Ụlọọrụ Inec na ebe ndị ọzọ 'unknown gunmen' wakporo n'Anambra n'ụbọchị Wenezde

Ebe foto si, Inec/Twitter
Ndị omekome awakpoola ụlọorụ Inec dị n'Anambara steeti n'ụzụ ụtụtụ ụbọchị Wenezde.
Dịka Inec si kwuputa n'akara Twitter ha, ha sị na ọ bụ ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ kpara arụ a.
"Ha gbara ọtụtụ ihe ọkụ nke gụnyere ngwa ntuliaka ndị ebuterela maka ntuliaka a na-akwado ịmalite n'ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Febụwarị" ka ozi ha kwuru.
Ihe ndị ọzọ lara n'iyi na ya bụ ọkụ gụnyere:
- Igbe ntuliaka dị 729
- Ọdọ ntuliaka 243
- Akpa ngwa ntuliaka 256
Ụlọ ebe e ji mere ụlọọrụ n'ebe ahụ gbarịkwara ọkụ ọfụma.
Ha kọwara na PVC ndị mmadụ anatabeghi esoghi na ihe ndị lara n'iyi n'ọkụ ahụ.
"Ntuliaka ga-agariri n'ihu' bụkwa okwu ha ji mechie ya bụ ozi.
Ihe ndị uweojii kwuru

Ebe foto si, Inec/Twitter
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambara steeti bụ Tochukwu Ikenga kwuru na ndị ahụ wakpokwara ụlọorụ ndị uweojii dị na Nnobi nakwa ụlọ obibi dị n'ebe ahụ.
Ọ kọwara na ndị ahụ ji ogbunigwe arụpụtara were me ya bụ mwakpo, o kwukwara na ha ji ụgbọala Sienna anọ were bịa ya bụ ọrụ.
Dịka ozi Ikenga si kwuo, "N'ihe mwute, otu nwata nwoke dị afọ 16 nwụrụ na ya bụ mwakpo ebe otu nwata nwaanyị dị afọ 15 merụrụ ahụ dịka agbara ya egbe".
Ọ sị na nwata nwaanyị ahụ nọ n'ụlọọgwụ anata ọgwụgwọ ugbua dịka ha bụ ndị uweojii malitere nyocha banyere ihe mere.









