AFRICA EYE: NBC amachiela Brekete Redio, daa ha nha
Ngalaba na-ahụ maka mgbasaozi bụ 'National Broadcasting Commission' (NBC) amachiela ụlọọrụ mgbasaozi redio a kpọrọ 'Human Rights Radio license' a ma dịka 'Brekete Radio'maka ịda iwu metụtara mgbasaozi.
Cheta na BBC nọrọ na nsonso wepụta akụkọ wuru ewu nke gosiri etu onyeisi ụlọọrụ Human Rights Radio bụ Ahmed Isa siri maa otu nwaanyị e wetara mkpesa n'aka ya ụra.
N'ozi nke onyeisi NBC bụ Armstrong Idachaba binyere aka, o kwuru na mmachị ahụ nke ga-amalite n'abalị 31 nke ọnwa Mee ga-dị abalị 30.
NBC kwukwara na ụlọọrụ ahụ ga-akwụ iji malitekwa mgbasaozi ma oge ahụ zuo dịka iwu mgbasaozi Naijiria sị kwuo.
Idachaba, onye kwuru na NBC kpọrọ Ahmed Isah bụ onye nwe ụlọọrụ ahụ oku ebe ọ nọrọ kọwa ọnọdụ ihe mere n'ụlọrụ ya ebe o jiri maa mmadụ ụra.
Maka onye bụ "Ordinary President" nke 'Brekete Family' na Naịjiria

Ahmed Isah, onye a ma dịka 'Ordinary President', bụ onye bu ihe gbasara ikike ruru onye n'isi, ma bụrụkwa onye na-enye ndị mmadụ ụdịrị ikpemkwụmọtọ na-amasị ha n'ejije a na-akpọ 'Brekete Family' nke a na-eme n'ihe onyonyo nakwa na redio.
Ihe gbasara Isah na-amasị ọtụtụ ndị Naịjiria na-ahụta ya dịka onye na-enye ndị a na-emegide na ndị ogbenye ikpe ziri ezi.
Isah na-atụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa ndị uweojii mmehie ha n'ihu ma ọ nọrọ n'igwe okwu, mana nke ahụ emeghi ka ha kpọọ ya asị.
BBC Africa Eye sogharịrị Isah na ndị otu ya n'izu ole na ole gara aga, ma chọpụta na ọ bụghị usoro ya niile dabara adaba n'agbanyeghi mmadụ ole o nyerela aka.
Ihe nọ n'akụkọ a nwereike irikasị gị ahụ:
Onye haziri akụkọ a bụ Nnamdi Agbanelo



