Africa Eye: Etu ndị ọrụ nchekwa na ndị ekperima si eji mmaja anapụ ndị 'queer' ego na Naịjirịa
Nnyocha nke BBC Africa Eye mere egosila etu ndị 'queer' si agabiga nnukwu mmekpa ahụ n'aka ndị ọrụ nchekwa nakwa ndị ekperima bụ ndị na-eji mmaja anapụ ha ego.
Iwu Naịjirịa machiri mmekọ ahụ n'etiti mmadụ abụọ bụ otu ụdị okike, mmadụ idina ụdị okike ya bụkwa ihe ọtụtụ mmadụ na-agbarụ ihu na Naịjirịa.
Ndị 'queer' anaghị egosipụta ndụ ha n'uju n'ihu ọha na Naịjirịa n'ihi egwu mkparị, ịkwa emu na mmekpa ahụ.
Nke a nyere ohere ka ụfọdụ ndị ekperima na-amaja ndị 'queer' ma na-anapụ ha ego n'ụzọ ọjọọ.
Na nnyocha a, onye ntaakụkọ BBC gwara ndị 'queer' ọnụọgụgụ ha ruru 20 okwu ha wee kọọrọ ya ihe ha gabigarala n'aka ndị uweojii nakwa ụfọdụ ndị ekperima.
Ndị ekperima a na-aga n'ọbaozi soshal midia ebe ndị 'queer' na-anọemekọrịta, mee ka ha abụ onye 'queer' na-achọ enyi, ọ bụrụ na ha nweta otu onye, ha ga-ekwekọrịta ebe ha ga-ezute onwe ha.
Ọ bụrụ na ha zute, ndị ekperima ahụ ga-ebidozi ịmaja onye 'queer' ahụ ma na-eyi ha egwu na ọ bụrụ na ha enyeghị ha ego, ha ga-akọrọ ndị uweojii maọbụ nne na nna onye ahụ na ha bụ 'queer'.
Otu onye ụdị ihe a mere gwara BBC na ọ bụ ndị uweojii majara ya ma napụ ya ego, na-eyi ya egwu na ha ga-egbu ya maọbụ tụkpuo ya na mkpọrọ n'ihi na ọ bụ 'gay'.









