Ụlọịkpe mkpegharị akwụstula ikpe kagburu mmeri Alex Otti

Alex Otti

Ebe foto si, Alex Otti

Ụlọịkpe mkpegharị nọ na Kano enyela Alex Otti ikike ịjidegodi mmeri ya dịka n’ọkwa gọvanọ Abia steeti ma kwụsitu mkpebi ụlọikpe ukwu nke Kano steeti mere nke sị ka achụpụ ya n’ọkwa ahụ.

Ụlọikpe mkpegharị a nyere Otti ohere itinye aha ya dịka onye chọrọ ịgbagha mkpebi ụlọikpe ukwu ahụ n’okpuru ikpe ọkaikpe Mohammed Yunusa mere n’ụbọchị 18 nke ọnwa Mee, 2023.

Cheta na ọnụ na-ekwuru Otti bụ Ferdinand Okeoma kwuru n'oge e mechara ya bụ mkpebi na Labour Party zigara mkpesa n'ụlọikpe mkpegharị ebe Otti ka cheere itule ya bụ mkpebi.

Ọ bụghị Alex Otti gbara akwụkwọ n'ụlọikpe 'appeal' ọ bụ Labour Party – Ferdinand Okeoma

Alex Otti,na njirimara 'Labour Party'

Ebe foto si, Alex Otti/Labour Party

Onye meriri n’izo ọkwa gọvanọ Abia steeti bụ Alex Otti na pati ya bụ Labour agbaghaala ikpe ahụ kụpụrụ mmeri ya na ntuliaka 2023.

Nke a na-abịa n’ime otu izuụka ọkaikpe Muhammed Yunusa nke Ụlọikpe Ukwu dị na Kano chabiri ikpe ma kwuo na Otti nakwa ndị fere ọkọlọtọ Labour Pati n’Abia nakwa Kano steeti agbasoghị iwu ntuliaka nke afọ 2022.

N’akwụkwọ Mkpesa ahụ nke malitere ifesa na soshal media, Labour Pati na Alex Otti gwara ụlọikpe mkpegharị ka ọ kagbuo ikpe ahụ ụlọikpe ukwu kpere.

Ha kwuru na ụlọikpe dị na Kano meghiere iwu maka na o nweghi ikike ịchabi ikpe ihe mere tupu e mee ntuliaka.

Ha gakwara n’ihu kwuo na o nweghikwa ikike ikpe ikpe banyere ntuliaka mere n’Abia steeti.

Ọnụ na-ekwuru Alex Otti bụ Ferdinand Okeoma gwara BBC Igbo na ọ bụghị Otti n’onwe ya gbara akwụkwọ n’ụlọikpe mkpeghara kama na ọ bụ Labour pati.

O kwuru na ụlọikpe ukwu dị na Kano enyeghi ikpe ọbụla metụtara Alex Otti mana ihe mere aha Otti jiri dị n’akwụkwọ Labour pati gbara bụ maka na o ji aha Labour Pati zọọ ọkwa.

“N’ezie ọ bụ Labour Pati gbara akwụkwọ n’ụlọikpe mkpegharị, ọ bụghị Alex Otti n’onwe ya.

“kpe ahụ ụlọikpe ukwu dị na Kano kpere emetụaghị Alex Otti mana ndị mmadụ na-aghọta ya n’ụzọ ụzọ.

Ihe mere aha Otti jiri dị na ya bụ maka na ọ zọghị ọkwa n’aha nke ya kama n’aha pati ya bụ Labour Pati, maka na ụlọikpe sị na vootu ọbụla a tụrụ Labour Party bụ na-efu.”

Okeoma gara n’ihu kwuo na ikpe ọbụla ekpere na-adabaghị n’anya ndị o metụtara, na ndị ahụ nwere ohere mgbagha ya n’ụlọikpe mkpegharị maọbụ n’ụlọikpe kachasị.

Alex Otti: Ihe Labour Party kwuru maka mkpebi ụlọikpe kagburu ikike Otti ife ọkọlọtọ pati ya

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Otu 'Labour Party' ajụla ịnabata mkpebi ụlọikpe nke kagburu ikike ife ọkọlọtọ nke pati ahụ nyere Alex Otti na ndị zọrọ ọkwa dị iche iche n'aha pati ahụ na ntuliaka 2023.

Ụlọikpe Ukwu dị na Kano steeti nke Jọstis Mohammed N. Yunusa kagburu ikike Labour Party nyere Otti na ndị ọzọ ji ọkọlọtọ pati ahụ zọọ ọkwa na Kano na Abia steeti na ntuliaka 2023.

Onye na-arụ ọrụ dịka odeakwụkwọ mgbasaozi pati ahụ Obiora Ifoh, kwuru na ozi o binyere aka n'okwu ahụ achịtaghị aja.

"Mkpebi ahụ achịtaghị aja, ọ na-atọ ọchị" The judgement is not only ụlọikpe ahụ enweghị ikike ikpe ikpe gbasa nttuliaka dịka e mecharala ntuliaka, ọ bụghị ụlọikpe e hiwere maka ikpe ntuliaka dịka iwu si hazie ya."

Ifoh, onye boro ikpe ahụ aka ọrụ ndị kwụnyere onyeisioche otu akụkụ Labour Pati nke bụ Lamidi Apapa, kwuru na e kwesịrị inyo ya enyo n'ihi ihe ọ kpọrọ 'ọsọ ọsọ e ji kpebie ya bụ ikpe na naanị abalị abụọ e wetara ikpe ahụ n'ụlọikpe.

Ifoh kwukwara na e ziteghị otu 'Labour Party' akwụkwọ akpọmokụ n'ụlọikpe dịka onye a kpụpụrụ ụlọikpe.

Ụlọikpe akụpụla mmeri Otti dịka Onye feere LP ọkọlọtọ Gọvanọ Abia

Alex Otti

Ebe foto si, Alex Otti/Facebook

Nkọwa foto, Alex Otti

Ụlọikpe ukwu dị na Kano Steeti akụpụla mmeri Alex Otti dịka onye feere otu Labour Party ọkọlọtọ na ntuliaka ọkwa Gọvanọ Abia steeti na ntuliaka e mere n'abalị 18 nke ọnwa Maachị afọ 2023.

Ọkaikpe kpere ya bụ ikpe bụ Jọstis Mohammed N. Yunusa kwuru na Otti nakwa ndị fere ọkọlọtọ Labour Party na Abia nakwa Kano steeti agbasoghị iwu Ntuliaka nke afọ 2023(Electoral Act 2022.)

Akwụkwọ nke otu nwoke a kpọrọ Ibrahim Haruna Ibrahim gbara otu Labour Party na ngalaba na-ahazi ntuliaka bụ Independent National Electoral Commission, (INEC), n'ụlọikpe nke bu akara No FHC/KN/CS/107/2023 O kwuru na otu Labour Party ewegaghịrị Inec akwụkwọ ndebanye aha ndị otu ha abalị 30 tupu ntuliaka imeụlọ ha nke mere ka ntuliaka ahụ dajọọ.

Cheta na Otti ji vootu 175,467 merie Okey Ahiwe nke PDP na ntuliaka ọkwa gọvanọ Abia steeti.

Nke a mere dịka o nwetachara ikike ịzọ ọkwa ahụ n'aha otu Labour Party na steeti ahụ dịka ọ hapụchara otu Apga.

Otti meriri n'okpuruọchịchị iri n'ime 17 dị n'Abia steeti.

Mkpebi ụlọikpe Kano enweghị ike ịkwụsị idu iyiọrụ Otti- Okaiwu ndị LP

Dịka ndị mmadụ na-atụ uche ihe mkpebi ụlọikpe a pụtara, otu ọkaiwu mabụụkwa otu onye na otu Labour Party bụ Ọkaiwu Ume Kalu(SAN) ekwuola na ikpe ahụ agbasaghị Alex Otti.

"Ikpe ahụ e kpere na Kano, anaghị enye anyị maọbụ Alex Otti nsogbu ."

"Ọ gaghị akwụsị idu iyi ọrụ Otti n'abalị 29 nke ọnwa Mee."

Kalu gara n'ihu kwuo na ọ bụrụ na a gbara akwụkwọ ahụ tupu ntuliaka, e nwere ike e lebatụ ya anya.

"Mana nke a ha gbara yaka e mecharala ntuliaka, gọọmentị ehiwala ụlọikpe pụrụ iche maka okwu nile metụtara ntuliaka ga-aga.

Kalu, onye kwuru na aha Alex Otti adịghị n'akwụkwọ ikpe ahụ a gbara Inec na Labour Party, kwuru na ha ga-enyocha akwụkwọ mkpebi ahụ ji mara ma o nwere ebe o siri metụta ha.