Lee ihe kacha mkpa ndị Abia chọrọ n'aka Alex Otti meriri ntuliaka gọvanọ

Ndị Abia steeti nọ n'ọṅụ dịka akpọpụtara Alex Chioma Otti dịka onye meriri ntuliaka ọkwa gọvanọ steeti ahụ.
Otti ji ọkolọtọ Labour Party zọọ ọkwa gọvanọ a.
N'aka nke ọzọ ka ndị Abịa steeti tụlara uche azụ maka ọnọdụ steeti ahụ kamgbe ma kwuo ihe ha chọrọ n'aka Alex Otti ma ọ banye n'ọchịchị dịka gọvanọ steeti ahụ.
Kirie ihe ha gwara BBC Igbo
Etu ndị Abia siri nabata mkpọpụta Alex Otti dịka gọvanọ ọhụrụ ha

Ebe foto si, Alex Otti/Facebook
Dịka Nnennaya Oti bụ onye n-anọchite anya ngalaba Inec n'Abia steeti kpọpụtara Alex Chioma Otti dịka onye ji ọkọlọtọ otu Labour Party zọọ ọkwa gọvanọ Abia Steeti.
Cheta na okpuruọchịchị Obingwa butere ọtụtụ okwu dịka e nwere ebubo nrụrụaka n'igwe Bvas.
Kama Oti kwuru na ndị ọrụ Inec sị Abuja bịa nyocha ya bụ igwe Bvas nke nyere ha ohere ịkpọpụta mpụịtara ntuliaka a etu o siri gaa.
Lee ka ndị Abia Steeti si nabata mkpọpụta a
Alex Otti: Ije nwa anịga dọkara onyendo PDP

Ebe foto si, Alex Otti
N'abalị 22, ka ọ gachara abalị anọ e ji mee ntuliaka ọkwa Ogọvanọ, ụlọọụ na-ahazị ntuliaka Naijiria bụ 'Independent National Electoral Commission (Inec) don kpọpụtara Alex Otti nke 'Labour Party' dịka onye meriri na ntuliaka ọkwa Gọvanọ Abia steeti.
Dịka onye ọrụ Inec chịkọtara ntuliaka ahụ bụ Ọkammuta Nnenna Oti,si kpọpụta ya, Otti ji vootu 175,467 were merie Okey Ahiwe nke Peoples Democratic Party bụ onye nwetara vootu dị 88,529, ebe Enyinnaya Nwafor nke Young Peoples Party (YPP) gbara onye nke atọ nwetara vootu 28,972.

Ebe foto si, Alex Otti
Otti meriri n' okpuru ọchịchị iri, Ahiwe meriri n'isii, ebe Nwafor n'otu.
Mkpọpụta a so oge e gbuburu dịka Inec mechiri mkpọpụta mpụtara si okpuru ọchịchị dị iche iche ka o rutere mpụtara nke si Obingwa mana Ọkammuta Oti mechara bia ya bụ okwu.
Ọṅụ dara n'abia

Ebe foto si, Alex Otti/Facebook
Ngwa ngwa a kpọpụtara Alex Otii dịka onye meriri, ọtụtụ ụmụafọ abịa wujuru ama, n'ọnụ nakwa obi aṅụrị.
Nrọ ha rọwara kemgbe afọ 24 emeela n'ihe, Otti bụ nwa anịga enweghị onye kwụ ya n'azụ gbaturu enyi.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ije nwa anịga gbaturu enyi

Ebe foto si, Okezie Ikpeazu
Kemgbe afọ 1999, ọkwa gọvanọ Abia steeti bụ ihe ndị gaganogwu Abia Bekee kpọrọ 'godfather' ji e chere ndị masiri ha ọjị malite n' ọchịchị Orji Ụzọr Kalu(199-2007) bụ onye nyefere Theodore Orji ọchịchị ( 2007- 2015), rute Okezie Ikpeazu aka(2015-2023).
Mana dịka Igbo siri kwuo, ọ bụghị ka akụ ilu si ada na ntị ka o si atọ, ije wetara Otti mmeri na a napụ otu PDP ochendo ha ji kpuchie Abia steeti kemgbe afọ 1999, abụghị egwu achị ụtaba agba.
Otti jiri anya ya hụ ntị ya dịka ọ zọrọ ọkwa gọvanọ n'aha otu All Progressive Grand Alliance (APGA) n'afọ 2015, ọtụtụ chere na o meriri mana ụlọikpe napụrụ ya ara n'ọnụ ma nye Okezie Ikpeazu bụ gọvanọ na-apụ mmeri oge ahụ.
Ụlọikpe Mkpegharị nyeburu Otti mmeri dịka onye meriri n'ezie mana Ụlọikpe Kachasị n'okwu ntuliaka tunyere mkpebi ụlọikpe nke Justice Okon Abang nọ n'isi n'ọhịa ma nyeghachi Ikpeazu ọkwa gọvanọ.

Ebe foto si, Alex Otti
N'afọ 2019, Otti zọkwara ọkwa Gọvanọ ọzọ n'aha Apga mana Ikpeazu meriri ya ọzọ.
N'ọnwa Juun afọ 2022, Apga ji azịza zapụ ọkụkọ dịka ọ wụbara n'otu APC.
Mana n'ọnwa Mee afọ 2022, ọ tufuru azịza, dịka Ikechi Emenike meriri na ntuliaka imeụlọ APC mere.
Emenike jnwetara vootu dị 672 , Emeka Atuma gbara onye nke abụọ nwetara vootu 150, ebe Alex Otti gbara onye nke anọ nwetara vootu 15.
Otti banyere n'otu 'Labour Party' n'ọnwa Juun otu afọ ahụ bụ ebe o nwetara ikike ịzọ ọkwa gọvanọ n'aha pati ahụ.
Onye bụdị Alex Otti

Ebe foto si, Alex Otti
Alex Otti bụ onye ọrụ ụlọakụ banyere na ndọrọndọrọ ọchịchị dịka ọ rituru n'ọkwa onyeisi ụlọakụ 'Diamond Bank'( buzi Access Bank ugbua).
Onye Isiala ngwa, Otti gara akwụkwọ Primari na Sekọdịrị n'Abia tupu ọ gaa mahadum 'University of Port Harcourt' bụ ebe ọ gụrụ "Economics' ma jiri nzere ọkaibe 'First Class" were pụta n'afọ 1988.
O nwere nzere MBA " na mahadum 'University of Lagos' bụ nke o nwetara n'afọ 1994.
Ọ gaala ọzụzụ ndị ọzọ dị iche iche na Naijiria nakwa mba ofesi ma bụrụkwa onye eji ọrụ inyere ndị ụwa na-atụ n'ọnụ aka.















