Emmanuel Iwuanyanwu: Ọ bụ isi kara aka ga-ebuli okiti nke Ohaneze Ndigbo

Ebe foto si, Channels
Ugbua, otu jikọrọ ndị igbo niile bụ Ohaneze nwetara onye isi ọhụrụ bụ Chief Emmanuel Iwuanyanwu, lee ihe ndị ịkwesịrị ima maka ya bụ nwoke na ihe ejiri mara ya.
Onye bụ Chief Emmanuel Iwuanyanwu.
Emmanuel Iwuanyanwụ, aha otutu ya bụ "Aha e ji eje mba" bụ onye Atta, Ikeduru dị n' Imo steeti.
A mụrụ ya na Septemba 4, 1942 n' ezinaụlọ Ichie Bernard na Madam Hulder Iwuanyanwụ na Umuohii, Atta Ikeduru Imo state.
Agumakwụkwọ
Na afọ 1963 ka ọ bara University of Nigeria Nsukka ebe ọgụrụ Civil Engineering, ebe ahụ ka osiri nwetascholarship gawa Germany were nwetakwuo degree nke ukwu ya.
Agha Biafra
Na 1967, Iwuanyanwu bara Army na nke Biafra were soro lụa agha Biafra. Ọsoro na ngalaba Biafra Research and Production nke mazi Benjamin Chukwuka nwosu bụ onye isi ha.osoro rụpụta ogbunigwe ejiri lụa agha ahụ.
Orụ Oyibo
Ka agha kwụsịrị, Mazi Iwuanyanwụ gara n'ihu rụwa ọrụ ya dịka Engineer ọ bụ. Onwe ụlọ ọrụ, Hardel, Hardel and Enic. Omechara baa na iji ego achụ ego ma nwekwaa ụlọ ọrụ larịrị iri na abụọ bụ akatamkpo na ala igbo, Naijiria nakwa uwa niile. Ụfọdụ ụlọ ọrụa gụnyere Sunrise insurance, Oriental Shipping lines ltd, Paradiae city Hotel, Daily Champion, calabar oriental and oriental hitels wee dịrị gawazịa.

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ndorondoro ọchịchị
Mazi iwuanya nwụ bụrụ National Chairman pati NNC bụ Nigeria National Congress nke mechara bụrụ NRC National Republican convenyion.
Iwuanyanwụ zọrọ ọkwa onye isi ala naijiria na pati NRC na 1993
Ọzọkwa ọkwa ony eisi ala ọzọ na afọ 1995 na Pati UNCP, am zọkwaa ya ọzọ na 1998.
Ọrụ mmezi obodo
Ọrụọla ọrụ dịka onye isi Raw materials and research Development Council. Na 2005 ojiri ọkwa onye isi Nigerian Investment Promotion Commission NIPC.
Ojikwara ọkw adịka onye isi FERMA, onye isi ndị out National Lottery, onye isi ndị Nigerian productivity merit award, ma ony eisi ụlọ ọgwụ National Ortjopaedic hospital Igbobi Lagos nakwa ọtụtụ ọkwa ndị ọzọ.
Ohaneze Ndigbo
Chief Emmanuel Iwuabyanwụ esorolarịị na ndị isi a hụrụ kawaba okpu n'otu Ohaneze Ndigbo kamgbe afọ 1988.
Ọ bụ onye ime obi Ohaneze ma bụrụkwa onye Ohaneze Elders council bụ ndị na ekwu ka ek si anya anwụ na ya bụ nnukwu Otu.
Dịka onye isi Ohaneze bụ George Obiozo nwụrụ na ọnwa December 2022. Ndị Imo state bụ ndị ọmara na iwepụta onye isi Ohaneze jikọrọ isi ọnụ wepụta Chief Emmanuel Iwuanyanwụ dịka onye nwere echiche na agụgụisi ịrụchapụ ọrụ dịka onye isi nke Ohaneze akpọrọ President General.
Ya bụ nwoke gwara ndị ntakụkọ na ụbọchị 30th April 2023 na Chi ọhụrụ efoola na Ohaneze ndigbo n'ihi na ya ga eweta udo, mmepe na ọganihu tọrọ atọ na ala igno site na ọchịchị ua dịka President General.








