Anambra US Convoy Attack: Ndị uweojii agbapụtala mmadụ abụọ ndị ekperima tọọrọ n'Ogbaru

Toochukwu Ikenga

Ebe foto si, Nigeria Police

Ndị uweojii Anambra Steeti na-ekwu na ha agbapụtala mmadụ abụọ ndị ọzọ ndị ekperima tọọrọ n'okporoụzọ Atani/Osomala dị n'Ogbaru.

Cheta na ọ bụ ebe a ka ndị ekperima gburu mmadụ ndị na-arụ ọrụ n'ụlọ nnọchite anya mba Amerịka na Naịjirịa, nke gụnyere ndị nkịtị atọ na ndị uweojii anọ, ma tọrọkwa mmadụ abụọ ọzọ.

Mana Toochukwu Ikenga bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra kwuru na ha gbapụtara mmadụ abụọ ahụ ndị ekperima tọọrọ n'isi ụtụ taa bụ Fraịde.

Ikenga kwuru na mmadụ abụọ ahụ emerụghị ahụ ọbụla; o kwukwara na ndị uweojii ka na-arụkwa ọrụ iji nwụchie ndị aka ha dị na mwakpo ahụ.

Anambra US convoy attack: Mba UK enyela ndị mba ha ndụmọdụ maka ịga Anambra steeti

Anambra US convoy attack: Mba UK enyela ndị mba ha ndụmọdụ maka ịga Anambra

Ebe foto si, Getty Images

Mba UK enyela ndị mba ha ndụmọdụ maka ịga Anambra.

Nke a pụtara ihe dịka ha depụtara ya na websaịt ha n'ụbọchị 18 nke ọnwa Mee afọ 2023.

Ọ bụ ngalaba Foreign, Commonwealth and Development Office (FCDO) dọrọ ndị mba ha aka na ntị ma sị ha zeere Anambra steeti ma ọ bụrụ na enweghị ihe dị oke mkpa onye ahụ kwesịrị ịma na steeti ahụ.

Steeti ndị ngalaba FCDO kwuru ka ndị mba ha zeere ma ọ bụrụ na ọ bụghị ihe dị mkpa bụ :

  • Bauchi State
  • Kano State
  • Jigawa State
  • Niger State
  • Sokoto State
  • Kogi State
  • within 20km of the border with Niger in Kebbi State
  • Abia State
  • non-riverine areas of Delta, Bayelsa and Rivers States
  • Plateau State
  • Taraba State
  • Anambra State

Ebe steeti FCDO kwuru ka ndị mba ha zeere mkpam mkpam bụ :

  • Borno State
  • Yobe State
  • Adamawa State
  • Gombe State
  • Kaduna State
  • Katsina State
  • Zamfara state
  • riverine areas of Delta, Bayelsa, Rivers, Akwa Ibom and Cross River States

Anyị ejidela mmadụ abụọ maka ogbugbu ndị ọrụ mba Amerịka - Ndị uweojii

Kọmịshọna ndị uweojii
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

N'ụbọchị Tọọzde ka kọmịshọna ndị uweojii Anambra steeti bụ Echeng E. Echeng gwara ndị ntaakụkọ taa na ha anwuchiela mmadụ abụọ ha na-eche aka ha dị na mwakpo ndị ọrụ mba Amerịka na ndị uweojii n'okpuru ọchịchị Ogbaru nke dị n'Anambra Steeti n'ụbọchi 16 nke ọnwa Mee afọ 2023.

Echeng kwuru sị, “Anyị ejidela mmadụ abụọ a na-eche aka ha nọ na mwakpo a, ha na enyere ndị nchekwa aka ugbua maka nyocha ha”.

Echeng gara n'ihu kwuo na ndị ọrụ mba Amerịka a bịara njem nleta maka etu mbuze sị awakpo okpuruọchịchị Ogbarụ na steeti ahụ mgbe ndị ha na-eche bụ ndị otu Eastern Security Network (ESN)/ Indegenous People of Biafra (Ipob) wakporo ụgbọala ha.

Ọ gwara ndị ntaakụkọ sị, “ọ bụ site n’ihe dịka elekere 12 ruo elekere 2 nke ehihe ka ya bụ ihe mere. Ndị uweojii na ndị agha mmiri gbatara ha ọsọ enyemaka n’ụzọ Atani/Osamelu nọ n’okpuruọchịchi Ogbaru dịka ha natara ozi mwakpo a n’ihe dịka elekere 2:30. Mgbe ha rutere ebe ahụ ndị nchekwe na ndị ojiegbe a kwakọtara mgbọ kama ndị omekome a si ụzọ ọhịa gbaa ọsọ”.

O kwukwara na ndị nchekwe wakporo ogige Ugwuaneocha nke dị n’Ogbaru ebe ha chere ndị omekome a nọ n’ụbọchị 17/05/2023, kama enweghị onye ha hụrụ. O kwuru na ha gbara ogige a ọkụ.

Kọmishona uweojii Anambra Steeti

Echeng kpọpụtara aha ndị uweojii nwụrụ na mwakpo, ha bụ Inspr. Bukar Adams, Inspr. Friday Morgan, Inspr. Adam Andrew na Inspr. Emmanuel Lupata ndị nke otu squadron 23, nke ndị uweojii pụrụiche nke Legọs, ma kwuo na ụlọọrụ USAID gụpụtara aha ndị ọrụ ha awakporo dịka Jefferson Obayuwane,Sunday Prince Ubong , Ekene Nweke, Hassan Etila na Avwuvie Kaye Monday.

O kwuru na nyocha ha gosiri na ndị uweojii anọ a duuru ndị ọrụ nnọchiteanya mba Amerịka mmadụ ise mgbe awakporo ụgbọala abụọ ha ji eme njem. O kwukwara na ndị agbara ụgbọala ha abụọ a ọkụ.

Echeng kwuru sị, “ Mmadụ asaa nwụrụ na ya bụ mwakpo nke mmadụ atọ bụ ndị ọrụ nnọchite anya mba Amerịka”.

O kwukwara na enweghị onye mba Amerịka ọbụla nwụrụ na ya bụ mwakpo.

Echeng gwara ndị ntaakụkọ na ha etinyela ozu ndị nke nwụrụ n’ụlọ nchekwa ozu.

Echeng ji ohere a rịọ ndị oha nwere ozi maka ndị omekome a na ebe ha zoro zitere ha ozi ma tie kwa ndị ometụtara aka n’obi.

Anambra US convoy attack: Obi gbawara anyị maka ọnwụ ndị ọrụ mba Amerịka nwụrụ n'Anambra - Gọọmenti Anambra

Anambra US convoy attack: Obi gbawara anyị maka ọnwụ ndị ọrụ mba Amerịka nwụrụ n'Anambra - Gọọmenti Anambra

Ebe foto si, Soludo TV/Facebook

Nkọwa foto, Anambra US convoy attack: Obi gbawara anyị maka ọnwụ ndị ọrụ mba Amerịka nwụrụ n'Anambra - Gọọmenti Anambra

Aka na achị Anambra steeti bụ Chukwuma Soludo eburula ozi iti aka n'obi bugara ndị US Embassy na Naijiria nakwa ndị niile egburu ndị nke ha na ogbugbu ndị omekome gburu na Anambra.

Ihe arụ ahụ mere ụbọchị tuzde 16th nke ọnwa May 2023 n'Atani Osamala road n'Ogbaru LGA dị n'Anambra oge ndị ọrụ US Ebassy na ndị Uweojii du ha gara ebe ahụ ịrụ ọrụ ebere.

Ihe dịka mmadụ asaa ka ndị omekaome ahu gburu ma gbaa ozu ha ọkụ.

" Anyị jị olu ike katọọ ajọ ọdachi a ndị omekaome kpachapụrụ anya mee." Ka mgbe out afọ ka gọọmenti Anambra na ndị ọrụ nchekwa ma agba mbọ ịkwụsị one ịgbụ mmadụ n agba aghara na eme na Obodo dị iche iche na Anambra steeti.

Ya bụ ozi gara n'ihu kọwaa na ekwosaala ọtụtụ ndị out ọjọọ ahu, mana ọtụtụ obodo dị m'ime ime dịka Ogbarụ nọ na ikpere mmiri, ka nwere ndị isi aba okpu ahụ ka kpọrọ ekwo nkụ na akpa ike ọjọọ.

Onye ọbụla gwara anyị ebe ndị gburu mmadụ nọ ga-enweta nnukwu ego nrite.

Gọmenti Anambra na-ayọ onye ọbụla nwere ozi ma ọbụ nụ kepu kepu ebe ndị omekome ahụ nọ, ga-enweta nnukwu ego ngwa ngwa ọ gwara gọọmenti ihe ga-eme ka ha nwudo ndi ogbu mmadụ ahụ.

Gịnị ka ndị uweojii n'Anambra steeti kwuru?

Anambra US convoy attack: Anyị na-achọ ndị omekome wakporo ma gbuo ndị ọrụ US n'Anambra - Ndị uweojii

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Anambra US convoy attack: Anyị na-achọ ndị omekome wakporo ma gbuo ndị ọrụ US n'Anambra - Ndị uweojii

Ndị Uweojii n'Anambra steeti ekwuola na ha ebidola chọwa ndị omekome ha chere wakporo ma gbuo ndi ụlọọrụ Amerịka na Naịjirịa ka ha na-aga n'Ọgbaru, n'ụbọchị Tuesday.

Tochukwu Ikenga, ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii

Ebe foto si, Tochukwu Ikenga

Nkọwa foto, Tochukwu Ikenga, ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Anambra steeti bụ DSP Ikenga Tochukwu sị na mwakpo a mere ebe elekere 3:30 n'ehihie n'ụzọ Atani, Osamale n'Anambra Steeti. Ikenga sị "ndị omekome gburu ndị ọrụ nchekwa abụọ makwa gbuo kwa ndị ọrụ Amerịka na Naịjirịa abụọ mana o nweghị onye mba US dị n'ụgbọala ahụ."

Ọ sịkwa na ndị ọrụ nchekwa ka kwụrụ chịm ịhụ na ha wuchiri aka ndị niile kpara mkpamkpa a n'oge adgịghị anya.

Skip Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị and continue readingAkụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

John Kirby bụ ọnụ na-ekwuchitere National Security Council

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, John Kirby bụ ọnụ na-ekwuchitere National Security Council

Gịnị ka ndị Amerịka kwuru maka ya bụ mwakpo a?

Ọkọlọtọ mba Amerịka

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọkọlọtọ mba Amerịka

Ụlọọrụ ntaakụkọ Reuters dere na John Kirby bụ ọnụ na-ekwuchitere National Security Council nke mba Amerika sị “Ihe m nwereike ịgwa gị ugbua bụ na o nweghị onye mba US so na mwakpo a, mana anyị ma na e nwere ndị merụrụ ahụ nwekwa ndị e gburu, ihe anyị ma bụ ihe anyị ga-ekwu ugbua".