalị mbụ nke ọnwa Mee, 2023.

Ọkwọụgbọala ahụ nyeburu ozi na ụgbọelu ahụ nwere nsogbu inginị tupu o fue.

Ndịagha chọrọ ha izụụka abụọ mecha hụ ozu nwaanyị ahụ bụ Magdalena Mucutuy,gbara afọ 33, ọkwọụgbọelu na ogbo ya mana ha ahụghị ụmụaka ahụ.

Onyeisiala mba Colombia bụ Gustavo Petro kwuburu n'ụbọchị Wenezde na ahụla ụmụaka ahụ n'akara Twitter ya mana o mechara wepụ ozi ahụ sị na ozi ya nwetara edobeghị anya kpọmkwem.

Ndị ọrụ gbatagbata kwuru na ha hụrụ ụfọdụ ngwongwo a na-eche bụ nke ụmụaka ahụ n'ụlọ gbatagbata ha hụụ n'ime oke ọhịa nke mere ha ji eche n'ụmụaka ahụ na-akpagharị n'ime ọhịa ahụ.

Onyeisi mịnịstrị mba ahụ na-ahụ maka ụmụaka bụ Astrid Cáceres kwuru n'ụtụtụ Tọzde na ha natara ozi na ahụla ụmụaka ahụ na-efu efu.

Ozi ha kwuru na ahụ dị ụmụaka ahụ mma.

Ụgbọelu kpọkasịrị

Ebe foto si, Getty Images