Ndị uweojii Imo steeti anwuchiela mmadụ abụọ a na-eche na aka ha dị n'ogbugbu Amarachi Iwunze gbara afọ 17

Nwata nwaanyị nwụrụ na ndị ezinụlọ ya

Ndị uweojii n'Imo steeti sị na ha anwụchiela mmadụ abụọ e che na aka ha dị nogbugbu nwata agbọghọ ahụrụ ozu ya Ehime Mbano n'ụka gara aga.

Ọnụ na-egwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Mike Abatam kwuru na ha na-eme ihe ọbụla ha nwereike ịhụ na ha zaara ọnụ ha.

Nna nwatakịrị nwaanyị aha ya bụ Amarachi Iwunze dị afọ iri na asaa nwụrụ n'obodo Umuezeala Nsu nke dị n'Ehime, Mbanọ Imo steeti akọọrọla BBC Igbo etu ya bụ ihe siri mee.

Emeka Jude Iwunze bụ nna Amarachi Favor Ohakelem kwuru na ọ nọ na Legọs mgbe ọ nụrụ kepukepu na nwa ya anwụọla.

O kwuru na mgbe ọ nụrụ ya bụ ihe mere na ọ tụbọrọ maka obi nwute.

O kwuru sị, " Ọ bụ nwanne m nwaanyị kpọro were gwam maka ihe mere".

Iwunze kọwara na mgbe ọ jụwara ihe mere ka a gwara ya nwa nwanne nna ya, na di ya na-eme emume iyi akwa mere o jiri kpọo nwa ya nwaanyị ka ọ nyere ya aka kwado maka ya bụ emume.

O kwuru na nwa ya kwetara na ọ ga-aga nyere nwanne nna ya ka.

Kama o kwuru na nwa ya na-amụ ọrụ ebe a na-ere ọgwụ n'obodo Isinweke.

O kwuru sị, "Ọ naara onye ndu ya ikike were gawa inyere nwanne ya aka, n’ụbọchị satọde ka nwa m kwadoro were gawa ebe ahụ".

Ihe Emeka Iwunze kwuru ọ chọpụtara maka ọnwụ nwa ya nwaanyị

O kwuru na nwanne ya nwaanyị bụ onye nọsụ nyochara ahụ nwa ya were chọpụta na achapụrụ ntụntụ isi ya, achapụkwara mbọ ụkwụ ya ma pịa ara ya pịpụtasịa ihe niile dị na ya.

O kwuru sị, " emetọkwara ebe o ji bụrụ nwaanyị".

Ọ na-ekwu sị, " Ihe a wutere m, ka ndi Naijirịa niile nụ akụkọ a bịa nyere m aka, nwoke mere nwa m ihe a kwenyere na enweghị ihe m ga-eme ya".

Iwunze bere sị, "E metọrọ nwa m nwaanyị, omaghị nwoke ma ncha".

Ọ kọwara na ọ bụ maka ihe ewepụrụ n’ahụ nwa ya ka o ji kwere na ọ bụ ọgwụ ka ha eji nwa ya gwọọ.

O kwurui sị, "Ihe m na-arịọ bụ ikpe ziri ezi, ka e kpee ndị mere ihe a ikpe etu ọ kwesịrị,A na m arịọ ndị Naijirịa niile ka ha gbataram ọsọ enyemaka". 

Ihe kpaliri iwe ndị ntoroọbịa ya bụ ihe mere

Ụlọ a kpọrọ ọkụ

Ebe foto si, Nathan Onyenehido

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ụmụokoroọbịa obodo Umuduruewuewuru, Umuezeala Nsu dị n’Ehime Mbano Imo steetị ji iwe na ọnụma sunye ụlọ otu nwokorọbịa ọkụ.

Nke a mere maka na ha cheere na aka ya dị n'ọnwụ otu nwata nwaanyị dị afọ iri na anọ.

Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia gọsiri ka ndị ntoroọbịa nọ na-akụri ma na-amụnye ụlọ ahụ ọkụ.

Onye odekwụkwọ otu jikọtara ndị ntoroọbịa obodo Umuezeala Nsu bụ Nathan Onyenehido gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo na ọ bụ maka na a hụrụ ozu nwata nwaanyị n’ime ụlọ nwokorọbịa n’ụbọchị Sọnde.

N’okwu ya “akụkọ ihe arụ a rutere anyị ntị n’abalị ụnyaahụ, mgbe nne nwokorọbịa ahụ mepere ụlọ ma hụụ ozu nwata nwaanyị a ka ọ tọgbọ.

“Ọ malitere iti mkpu, nke mere ndị mmadụ jiri gbakọta mana nwa ya nwoke ahụ riri mbọmbọ ọsọ".

“Nke a mere e ji na-enyo na ọ bụ nwa ya ahụ dinara n'ike ma gbuo nwata nwaanyị ahụ dị afọ iri na anọ nke kpatara ndị ntoroọbịa jiri kurie ma kpọọ ụlọ ha ọkụ”

Onyenehido gara n’ihu kwuo na ihe ha chọrọ bụ ikpe ziri ezi nye nwata nwaanyị a.

Nnanna nwata nwaanyị ahụ gwara BBC Igbo na ọ bụ nwa nwa ka a hụrụ ozu ya n’ụlọ ahụ.

“Nwata nwaanyị a bụ nwa ọkpara m nwoke, mụ na ya malitere ibikọta ọnụ kemgbe nne ya nwụchara.

“Ọ bụ m na-elekọta ya anya kemgbe ahụ rue ugbua ọ nwụrụ. Achọrọ m ikpe kwụ ọtọ maka ọnwụ ike nwa nwa m.”

Ihe ndị uweojii kwuru

Ụlọ ndị ntoroọbịa gbara ọkụ

Ebe foto si, Nathan Onyenehido

Onye ntaakụkọ BBC kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Imo steetị bụ Michael Abattam ịchọpụta nke bụ eziokwu n’akụkọ banyere ọnwụ nwata a.

Abattam sị na ha anatala ozi maka ihe mere n’obodo Umuezeala Nsu kama na ha na-eme nyocha banyere ya.

O kwughi kpọmkwem ihe butere ọnwụ nwata nwaanyị a maọbụ sị na aka nwokorọbịa dị na ya dịka e si na-ebo ebubo.

Akụkọ ka na-abịa...