Kosi kara imalite inyere m aka na nleta nna ya dara ahụ kemgbe afọ 26 – Nne nwaada a magburu
Ndị uweojii Anambra steeti agbaala ama na akụkọ mmagbu otu nwaada a sị mere n’akụkụ Obosi, na steeti ahụ nke malitere iwu na soshal midia n’ọnwa Eprel, 2023 bụ ihe mere eme na steeti ahụ n’ezie.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga gwara BBC Igbo n’ọnwa Mee a na ha emechaala nnyocha n’ozu otu nwaada a kpọrọ Kosisichukwu Chukwuemeka ma hụ na a magburu ya amagbu.
O kwuru: “Nnyocha ime ahụ e mere n’ozu Kosi Chukwueme gosiri na a sụgburu ya asụgbu. Anyị anwụchiela nwaada a na-enyo n’okwu a dịka anyị ga-akpụpụ ya ụlọikpe na nso nso a.”

Ebe foto si, Ezinaụlọ Kosi
Cheta na akụkọ a kwuru na ọ bụ onye Kosi na-amụ ọrụ n’aka ya bụ onye ji Mkpa magbuo ya ebe a sị ha na-azọ enyi nwoke.
BBC Igbo mere njem gaa be Kosi n’Obosi Anambra steeti nụta n’aka ụmụnne ya nakwa nne ya ihe ha ma maka ebubo a.
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
‘Mgbe a ka ku Kosi n’aka ka nna ya dara ọrịa ruo ugbua’
Nne Kosi ji arịrị nakwa anya mmiri gbaa ama na ọ ma ya bụ nwaada a na-ebo ebubo na ọ bụ ya magburu nwa ya dịka o kwuru na ya bụ nwaada a na-ebo ebubo na-abịa ụlọ ya, na-akpọ nwa ya bụ Kosi na-apụ ebe dị iche iche.
O kwuru na ọ hụrụ ha dị ka enyi mana ọ ghọtaghi etu ihe siri ruo nke mmagbu.
Nne Kosi kwuru:
"Kosi dị naanị otu ọnwa na izu abụọ mgbe nna ya dara ọrịa, a nọ m na-eche ka ọ mụchaa ọrụ ka ọ malite inyere aka n'ibu ọrụ a."
Ọ kọwara na ọ bụ naanị ya na-eleta di ya bụ nna Kosi kemgbe ahụ a malitere ịrịa ọrịa n'afọ 26 gara aga.
Nwanne nwaanyị Kosi nke aha ya bụ Chidimma gbara ama na Kosi na-amụ orụ n’aka otu nwaada. O kwuru na ọnwa Eprel afọ a kara ịbụ oge nnwereonwe ya dịka onye na-amụ ọrụ ịkwa akwa n’aka ya bụ nwaada mana ọ bụ n'otu ọnwa ahụ ka a magburu ya.
Ọ kọwara na nwanne ya bụ Kosi kọtuuru ya etu obere nsogbu siri dị n’etiti ya na onye ọ na-amụ ọrụ n’aka ya.
Ya bụ akụkọ dịka o siri kwuo mere ha a chọọ ka ọ kwụsị ịga ọrụ mana ọ rịọrọ ha ka ha nwere ya ndidi ka ọ mụchapụ ya bụ ọrụ.
Chidimma kwuru na echiche esemokwu a nke nwanne ya kọrọ ya mere ha sị nwanna ya nwaanyị nke ọzọ ka o soro ya gaa zaa oku a sị nwaada ahụ ọ na-amụ ọrụ n’aka ya kpọrọ ya.
Dịka o siri kwuo, ọ bụ site n’ịza ya bụ oku ka nwaada a bụ nne ya ukwuu n’ọrụ siri maa ya mkpa n'olu.
Ha bugara ya ụlọọgwụ mana ebe ahụ ka ndị dọkịnta siri gbaa ama na ọ nwụọla.
Ndị uweojii agbaaala ama na ha na-eme nnyocha n’okwu a.


