World Hypertension Day: Ihe ndị mere ndị ntorobia ji arịazi ọrịa ọbaramgbalielu

Nnyocha ahụ

Ebe foto si, SOPA

Dịka a na-eme ncheta ụbọchị Ọbara mgbalielu n'ụwa gbaa gburugburu(World Hypertension Day), ndị ọkachamara ahụike na Naijiria etiela mgbu etu ọtụtụ ndị ntorobia si arịazi ọrịa a nke a na-ekwu na-ebute ọnwụ erughị eru ọtụtụ ndị mmadụ n'ụwa.

Ọrịa ndị ọzọ, nke a nwere ike ibute gụnyere ọrịa obi, ọrịa akịrị, mkpọnwụahụ nakwa nwoke atụbalighị nwaanyị ime, dịka ndị ha si kwuo.

Dokita

Ọbara mgbalielu bụ ọbara igali rue ngụkọ 140/90 mmHg maọbụ karịa, Dịka otu ahụike mbaụwa bụ WHO si kwuo.

Dịka Dkta Omosivie Maduka bụ ọkachamara n'ahụike ọha na mahadum University of Port-Harcourt Teaching Hospital(UPTH),si kwuo,ihe karịrị pasent 47 ndị okenye na Naijiria na-arịa ọbara mgbalielu.

Dr Omosivie Maduka

Ebe foto si, Omosivie Maduka

" Ngụkọ na-egosi na ndị nọ n'agbata afọ 20, 30 nakwa 40 na-arịazi ọbara mgbalielu."

"Ọ bụ ihe mgbawa obi na anyị na-ahụzị ọtụtụ ndị na-eto eto na-arịa ọbara mgbalielu n'ihi na oge a bụ oge ọtụtụ na-ekwo ndụ ekwo ma nwee ihe ha ka ji ndụ ha emeu bụ ndị na-arịazị ọrịa."

Maduka sịrị na ọbara mgbalielu agwọghị agwọ nwere ike ibute mgbọnwụ ahụ, ọnwụike(atụbọọ a nwụọ ozigbo) nakwa nwoke enweghị ike ịtụwali nwaanyị ime maọbụ rụọ ọrụ dịrị ya dịka nwoke.

Ihe ọbara mgbalielu nwere ike ibutere gị

Nwaanyị na nwoke

Ebe foto si, Getty Images

Dika Maduka sịrị,"Otu n'ime ihe ọbara mgbalielu nwere ike ibute bụ ọnwụ ike nke a na-akpọ "cardiac arrest".

"Ọ bụghị ndị iro si obodo na-ebute mmadụ ịdaa, nwụọ na-enweghị ihe na-emebu ya. O nwere ike ọ bụrụ akwara na-ekesa ọbara n'ahụ gbabiri n'ike."

Dọkịta ahụike ọha ahụ gara n'ihu kọwa sị, "Ọbara mgbalielu nwere ike imetụta akụkụ ahụ e ji amụ nwa(reproductive system) ọkachasị n'ụmụnwoke."

" O nwere ike ime ka nwoke ghara ịtụwali nwaanyị ime maọbụ ka ihe o jiri bụrụ nwoke ghara ịrụ ọrụ dịka o kwesịrị."

Dkta Maduka si kwuo, Ọbara mgbalielu nwere ike ịkpọnwụ akụkụ ahụ mmadụ n'ihi na ọbara anaghị agazi n'ụbụrụ ya dịka o kwesịrị.maọbụ mee ka mmadụ ghara ịhụzị ụzọ.

Ihe ndị mere ndị ntorbia ji arịazi ọbara mgbalielu

Oke ndọga

Dịka Dọkịta Maduka siri kọwa, ụfọdụ ihe nd ị mere ndị ntorobia jizi arịa ọrịa ọbara mgbalielu gụnyere ịṅụ oke mmanya,ịṅụ anwụrụ, iri nri ndị ọcha nke Bekee kpọrọ 'junk food', oke ndọga(stress) nakwa anataghị ezigbo ikuku.

Dkta Maduka sịrị,"Ọtụtụ ndị mmadụ na-aṅụzi oke mmanya, na-ese anwụrụ,ịnọ otu ebe,iri nri ekwesịghị(fast food)."

" Ọzọ bụ 'stress'. Ọtụtụ ndị ntorobia na-agabiga ọtụtụ ihe iji hụ ihe afọ ga-eri."

" Ọtụtụ ndị mmadụ na-ekuru ikuku ikuku adịghị ọcha nke kpo-fire na anwụrụ ụgbọala gbarụrụ."

Ihe i nwere ike ime ji gbochie ọbara mgbalielu

Mkpuchi imi

Onye nwere ọrịa ọbara mgbalielu kweịsrị ị na-aṅụ ọgwụ dọkịta nyere ya maka nke a kwa ụbọchị iji wetuo ọbara ya.

Mana ọka mma ịgba ọsọ mmiri tupu o zu gị ahụ.

Lee ụfọdụ ihe i kweọ̀ịrị ime iji gbalahụ ọrịa nchara, dịka dọkịta siri nye ndụmọdụ:

  • Ikwụsị ịṅụ oke mmanya
  • Kwụsị ihe osise
  • Na-eme mmegharị ahụ
  • Na-ekpu mkpuchi imi na ị nọrọ na gburugburu ikuku adịghị ọcha
  • Na-eri nri zuru oke