Awaala Sir Alex Ferguson chịkọtaburu Manchester United ụbụrụ

Ebe foto si, Getty Images
Sir Alex Ferguson bụ onye chịkọburu otu Manchester United, na-ezu ike n'ụlọọgwụ ka a wachara ya ụbụrụ maka ọbara na-agba ya n'isi.
Ndị otu Manchester United depụtara akụkọ kwuru na ịwa ụbụrụ ahụ gara nke ọma mana Ferguson "kwesịrị ịnọ n'ime ebe nlekọta pụrụiche (intensive care) nke ga-enyere ya aka ịgbake ọfụma".
Cheta na Ferguson mere ndị na-akwado Man Utd obi aṅụrị ọtụtụ oge site n'iko iri atọ na asatọ (38) o buteere ha n'ime afọ iri abụọ na isii (26) ọ nọ dịka onye nchịkọta ha.
Ferguson rituru n'ọchịchị ma laa ezumiike nka n'ọnwa Mee nke afọ 2013.
Tupu ọ banye n'ọrịa a mere ka e buga ya ụlọọgwụ, Ferguson pụtara n'ihu igwe mmadụ n'izuụka gara aga oge o nyere onye nchịkọta otu Arsenal bụ Arsene Wenger, ihe nrite iji jaa ya mma ka o kwuru na ọ ga-akwụsị ịchịkọta Arsenal n'afọ ka ọ chịchara ha afọ iri abụọ na abụọ (22).
Ihe e kwuru maka Ferguson
Ndị United dere na soshal midia na ekpere ha bụ na ọ ga-agbake ọsịsọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 1
Ụfọdụ ndị ọ chịkọburu oge ọ nọ na Manchester United, tinyere ọnụ na ikpere ya ekpere ka ọ gbakee.
David Beckham na Cristiano Ronaldo so na ndị kwuru okwu. Lee ihe ha dere:
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 2

End of Instagram post, 3
Ferguson bụ onye nchịkọta kacha mee ọfụma n'ime egwuregwu ndị Britain kemgbe e ji bido ya.
O buliri iko Premier League ugboro iri na atọ (13), iko Champions League ugboro abụọ, iko FA ugboro ise na iko League ugboro anọ.