BBC Africa Eye: Ihe BBC chọpụtara maka ndị 'bandit' na Zamfara steeti

Aha onyonyo, BBC Africa Eye: Ihe BBC chọpụtara maka ndị 'bandit' na Zamfara steeti
BBC Africa Eye: Ihe BBC chọpụtara maka ndị 'bandit' na Zamfara steeti

Kedụ ndị bụ 'bandit' na-akpa mkpamkpa na mpaghara Ndịda-Ugwu Naịjiria?

BBC Africa Eye so ndị omekome a banye n'ime ọhịa ebe ha nọ kọọ akụkọ banyere etu ha si atọ ndị mmadụ.

Ha kọrọ etu ha si tọrọ ụmụakwụkwọ sekọndịrị bi ebi na Jengebe, etu ha si awakpo ọtụtụ obodo nakwa ndị ọkwọụgbọala.

Ha kọkwara etu ha si egbu onye ọbụla nyere ha nsogbu.

Ndị omekome bandit na Zamfara steeti

Otu onyeisi otu ndị omekome a na-akpa mkpamkpa gwara BBC etu o si eziga ndị otu ya ka ha gaa tọrọ ndị mmadụ, ma kọwaa na ọ bụ ya na-egbu ha.

Onye nke ọzọ na-achọghị ka a hụ ihu ya kọwara etu gọọmentị steeti ahụ si kwụọ ha nde naịra iri isii (N60m) maka ntọhapụ ụmụakwụkwọ Jengebe (mana gọọmentị steeti ahụ kwuru na ha akwụghị ndị omekome ụgwọ ọbụla).

Ọ kọwara na ha na-eji ego mgbapụta ha na-anata n'isi ndị ha tọrọ azụtakwu ngwaagha.

Lee ihe nkiri a n'uju ebe a:

Mwakpo ndị 'bandit' na mpaghara Ugwu Naịjirịa

Ụgbọoloko na-aga Kaduna

Ebe foto si, Chibuike Amaechi

Nkọwa foto, Mmadụ itoolu nwụrụ oge ndị ekperima 'bandits' wakporo ụgbọ oloko si Abuja aga Kaduna n'ụbọchị 28 nke ọnwa Maachị 2022.

Otu ọgụ okpukperechi Islam a kpọrọ Boko Haram malitere inye nsogbu na mpaghara Ọwụwaanyanwụ-Ugwu Naịjirịa kamgbe afọ 2009.

Ndị otu a egbuola puku kwuru puku mmadụ, ebe ihe karịrị nde mmadụ abụọ esila n'ụlọ ha gbaa ọsọ n'ihi ha.

Mana n'ime afọ asatọ wee ruo afọ iri gara aga, ndị ekperima ọchịehi malitere ịkpa ike na mpaghara Ọdịdaanyanwụ-Ugwu Naịjirịa.

Nsogbu ndị ọchịehi na ndị ọrụ ugbo abụghị ihe ọhụrụ na Naịjirịa, mana ọ kawanyere njọ n'ime oge a.

N'afọ 2018, otu 'International Crisis Group' mere nnyocha nke gosiri na ike ndị ekperima ọchịehi a na-akpa ka njọ karịa nke ndị Boko Haram ihe ruru ugboro isii.

Ndị omekome a, a kpọrọ 'bandits' na Bekee, awakpola ọtụtụ ụlọakwụkwọ ma tọrọ ụmụakwụkwọ bi na ha; ha egbuola ọtụtụ mmadụ ma tọrọkwa ọtụtụ ndị ọzọ; ha awakpola okporoụzọ, ọdọụgbọelu, nakwa okporo ụgbọoloko.

N'ọdị nso a ka ndị ekperima a wakporo ụgbọala ndị nchekwa Onyeisiala Muhammadu Buhari dịka ha na-aga ịkwadoro Buhari ọnọdụ n'obodo ya bụ Daura, Katsina Steeti.

N'ọnwa March afọ a, ndị ekperima a wakporo okporo ụgbọoloko si Abuja aga Kaduna, gbuo mmadụ itoolu ma tọrọ ọtụtụ ndị ọzọ.

Ọtụtụ ndị ahụ ha tọọrọ ka nọ n'aka ha ruo taa, dịka gọọmentị jụrụ ịkwụ ụgwọ iji gbapụta ha.