Rev Fr Hyacinth Alia: Onye bụ Fada a ga-abụ gọvanọ Benue steeti?

Ebe foto si, Fr Hyacinth Alia
Ụkọchukwu Katọlik a kwụsịrị ọrụ n'ike emeriela ntuliaka maka ọkwa Gọvanọ Benue steeti.
Fr Alia, onye zọrọ ọkwa a na pati 'All Progressives Congress' (APC) nwetara vootu 473,933 ebe Titus Uba nke Peoples Democratic Party (PDP) nwetara vootu 223,913.
Nke a bụ nke ugboro abụọ onye ụkọchukwu Katọlik ga-abụ gọvanọ na Benue Steeti.
Ụkọchukwu Moses Orshio Adasu meriri ntuliaka n'otu 'Social Democratic Party' (SDP) n'afọ 1992, tupu ndị agha eweghara ọchịchị n'ike na Naịjirịa.
Onye bụ Fr Hyacinth Alia?
- Ọ bụ onye obodo Mbangur, Mbadede, nke dị n'okpuru ọchịchị Vandeikya na Benue Steeti
- A mụrụ ya n'afọ 1966 ma chie ya ụkọchukwu n'afọ 1990
- Ọ na-arụ ọrụ na dayọsis Gboko nke dịkwa na Benue Steeti
- O nwere nzere ọkaibe na ngalaba agụmakwụkwọ dị icheiche dịka: Philosophy, Theology, Religious Education, nakwa Biomedical Ethics
- Ọ rụrụ ọrụ n'ọtụtụ ụlọụka nakwa ụlọọgwụ na mba Amerịka nakwa Naịjirịa
- O kwuru na ya nwere ọkpụkpọ oku "ịkpọpụta ụmụ Chineke n'ọchịchị nchigbu ha na-agabiga na Benue Steeti"
Etu e si wee kwụsịtụ Fr. Alia n'ido maasị

Ebe foto si, Gboko Catholic Diocese
Bishop ụka Katọlik nke dayọsis Gboko bụ William Avenya enyela Fr Hyacinth Alia ntaramahụhụ site n'ịkwụsị ya ọrụ dịka ụkọchukwu.
Nke a bụ maka na Fr Hyacinth Alia sonyere otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'All Progressives Congress (APC) ma gbata akwụkwọ iso zọọ ọkwa Gọvanọ nke Benue Steeti.
N'akwụkwọ ozi si n'aka Bishọpụ Avenya, ọ kọwara na o megidere iwu ụka Katọlik onye ụkọchukwu ịbanye otu ndọrọndọrọ ọchịchị.
O kwukwara sị na nkwụsị ọrụ a ga-adịgide ruo mgbe ụkọchukwu ahụ tụgharịrị ma kwụsị ịzọ ọkwa a ọ na-azọ.






