Ngagharịiwe ndị Umunze maka etu e si gbuo agadị nwaanyị bekọrọ ahụ ya maka ọgwụego

Ụmụnwaanyị Umuneze emeela ngagharịiwe maka ndị okorobịa a sị wakporo otu agadị nwaanyị ma bepụ akụkụ ahụ n'obodo ha.

Ebe foto si, Screengrab

Nkọwa foto, Ụmụnwaanyị Umuneze emeela ngagharịiwe maka ndị okorobịa a sị wakporo otu agadị nwaanyị ma bepụ akụkụ ahụ n'obodo ha.

Akụkọ si obodo Umunze nke okpuruọchịchị Orumba South n’Anambra steeti apụta gosiri na ọtụtụ ụmụnwaanyị obodo ahụ mere ngagharịiwe taa iji gosi iwe ha maka akụkọ ọjọọ dapụtara ebe ahụ na nso nso a.

Kọmịshọna ihe gbasara ụmụnwaanyị na steeti ahụ bụ Ify Obinabo gbaara BBC Igbo ama n’ụbọchị Tuzde etu e siri nwụchịe otu onye n’ime ndị sị na ha bụ ndị ọgwụ ego wakporo otu agadị nwaanyị dị afọ 72 n’obodo ahụ, bepụ akụkụ ahụ dị iche iche nke mere ya bụ nwaanyị jiri mechaa nwụọ na ngwụcha izu gara aga.

Ụmụnwaanyị Umuneze emeela ngagharịiwe maka ndị okorobịa a sị wakporo otu agadị nwaanyị ma bepụ akụkụ ahụ n'obodo ha.

Ebe foto si, screengrab

Nkọwa foto, Ụmụnwaanyị Umuneze emeela ngagharịiwe maka ndị okorobịa a sị wakporo otu agadị nwaanyị ma bepụ akụkụ ahụ n'obodo ha.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

O kwuru na ụlọọrụ ha enyefeela ndị uweojii ya bụ nwaamadị a nwụchịrị n’ebe ahụ onye a na-enyozi n’okwu a.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga gwara BBC Igbo na Tuzde na ya bụ akụkọ bụ eziokwu.

O kwuru “Anyị ji otu nwaamadị anwụchiri n’obodo ahụ dịka anyị na-eme nnyocha n’okwu a ugbua.”

“Anyị na-arịọ ọha ka ha nọrọ jụụ dịka anyị na-ekwe nkwa ime ihe niile dịịrị anyị n’ịnwụchie ndị ọzọ so kpaa nkata a ma kpọpụ nwaamadị a ụlọikpe ngwa ngwa.”

Ndị obodo ahụ kọwara na oke akụkọ mkwapo na-adapụta ebe ahụ n’ike n’ike na nso nso a nke na-ewute ha ọkachasị ya bụ ihe na-emetụta ụmụnwaanyị be nke ukwuu.

Ọnwụ agadị nwaanyị bịara bụrụ ihe oke egwu nke mere ụmụnwaanyị obodo ahụ jiri pụta n’igwe ma kwụchịe ọtụtụ ụzọ n’obodo ahụ n’ụbọchị Tuzde.

Onye agbataobi agadị nwaanyị ahụ kwuru na ndị a wakporo nwaanyị ahụ n'ụzọ ụtụtụ

Ebe foto si, Iwaria

Nkọwa foto, Onye agbataobi agadị nwaanyị ahụ kwuru na ndị a wakporo nwaanyị ahụ n'ụzọ ụtụtụ

Kedụdị ka mwakpo agadị nwaanyị a siri mee kwọm kwem?

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Dịka Kọmịshọna ụmụnwaanyị Anambra steeti bụ Ify Obinabo siri kọọrọ BBC Igbo, o kwuru na ụlọọrụ ha natara ozi n’aka ndị obodo ahụ n’izu gara aga maka nwaanyị a sị na ụfọdụ ndị okorobịa na-arụrụ ya ọrụ nzacha na mkpocha nakwa ọrụ ugbo wakporo n’ebe elekere anọ nke isi ụtụtụ.

O kwuru na nwaanyị onye nọọsụ bụ onye agbataobi agadị nwaanyị ahụ nụrụ ụda ndị kụrụ aka n’ọnụ ụzọ ya bụ agadị nwaanyị n’ụzọ ụtụtụ ma mechaa malite ịnụ olu agadị nwaanyị ahụ ka ọ nọ na-eti mkpu akwa aghara aghara.

Obinabo kwuru na akụkọ ruru ha ntị kọwara na ndị ahụ beere akụkụ ike nwaanyị ahụ, akụkụ ihe ọ jiri bụrụ nwaanyị, akụkụ otu ọnụ ara ya, na ha nwaara iji eze tapụ mkpụrụ aka ya nakwa bepụ ire ya.

Ya bụ agadị nwaanyị gbara isi akwara ma ghara ikwe ha bepụ ya ire dịka ha ji mma bekasịa ya ahụ.

Dịka onye agbataobi agadị ahụ gbabatara n’ime ụlọ agadị nwaanyị ahụ, a hụrụ ebe o dina n’ala, ọbara a na-agbapụta ya n’akụkụ ahụ ya dị iche iche.

Ya bụ onye agbataobi bụ onye tiri mkpụ nke mere ndị obodo jiri gbapụta ma nwụchie otu onye n’ime ndị a ebe ndị ọzọ gbara ọsọ.

Obinabo kọwara na mgbe e butere ikpe a n’ụlọọrụ ha na ya bụ nwaamadị kwupụtara hoo haa na ọ bụ otu nwoke onye dịbịa gwara ha bete akụkụ ahụ nwaanyị ahụ dị iche iche me nwaa tapụ ya mkpụrụ aka na ya bụ ihe ga-eme ka ha nwee ezigbo ego ma ha mezuo ntuziaka ya.

O kwuru na e buuru nwaanyị ahụ gaa ụlọọgwụ Amaku Genereal hospital izu gara aga dịka o gara leta ya ma jiri anya hụ ya bụ nwaanyị oge ahụ ebe ọ nọ n'ezigbo ọnọdụ ọjọọ nakwa ahụ mgbu.

O kọwakwara na atụmatụ ndị ọhụ ahụike inye ya bụ nwaanyị ọgwụgwụ amataghị mkpụrụ dịka o mechara nwụọ.

O kwuru na ya na ụmụ agadị nwaanyị a na-akpazị maka etu a ga-esi kpezie ikpe okwu ọnwụ ya.

Ikenga kwuru na ha na-arịọ ndị obodo ahụ ka ha nwetere ha akụkọ maọbụ ozi ọbụla ga-enyeaka n’atụmatụ inwụchie ndị ọzọ e chee so wakpoo nwaanyị a maọbụ kpaa nkata mwakpo ya.