Kosi kara imalite inyere m aka na nleta nna ya dara ahụ kemgbe afọ 26 – Nne nwaada a magburu

Aha onyonyo, Nnyocha ozu gosiri na a magburu nwaada Kosi amagbu – Ndị uweojii Anambra
Kosi kara imalite inyere m aka na nleta nna ya dara ahụ kemgbe afọ 26 – Nne nwaada a magburu

Ndị uweojii Anambra steeti agbaala ama na akụkọ mmagbu otu nwaada a sị mere n’akụkụ Obosi, na steeti ahụ nke malitere iwu na soshal midia n’ọnwa Eprel, 2023 bụ ihe mere eme na steeti ahụ n’ezie.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga gwara BBC Igbo n’ọnwa Mee a na ha emechaala nnyocha n’ozu otu nwaada a kpọrọ Kosisichukwu Chukwuemeka ma hụ na a magburu ya amagbu.

O kwuru: “Nnyocha ime ahụ e mere n’ozu Kosi Chukwueme gosiri na a sụgburu ya asụgbu. Anyị anwụchiela nwaada a na-enyo n’okwu a dịka anyị ga-akpụpụ ya ụlọikpe na nso nso a.”

Kosi kara ịdị afọ 27 ma mee nnwereonwe n'ọrụ ya dịka onye na-amụ ịkwa akwa

Ebe foto si, Ezinaụlọ Kosi

Nkọwa foto, Kosi kara ịdị afọ 27 ma mee nnwereonwe n'ọrụ ya dịka onye na-amụ ịkwa akwa n'afọ a.

Cheta na akụkọ a kwuru na ọ bụ onye Kosi na-amụ ọrụ n’aka ya bụ onye ji Mkpa magbuo ya ebe a sị ha na-azọ enyi nwoke.

BBC Igbo mere njem gaa be Kosi n’Obosi Anambra steeti nụta n’aka ụmụnne ya nakwa nne ya ihe ha ma maka ebubo a.

‘Mgbe a ka ku Kosi n’aka ka nna ya dara ọrịa ruo ugbua’

Nne Kosi ji arịrị nakwa anya mmiri gbaa ama na ọ ma ya bụ nwaada a na-ebo ebubo na ọ bụ ya magburu nwa ya dịka o kwuru na ya bụ nwaada a na-ebo ebubo na-abịa ụlọ ya, na-akpọ nwa ya bụ Kosi na-apụ ebe dị iche iche.

O kwuru na ọ hụrụ ha dị ka enyi mana ọ ghọtaghi etu ihe siri ruo nke mmagbu.

Nne Kosi kwuru:

"Kosi dị naanị otu ọnwa na izu abụọ mgbe nna ya dara ọrịa, a nọ m na-eche ka ọ mụchaa ọrụ ka ọ malite inyere aka n'ibu ọrụ a."

Ọ kọwara na ọ bụ naanị ya na-eleta di ya bụ nna Kosi kemgbe ahụ a malitere ịrịa ọrịa n'afọ 26 gara aga.

Nwanne nwaanyị Kosi nke aha ya bụ Chidimma gbara ama na Kosi na-amụ orụ n’aka otu nwaada. O kwuru na ọnwa Eprel afọ a kara ịbụ oge nnwereonwe ya dịka onye na-amụ ọrụ ịkwa akwa n’aka ya bụ nwaada mana ọ bụ n'otu ọnwa ahụ ka a magburu ya.

Ọ kọwara na nwanne ya bụ Kosi kọtuuru ya etu obere nsogbu siri dị n’etiti ya na onye ọ na-amụ ọrụ n’aka ya.

Ya bụ akụkọ dịka o siri kwuo mere ha a chọọ ka ọ kwụsị ịga ọrụ mana ọ rịọrọ ha ka ha nwere ya ndidi ka ọ mụchapụ ya bụ ọrụ.

Chidimma kwuru na echiche esemokwu a nke nwanne ya kọrọ ya mere ha sị nwanna ya nwaanyị nke ọzọ ka o soro ya gaa zaa oku a sị nwaada ahụ ọ na-amụ ọrụ n’aka ya kpọrọ ya.

Dịka o siri kwuo, ọ bụ site n’ịza ya bụ oku ka nwaada a bụ nne ya ukwuu n’ọrụ siri maa ya mkpa n'olu.

Ha bugara ya ụlọọgwụ mana ebe ahụ ka ndị dọkịnta siri gbaa ama na ọ nwụọla.

Ndị uweojii agbaaala ama na ha na-eme nnyocha n’okwu a.