Etu e si nwụchie nwoke ụkọchukwu a sị metọrọ nwa ya nwaanyị dị afọ 12 n’Anambra

Ụlọọrụ ihe gbasara ụmụnwaanyị na ọdịmma ndị obodo na-agba mbọ ịhụ na nchekwa ụmụnwaanyị lọghachitere n'akụkụ steeti ahụ dị iche iche.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụlọọrụ ihe gbasara ụmụnwaanyị na ọdịmma ndị obodo na-agba mbọ ịhụ na nchekwa ụmụnwaanyị lọghachitere n'akụkụ steeti ahụ dị iche iche.

Akụkọ a pụtala maka etu otu nwoke a sị bụ onye ụkọchukwu siri kpọchido ụmụ ya n’ime ụlọ afọ olemole ma na-emetọ nwa ya nwaanyị n’obodo Abacha nke okpuruọchịchị Idemili North, Anambra steeti.

Kọmịshọna ihe gbasara ụmụnwaanyị na ọdịmma ndị obodo steeti ahụ bụ Ify Obinabo kọọrọ BBC Igbo n’ụbọchị Satọdee etu aka siri kpara nwoke ahụ.

O kwuru na ọ bụ ya bụ onye dụụrụ ndị uweojii wụba n’ime be nwoke ahụ ma nwụchie ya ka ha natara ozi n’ihe dị aṅaa na-eme n’ụlọ nwoke ụkọchukwu ahụ.

Kpụpụrụ ya ụlọikpe Majịstratị nke Awka mbụ n’ụbọchị Tọọzde dịka ọ nọ n’ụlọ nga Correctional Centre Amawbia ebe ọ nọ na-eche isara ọnụ ya n’okwu ndị nọ n’isi ya.

Obinabo kwuru "Anyị na-agba mbọ niile dịịrị anyị ịhụ na ikpe ziri ezi pụtara n'okwu ndị nọ n'isi nwoke a ugbua."

Nwoke a nọzị n'aka ndị uweojii Anambra dịka o okwu nọ n'ụlọikpe ugbua.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nwoke a nọzị n'aka ndị uweojii Anambra dịka o okwu nọ n'ụlọikpe ugbua.

Etu okwu nwoke a siri dapụta

Dịka e siri kwuo, akụkọ nwoke a pụtara ihe mgbe o malitere ibo ụfọdụ ụmụ nwoke ndị obodo ahụ ebubo na ha dịnara nwa nwaanyị n’ike.

Okwu a ruru Eze obodo ahụ bụ Igwe Nwabunwanne Odiegwu ntị nke mere e jiri malite ịkpọ ya oku ka ọ bịa obi eze ka e kpezie ikpe okwu ebubo o na-ebo ụmụnwoke ahụ mana o kweghi bịa zaa Eze.

Ka a kpọrọ ya oku ugboro ugboro ọ jụ ịbịa, ndị ntorobịa obodo ahụ wụbara be ya mgbe ahụ ka a chọpụtara na ọ kpọchidoro ụmụ ya ụzọ kemgbe.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Akụkọ kwuru na nwa ya nwaanyị nke ahụ dị afọ ise gbara ama na ha a nọrọ n’ime ụlọ ahụ kemgbe afọ ise gara aga dịka o wukwara na nna ya na-emetọ ya.

Site n’ajụjụ ndị a jụrụ ebe ahụ, a chọpụtakwara na nwoke ahụ na-akpa ụmụ ndị ọzọ aka n’ebe ọ kwesịghị.

Obinabo kwuru na ka ọ natara ozi akụkọ ndị a, o mere njem gaa Obieze ahụ ngwa ngwa iji hụ na a nwụchiri nwoke ahụ.

"A chụpụtara na nwoke a anaghị ekwe ka ụmụaka ya pụọ ezi ma ncha, ọ tinyeghị aha ha n'ụlọakwụkwọ ọbụla."

Ọ kọwara na ya bụ nwoke lụrụ nwoke 11 ma chụpụchaa ha ncha dịka enweghị ndị nke o kwere binyere ha.

O kwukwara na a hụrụ ọtụtụ ọgwụ na nsi n’ime be nwoke ahụ. Nke gụnyere akpati ozu nke ihe ndị nọ n’ime ya bụ aha ndị mmadụ e dere na akwụkwọ ma kee agbụ.

Ndị obodo ahụ gbara ama na ya bụ nwoke nwere ụlọụka ebe a na-agwọ ndị mmadụ ọrị nakwa nke bụ ebe ndị mmadụ na-abịa a nara ekpere.

Ọ sị: "Ọtụtụ ihe ndị anyị hụrụ n'ụlọ ya gosiri na enweghị onye ụkọchukwu nwoke a bụ, o doro anya na o ji aha okpukperechi Kraịsti aghọgbu ndị mmadụ n'ebe ahụ."

E kwuru na ndị obodo ahụ chọbụrụ iji iwe gbaa ya ọkụ ka ha nụrụ akụkọ ihe ndị a sị o mere mana Eze kwụsiri ha dịka ndị ụlọọrụ na-ahụ maka ụmụnwaanyị na ọdịmma ndị obodo kwuru ha na na-agba mbọ ịhụ na e kpere ikpe ziri n’okwu nọ n’isi nwoke a.

Obinabo kwuru na a kpọgara nwata nwaanyi ahụ ụlọ ọgwụ maka nnyocha ime ahụ dịka otu onye be ha na-elete ya anya ugbua. Ụmụ nwoke a ndị