Gịnị ka Yaya Toure ga-eme ugbua ọ chọrọ ịhapụ Man City?

Yaya Toure

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Yaya Toure nwetara ihe nrite 'ọkacha agba nke Afrịka' nke ndị BBC nyere ya n'afọ 2013 na 2015
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Yaya Toure kwuru na ọ ga-akwụsị ịgbara ndị otu Manchester City bọọlụ na ngwụcha afọ a.

N'agbanyeghị na ndị Man City buliri iko Premier League nke afọ a, Toure agaghị eso ha asọmpi ndị ọzọ na-abịa dịka nke a kpọrọ community shield.

Toure dị afọ iri atọ na ise (35) gbaara Man City bọọlụ afọ asaa (2010-2018) ebe o so ha bulie iko asaa gụnyere nke Premier League atọ, tupu o kwuo na ọ ga-ahapụ ha pụọ.

Ọ gbakwaara ndị Otu Barcelona afọ atọ (2007-2010), ebe o so ha bulie iko asaa gụnyere otu nke Champions League.

Ikele ndị mmadụ maka ịkwado ya, Toure dere na Twitter sị:

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Etu ndị otu ya ji sị ya 'ka e mesịa '

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ya na nwanne ya nwoke bụ Kolo Toure gbaara ndị obodo ha bụ Ivory Coast bọọlụ.

Maka ịma nka ya ọfụma, Yaya nwetara ihe nrite 'ọkacha agba nke Afrịka' ugboro anọ nọkọtara ọnụ; n'afọ 2011, 2012, 2013, 2014.

O nwetakwara ihe nrite nke 'ọkacha agba na Manchester City' nke afọ 2013/2014.

Ndị otu ya na Man City kwuputakwara ihe ha ga-eji cheta ya n'otu ha.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Kedụ ihe ọ ga-eme ugbua?

  • Ọ ga-ebido iti egwu?

Oge Yaya na-agba bọọlụ, ya na nwanne ya Kolo nwere egwu e ji mara ha abụọ nke a kpọrọ "yaya and Kolo song". Ha na-agba ya ọkachasị ha abụọ zukọọ ọnụ.

N'egwu ahụ, ha abụọ ga na-agụ "Yaya, Yaya, Yaya" "Kolo, Kolo, Kolo". Otu onye na-agba n'eweli aka elu, onye nke ọzọ na-agba na-ehulata ala.

Egwu ha mere ọfụma nke mere ka ndị mmadụ na-agba n'England oge ha na-ewu.

Yaya na Kolo Toure

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Yaya na Kolo Toure gbatara ọnụ ha na nnukwu otu abụọ dị na England, ya bụ Manchester City na Arsenal
  • Ọ ga-ebido ịrụ ọrụ dịka onye nchịkọta?

N'agbanyeghị na ọ dị afọ iri atọ na asaa (37) diọkpara nne Yaya bụ Kolo bidoro ịrụ ọrụ dịka onye nchịkọta a kpọrọ 'technical assistant' n'otu Celtic n'afọ 2017.

Ọ kwụsị ịgba bọọlụ, Yaya nwere ike iso ụzọụkwụ Kolo tinye isi n'ọrụ nchịkọta.

  • Ọ ga-aga ịgba bọọlụ ebe ọzọ?

Na ọ dị afọ 35 abụghị ihe nwere ike ịkwụsị ya ịgba bọọlụ ma ọ chọọ.

Ọtụtụ ndị Afrịka kwụsịrị ịgbara ndị nnukwu otu bọọlụ na-agafe otu ndị anaghị anụcha aha ha ọfụma inyere ha aka ime ka a nụ aha ha, ma sikwa ebe ahụ kpata ego ha ji ala ezumiike nka.

Yaya kwuru na ọ gaghị akwụsị ịgba bọọlụ nwere ike gaa mba China maọbụ Amerịka maọbụ Quatar gaa bidokwa ịgba bọọlụ ọzọ.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ