Nke bụ eziokwu na mwakpo ndị ojiegbe mere n'obodo anyị - Awgbu President General

Ahịa Awgbu bụ ebe ndị ekperima gbara ọkụ ma gbuo ọtụtụ mmadụ

Ebe foto si, Awgbu Community

Onye bụ 'President General' nke obodo Awgbu dị n'Anambra steeti, Mazi Emmanuel Akidi ekwuola na ọ bụ ndị ekperima jiri wakpoo obodo ha n'izu gara aga, gbuo mmadụ ise ma gbaa ọtụtụ ụlọahịa karịrị ijeri naịra iri ọkụ.

N'akwụkwọ ozi Akidi wepụtara, ọ kọwara etu ọdachi ahụ siri dakwasị ndị obodo ha.

"ọ bụ n'ehihie Wenezde May 17, 2023 ka a chụrụ keke ọsọ site n'obodo Amaokpala bata Awgbu. Ndị ahụ na-achụ ha ọsọ kwuru na ha bụ ndi ohi ji egbe kpaa ike di egwu.

" ka ihe ndị a na-eme, igwe mmadụ ndị Awgbu nyere aka ma a nwụchie mmadụ abụọ n'ime ndị ha.

E duuru mmadụ abụọ ahụ gawa n'agbata Awgbu n'obodo Agulu bụ ebe ha gburu ha”

Akidi kọwara na ndị ọrụ nchekwa obodo ha 'vigilante' nyere aka jidezia otu n'ime ndị ohi ahụ ma nyefee ya n'aka ndị uweojii.

"Ihe gbagwojuziri anyị anya bụ na, echi ya bụ tọzde Mee 18, 2023 n'ihe dịka elekere asatọ nke abalị ka ndị omekome si Awka jiri Keke wakpoo ahịa Awgbu, munye ya ọkụ, gbagbuo mmadụ anọ, wee mụnye ọtu onye ọkụ n'ime ụlọahịa ya."

Ọ gara n'ihu depụta aha mmadụ ise ahụ ndị ojiegbe a gbagburu.

Ọ katọrọ ụfọdụ akụkọ ndị pụtara nke kwuru na e gburu ndị a n'ihi okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma sị na ụdịrị okwu a adịghị mma maka uju ndị obodo ha bụ Awgbu na-eru agbua.

Akidi rịọrọ gọọmenti Anambra nakwa ndị Uweojii ka ha sie imi n'ala ma chọpụta ndị wakporo Awgbu ka ha taa ahụhụ dịịrị ha.

"Anyị na-arịọ gọmentị Anambra ka e mee ka ndị e gburu nwete ikpe ziri ezi, ka ha kwụhachị ndị e mebiri ngwa ahịa ha ọgụ.

Nkea ga-eme k amkpụrụ obi bdị nwụrụ anwụ zụru ike na ndokwa.

Ndị ekperima awakpola obodo Awgbu, Anambra steeti, gbuo ndị mmadụ

Awgbu

Ebe foto si, Google/BBC

Ndị ekperima amaghị ndị ha bụ wakporo obodo Awgbu, dị n'okpuru ọchịchị Orumba North n'Anambra Steeti n'abalị ụbọchị Tọzde, gbaa ahịa obodo ahụ ọkụ ma gbuo mmadụ anọ.

Otu onye obodo ahụ na-achọghị ka anyị kpọpụta aha ya gwara BBC Igbo na mwakpo a mere n'ebe elekere itoolu nke abalị.

Onye a kwuru na ndị ekperima ahụ gbagburu mmadụ atọ, ebe onye nke ọzọ ka ha gbara ọkụ na ndụ n'ime ụlọahịa ya ebe ọ na-ere mmanụ ụgbọala.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra Steeti bụ Toochukwu Ikenga, kwuru na mwakpo a mere eme n'ezie.

Gịnị kpatara mwakpo nke a?

Ahịa Awgbu gbara ọkụ
Nkọwa foto, Mpaghara ahịa Awgbu gbara ọkụ
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Onye ahụ gwara anyị kwuru na n'ụbọchị Wenezde, bụ ụbọchị 17 nke ọnwa Mee 2023, ụfọdụ ndị ojiegbe ezu ohi gara zuo ohi n'obodo Amaokpala nke dị nso n'Awgbu, ma chọọ isi obodo hAwgbu wee gbafee.

O kwuru na ndị na-agba ọkada n'Amaokpala kpọrọ ndị ọkada Awgbu n'ekwentị kọọrọ ha na ndị ohi na-achọ ịgbafe n'obodo ha. Nke a mere ka ndị ọkada Awgbu chụọ ndị ohi ahụ ọsọ, jide abụọ n'ime ha.

Onye a kwuru na ndị mmadụ ji iwe tigbuo ndị ohi abụọ ahụ ma gbaa ha ọkụ na mpaghara ahịa ha bụ Eke Awgbu.

"Ka nke a nke a mechara, n'abalị ụbọchị Tọzde, n'ebe elekere 10 nke abalị, ka anyị malitere ịnụ ụda egbe aghara aghara na mpaghara ahịa anyị. Ndị ojiegbe ahụ bu ụzọ gaa n'ebe ndị nche obodo anyị na-anọ mana ha ahụghị onye ọbụla ebe ahụ," ka onye a kwuru.

"Ha batara n'ahịa ebe ahụ malite ịgba egbe, gbagbuo mmadụ atọ, ma tinye ọkụ na mpaghara ahịa ahụ. Otu onye na-ere mmanụ ụgbọala n'ahịa ahụ, aha ya bụ Ofor, nwụrụ n'ime ọkụ ahụ."

Onye a kwuru na nke a bụ nke mbụ a na-awakpo obodo Awgbu kamgbe amalitere inwe nsogbu nchekwa n'Anambra Steeti. "Ọ bụladị n'oge agha, awakpoghị obodo anyị bụ Awgbu, nke a bụ nke mbụ ụdị ihe a na-eme n'obodo a", ka o kwuru.

O kwuru na ndị ọrụ nchekwa bịara ebe ahu n'elekere 12 nke abalị dịka ndị ekperima ahụ lachara, mana ha abịabeghị ọzọ n'ụtụtụ taa.

Gbasara otu onye n'ime ndị nwụrụ na mwakpo a, onye a kwuru na "Ofor bụ onye a na-atụkwasị obi na ọ ga-enwerịrị mmanụ ụgbọala mgbe ọbụla onye ọbụla chọrọ ịzụ mmanụ ụgbọala. Ọ bụrụgodi n'ime abalị, Ofor ga-eresị gị mmanụ ụgbọala. Ụmụ ya ka pechara mpe, onwebeghị onye n'ime ha banyerela ụlọ akwụkwọ sekọndịrị".

Onye a gwara anyị okwu kwuru na ọ bụ eziokwu na obodo ha rụrụ otu ụlọọrụ maka ndị uweojii, "mana kamgbe nsogbu ndị 'unknown gunmen' malitere, ha anaghịzi anọ ebe a. Ndị uweojii anọghịzi n'obodo 15 niile dị n'okpuru ọchịchị Orumba North, naanị ebe ha nọ ugbua bụ n'ụlọọrụ ha dị n'Ajali nke bụ isi obodo okpuru ọchịchị ahụ."

Ihe ndị uweojii kwuru

Toochukwu Ikenga

Ebe foto si, Toochukwu Ikenga

Nkọwa foto, Toochukwu Ikenga bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra Steeti

Toochukwu Ikenga bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra Steeti kwuru na ndị ọrụ nchekwa agaala n'obodo ahụ iji weta udo.

Ikenga kwuru na ihe ruru ụlọahịa 20 gbara ọkụ na mwakpo ahụ ebe mmadụ atọ bụ ndị a gbatara egbe ka e buru gaa ụlọọgwụ ebe otu onye n'ime ha nọrọ nwụọ.

"Anya anyị dị n'ihe na-eme ebe ahụ ugbua, dịka anyị na-agba mbọ ijide ndị mere mwakpo a," Ikenga kwuru.