Onye nchịkọta bọọlụ Salisu Yusuf dịka ọ na-anara ego
Onye ntaakụkọ mba Gana bụ Anas Aremayaw Anas, bụ onye nyere BBC Africa Eye ihe onyonyo nke gosịrị onye nchịkọta Super Eagles, bụ onye a na akwụ nde naira atọ kwa ọnwa ka ọ na-anara ego ka e nwechara mkparịtaụka maka ịhọrọ onye ọgba-bọọlụ.
Ọ bụ otu n’ime ndị nchịkọta otu egwuregwu bọọlụ na Naijiria a na-anụ aha ha,dịka o durula otu Super Eagles gaa asompi mba nọ n’Afrịka nke gara ọfụma nke ha ruru mgbacha ya nke mere n’afọ 2018.
Ọ nọkwa ya n’oge asompi iko mbaụwa ma ga edukwa ha ga asompi olimpik nke 2020.
Dịka ọdị ugbu a, otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ NFF amalitela inyocha ihe banyere akụkọ ị naara ego a nke Yusuf naara.
Onye kwuru nke bụ Diretọ na-ahụ maka mgbasa ozi NFF bụ Ademola Olajire.
