Lee ndị ọkaikpe nọn'isi ikpe ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'ụlọikpe mkpegharị

Ndị ọkaikpe nọ n'isi ikpe ntuliaka Naịjirịa

Ebe foto si, Court of Appeal

Ikpe gbasara onye meriri ntuliaka ọkwa onyeisiala e mere na Naịjirịa n'ụbọchị 25 nke ọnwa Febrụwarị afọ a na-aga n'ihu ugbua n'ụlọ ikpe mkpegharị Naịjirịa.

Ya bụ ikpe amalitelarị ma na-aga n'ihu ugbua dịka ndị ọkaikpe ise nọ n'isi yHa bụ: Haruna Simon Tsammani; Stephen Jonah Adah; Misitura Bolaji-Yusuf; Boloukuoromo Moses Ugo na Abba Bello Mohammed.

Lee ihe i kwesịrị ịma maka ndị ọkaikpe ndị a nakwa etu ha si gbagote n'ọkwa ọkaikpe nke ụlọikpe mkpegharị.

Haruna Simon Tsammani

Haruna Simon Tsammani

Ebe foto si, Court of Appeal

Nkọwa foto, Ọkaikpe Haruna Simon Tsammani arụọla ọrụ ọkaikpe ihe ruru afọ 25
  • Ọkaikpe Haruna Simon Tsamani bụ onyeisi ndị ọkaikpe ga-ekpebi ikpe gbasara ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa nke afọ 2023. N'oge mbụ, onye a na-enye ọrụ a na-abụkarị onyeisi ụlọikpe mkpegharị.
  • N'ogogo ndị e bu ụzọ họpụta ịbụ ọkaikpe n'ụlọikpe mkpegharị, Tsamani bụ onye nke 12 n'ime ndị ọkaikpe 76.
  • Tsamani bụ onye Bauchi Steeti
  • Ọ dị afọ 63
  • A kpọrọ ya n'otu ndị ọkaiwu Naịjirịa n'afọ 1983, nke pụtara na ọ rụọla ọrụ na ngalaba ikpe ziri ezi nke Naịjirịa ihe karịrị afọ 40
  • Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum Ahmadu Bello dị na Zaria
  • A họpụtara ya dịka okaikpe nke ụlọikpe ukwu nke Bauchi steeti n'afọ 1998, ma bulie ya n'ọkwa dịka ọkaikpe ụlọikpe mkpegharị n'afọ 2010

Boloukuoromo Moses Ugo

Boloukuoromo Moses Ugo

Ebe foto si, Court of Appeal

  • Ọ dị afọ 57; na ngụkọ afọ, Ọkaikpe Ugo bụonye kacha bụrụ nwata n'ime ndị ọkaikpe niile nọ n'ike gbasara ntuliaka a
  • Ọ nụ onye Kolokuma/Opokuma na Bayelsa Steeti
  • Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum Calabar
  • A kpọrọ ya n'otu ndị ọkaiwu Naịjirịa n'afọ 1990, ya bụ na ọ rụọla ọrụ na ngalaba ikpe ziri ezi nke Naịjirịa ihe ruru afọ 33
  • Ebe ọ na-arụ ọrụ ugbua bụ n'ụlọikpe mkpegharị nke dị na Kano
  • E buliri ya n'ọkwa ọkaikpe nke ụlọikpe mkpegharị n'afọ 2014, mana ọ bụbu ọkaikpe nke ụlọikpe ukwu dị na Bayelsa Steeti tupu mbuli n'ọkwa a

Misitura Bolaji-Yusuf

Misitura Bolaji-Yusuf

Ebe foto si, Court of Appeal

  • Nwaada a bụ ọkaikpe Misitura Bolaji-Yusuf dị afọ 63; ọ bụ ya bụ naanị nwaanyị nọ n'isi ikpe a gbasara mpụtara ntuliaka
  • Ọ bụ onye Oyo, n'Oyo Steeti
  • Ọ malitere ọrụ dịka ọkaikpe ụlọikpe mkpegharị n'ọnwa Maachị afọ 2014
  • Ọ rụrụ ọrụ afọ 17 dịka ọkaikpe n'ụlọikpe ukwu nke Oyo steeti malite n'afọ 1997 ruo 2014
  • Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum Obafemi Awolowo dị n'Ile-Ife, a kpọọ ya n'otu ndị ọkaiwu Naịjirịa n'afọ 1984
  • Ebe ọ na-arụ ọrụ ugbua bụ n'ụlọikpe mkpegharị nke dịn'Asaba, Delta Steeti

Abba Bello Mohammed

Abba Bello Mohammed

Ebe foto si, Court of Appeal

Ọkaikpe Mohammed bụ onye Kano Steeti

O ruchabeghị afọ abụọ ebuliri ya n'ọkwa dịka ọkaikpe nke ụlọikpe mkpegharị n'ọnwa June afọ 2021

Ebe ọ na-arụ ọrụ ugbua bụ n'ụlọikpe mkpegharị nke dị n'Ibadan, Oyo steeti

A kpọrọ Mohammed n'otu ndị ọkaiwu Naịjirịa n'afọ 1984 dịka ọ gụchara akwụkwọ na Mahadum Ahmadu Bello dị na Zarịa nakwa ụlọakwụkwọ ndị ọkaiwu dị na Legọs

O rụburu ọrụ dịka ọkaiwu n'ụlọikpe ukwu nke FCT malite na 2010 ruo 2021

Stephen Jonah Adah

Justice Stephen Jonah Adah

Ebe foto si, Court of Appeal

Ọkaikpe Ada bụ onye Dekina nke dị na Kogi Steeti

Ọ dị afọ 65, ma bụrụkwa onyeisi ụlọikpe mkpegharị nke dị n'Asaba, Delta Steeti

Ọ gụkwara akwụkwọ na Mahadum Ahmadu Bello dị na Zarịa nakwa ụlọakwụkwọ ndị ọkaiwu dị na Legọs

A kpọrọ ya n'otu ndị ọkaiwu Naịjirịa n'afọ 1982

N'afọ 1998 ka e buliri ya n'ọkwa dịka ọkaikpe n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja

Mana ọ bụ n'afọ 2012 ka ọ bụụrụ ọkaikpe nke ụlọikpe mkpegharị

Nchịkọta akụkọ gbasara ikpe mpụtara ntuliaka

Ikpe na-aga n'ihu n'ụlọikpe mkpegharị

Ebe foto si, Court of Appeal

Mmadụ abụọ gbara onye nke abụọ na onye nke atọ na ya bụ ntuliaka na-agbagha mpụtara ntuliaka ahụ bụ nke ụlọọrụ Inec kpọpụtara ma kwuo na ọ bụ Bola Ahmed Tinubu nke pati All progressives Congress (APC) meriri.

Mmadụ abụọ a bụ Atiku Abubakar nke Peoples Democratic Party (PDP) na Peter Obi nle Labour Party (LP). Ha kwuru na ntuliaka ahụ jupụtara na nrụrụaka, ma chọọ ka Inec kagbuo mpụtara ahụ ha kpọburu.

Ọ bụghị naanị PDP na LP gbaghara mpụtara ntuliaka a, pati ndị ọzọ sobu gbaghaa ya gụnyere: Action Alliance (AA); Action Peoples Party (APP); na Allied People’s Movement (APM).

Mana dịka ikpe ahụ malitere, pati AA na APP gwara ụlọikpe na ha achọghịzi ịga n'ihu n'ikpe ahụ nke mere ka ụlọikpe kụchapụ ya.

Ka ọ dị ugbua, naanị ikpe ndị APM, LP, na PDP ka na-aga n'ihu ugbua n'ụlọikpe mkpegharị.