Etu ndị 'bandit' si wakpo ụgbọala ndị nche Buhari na Katsina

Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Presidency

Ndị ekperima Bandit wakporo ụgbọala ndị ọrụ nchekwa na-eche Onyeisiala Muhammadu Buhari nche n'ụbọchị Tuzde, na Katsina steeti.

Nke a bụ dịka ọnụ na-ekwuru onyeisiala bụ Garba Shehu si depụta n'akwụkwọ ozi o zipuru.

Mwakpo a mere oge ndị ọrụ nchekwa ahụ na-aga Daura bụ obodo Buhari, dịka onyeisiala na-akwado ịla obodo ya gaa zuo ike maka emume Salah.

Muhammadu Buhari na ndị agha

Ebe foto si, Presidency

Nkọwa foto, Foto bụ oge Buhari gara zute ndị agha na Zamfara steeti n'afọ 2016

Garba Shehu dere sị "Ụlọọrụ Onyeisiala egosipụtala mwute maka mwakpo nke ndị ekperima si wakporo ụgbọala bu ndị nchekwa nakwa ndị ntaakụkọ onyeisi ala dịka ha bu ya ụzọ gawa obodo ya bụ Daura, ebe ọ na-akwado ịga maka Sallah."

"Ndị ekperima ahụ malitere ịkwa ụgbọala Onyeisiala mgbọ site n'ebe ha zoro, mana ndị agha, ndị uweojii nakwa ndị DSS zaghachiri ha."

"Mmadụ abụọ n'ime ha merụrụ ahụ ma na-anata ọgwụgwọ ugbua, ebe ndị ọzọ niile garuru Daura n'udo."

Ọnọdụ nchekwa na mpaghara Ugwu na-akawanye njọ

Ndị ekperima wakporo ụgbọoloko na-aga Kaduna

Ebe foto si, Chibuike Amaechi

Nkọwa foto, N'ọdị nso a ka ndị ekperima wakporo ụgbọoloko si Abuja aga Kaduna

Enweghị nchekwa na-akawanye njọ kwa ụbọchị na mpaghara Ugwu Naịjirịa niile, dịka ọtụtụ ndị ekperima na-eyi ndị mmadụ egwu ebe ahụ.

Ebe ya bụ ihe kacha njọ gụnyere Kaduna, Zamfara, na Katsina steeti, nke bụ steeti Onyeisiala Buhari si na ya.

Ndị ekperima a na-awakpo ma na-atọrọ ndị mmadụ etu dị ha mma ugboro ugboro.

N'otu oge, ha wakporo ma tọrọ eze ọdịnala obodo Buhari bụ Daura, onye akụkọ kwuru na ya na Buhari bụ ikwu.

E mechara tọhapụ eze ahụ, dịka ụfọdụ na-ekwu na a kwụrụ ndị ekperima ahụ ụgwọ.

N'ọdị nso a ka ndị 'bandit' a wakporo ụgbọ oloko si Abuja aga Kaduna, gbuo ọtụtụ mmadụ ma tọrọkwa ọtụtụ ndị ọzọ.

Ọtụtụ n'ime ndị ahụ a tọọrọ ka nọ n'aka ndị ekperima ahụ ruo taa.