Ọ bụ Miracle na-emere m ihe niile - Nne onye uweojii e gburu n'Ekwulobia

Aha onyonyo, Ndị ọjọọ egbuola nwa m bara Uweojii ka onyere mụ aka - Nne Miracle Nwobodo

Anya mmiri na iru uju ka anyị hụrụ n'ụlọ onye uweojii ndị omekaone gbagburu n'izu ụka gara aga n'Anambra steeti.

Miracle Chinonso Nwobodo onye Enugwu Agu, Obuofia Awkunanaw nke dị na Nkanu west n'Enugwu steeti gbara afọ 22.

Miracle nwụrụ anwụ banyere ọrụ uweojii n'afọ 2019 wee bụrụ onye nọ n'Anambara arụ ọrụ ya.

Ọdachị dakwasara ya bụ nwa agbọghọ ka o so n'ụgbọ ala bụ ndị nkpọrọ site n'ụlọ ikpe alaghachị ụlọ nkpọrọ, mgbe ndị amakekwu gbagburu ya nakwa otu onye ọzọ ma tọghapụ onye nkpọrọ ha bu.

Nne mụtara Miracle Ngozi Nwobodo bụkwa nwaanyị Ajadụ n'eti nkpu akwa akwa arịrị na anya ya ji ahụ ụzọ akpọọla.

Nne Miracle kwuru na ọ bụ nwa ya nwaanyịa na-azụ ụmụ nne ya ma na enyere ya aka ka mgbe dị ya nwụrụ were kwuo na ndị gburu nwa ya egbuola ya onwe ya.

Nwanne Nna Miracle bụ Maazị Maduabuchi Nwobodo ji anya mmiri kwuo na ajọ nchekwa dị n'Anambara steeti bụ ihe tara isi nwa ya nwaanyị.

Maduabuchi nakwa ndị ezinaụlọ Miracle Chinonso Nwobodo hapụrụ kwuru na gọọmenti kwesiri itinye anya na mmiri chọpụta ndị gburu ọchụ ahụ ma taa ha ahụhụ kwesịrị ekwesị.

Onye okwuchite ọnụ ndị uwe ojii n'Anambra Sreeti bụ Tochukwu Ikenganyia kwuru na ndị uweojii etinyela anya n'mmiri ịchọpụta ndị niile aka ha dị na ihe mere Miracle nakwa ndị ọzọ tufuru ndụ ha ịgara obodo Naijiria ozi.

Onye dere akụkọ a bụ:Ebere Ekeopara