
Onye ọgba n'etiti a gbachara bọọlụ nke afọ a na-enyeteghi otu goolu ọbụla n'asọmpi niile dịka ọ kwụsịrị ịgbara Manchester City bọọlụ. O nyere goolu dị 62, enyemaka dị 32 n'ime asọmpị 230 ọgbara otu ya na Premier League.

Ebe foto si, Getty Images
Egwuregwu bọọlụ nke afọ a akwakọrọla ọnụ na mba Yurop mana enwere ụfọdụ ndị ama ama na-enyetaghị goolu ọbụla n'otu ha dị icheiche.
Ndị nke na-agba bọọlụ n'Ịngland gụnyere Yaya Toure nke Manchester City, Michael Carrick nke Manchester United, Yohan Cabaye nke Crystal Palace.
Na Spen ha bụ Andres Gomes nke Barcelona, Mateo Kovacic nke Real Madrid, Sulley Muntari nke Deportivo La Coruna.
Ndị nke na-agba na Fransị bụ Lassana Diarra nke PSG.
Nwafọ Naịjirịa na-agba bọọlụ na Malaysia bụ Okechukwu Azuibuike so na ndị a.

