Iran Plane Crash: Ugboro asatọ a gbaturu ụgbọelu bu ndi njem

Tehran on January 8, 2020

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Tehran on January 8, 2020

Mba Kanada na Amerịka na-ekwu na ha nwere akiaebe na ọ bụ mba Iran gbaturu ụgbọelu mba Yụkren were gbuo mmadụ 176 na Tehran ụbọchị Wednesde.

Anyị ga-etinye anya mgbe ọzọ ụdịrị ihe a mere.

Ụgbọelu Malaysia Flight 17 July, 2014

MH17 si obodo Amstadam aga Kuala Lumpur, dị na Maleshia oge mgbọ kụpụrụ ya n'elu n'ọwụwa anyanwụ Yụkren. Mmadụ 298 nwụrụ na ya bụ mkpa mkpa.

Otu Kọmiti nyocha boro mmadụ anọ gunyere atọ ha na ndị uweojii nzuzo Rọshia nwere mmekọ ebubo na aka ha dị na mkpa mkpa a.

Rọshia gọrọ na aka ha adịghị mana ndị Mba ofesi ndi ọcha sị na ọ bụ ndị ekweghị ekwe na Yụkren ha na-akwado mere ya.

Ndị nwụrụ oge ụgbọelu Malaysia 17 dara

Ebe foto si, Various

Nkọwa foto, Ndị nwụrụ oge ụgbọelu Malaysia 17 dara

Ụgbọelu Siberia nke 1812, Oct 2001

Otu ụgbọelu Siberia Airlines plane si obodo Tel Aviv dị na Esrel aga obodo Novosibirsk, dị na Rọshia oge agbaturu ya. Ụgbọelu a dabara n'ime oshimiri ojii.

Mmadụ 78 nọ n'ime ya nwụrụ.

Ndị agha Ukren kwuburu na aka ha adịghị ya mana ha mechara kwenyere na ọ bụ ha.

Ha sị na ọ bụ ka a na-akuziri ndị agha ka ihe mere.

Akụrụ ndị nwe ndị nwụrụ ego iti aka n'obi.

Ụgbọelu Malaysia Airlines nwụrụ na Ọwụwa Anyanwụ Ukren

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ụgbọelu Malaysia Airlines nwụrụ na Ọwụwa Anyanwụ Ukren

Ụgbọelu atọ nke Transair Georgia, Sep 1993

Mmadụ 136 nwụrụ mgbe ndị chọrọ nkewa na Gọọgịa gbatụrụ ụgbọelu atọ Transair oge ndị Abkhazia chọrọ isi mba ahụ pụọ.

A gbaturu ụgbọelu nke mbụ ka ọ chọrọ ifetu na ọdọụgbọelu Abkhazia Sukhumi n'ụbọchị 21 nke ọnwa Sepụtemba. MMadụ 24 nọ n'ime ya nwụrụ.

Ka chi foro, a gbatukwara ụgbọelu ọzọ nke gburu mmadụ 108 n'ime 132 nọ n'ime ya.

N'ụbọchị Sepụtemba 23 ka ndi mmadụ na-aba ụgbọelu ọzọ, agbara ya egbe nke butere ọkụ gbaburu otu onye.

Ụgbọelu Iran Air 655, July 1988

Ndị na-eu uju ndị nwụrụ oge agbaturu ụgbọelu Iran n'afọ 1988

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị na-eu uju ndị nwụrụ oge agbaturu ụgbọelu Iran n'afọ 1988

Otu ụgbọelu Iran na-aga Dubai dara ka mgbọelu tụrụ ya n'ụbọchị atọ nke ọnwa July 1988.

Mba Amerịka gọrọ na ọbụghị ha, mana ha mechara kwenyere na aka ha dị na ya bụ mkpa mkpa.

Ọ bụ na ụgbọmmiri akpọrọ USS Vincennes ka mgbọ kpara ike a si pụta.

Mmadụ 290 nọ n'ime ụgbọelu a nwụrụ.

Amerịka mechara kwuo ndị nwe ndị a nwụrụ ugwo iti aka n'obi.

Ụgbọelu Korean Airlines nke 007, Sept 1983

Ọ bụ ụgbọelu agha nke Rọshia gbaturu ụgbọelu Koria si Neuw Yọk aga obodo Seol di na Korịa n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Sepụtemba 1983.

Mmadụ 269 nọ ime ya nwụrụ.

Ha gbaturu ụgbọelu oge ọ banyere ala Rọshịa na amaghị ama. Ndị Rọshịa bu ụzọ na-agọ, mana ya mechara kwere na ọ bụ ha mere ihe a ma kwụchịrị na ọ bụ nyocha ha ka ọ bịara.

Oge Onyeisiala Rọshịa bụ Boris Yeltsin nyere igwe ụgbọelu ha gbaturu. Nke a mere na ụbọchị 19 November, 1992

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Oge Onyeisiala Rọshịa bụ Boris Yeltsin nyere igwe ụgbọelu ha gbaturu. Nke a mere na ụbọchị 19 November, 1992

Ụgbọelu Air Rhodesia nke 825 na 827, Sept 1978 na Feb 1979

Ndị ekweghị ekwe akpọrọ "Zimbabwe People's Revolutionary Army" (Zipra) na mba Rhodesia, nke bụzị Zimbabwe gbaturu ụgbọelu abụọ a.

Ihe a mere oge a na-alụ ọgụ na mba ahụ.

Ọ bụ mmadụ 6 pipo nọ n'ime ụgbọelu Air Rhodesia nke 825 oge agbaturu ya n'ụbọchị 3 nke ọnwa September, 1978. Mmadụ iri na asatọ pụtara n'ime ya mana ndị ekweghi gburu mmadu iri n'ime ha.

Mgbọ tụrụ ụgbọelu 827 n'ụbọchị 12 nke Febụwarị 1979. Mmadụ 59 no n'ime ya nwụrụ.

Dis file photo show di black box instruments wey dem recover from wetin remain of di Libyan Arab Airlines Flight 114

Ebe foto si, Getty Images

Ụgbọelu Libya Arab Airlines nke 114, Feb 1973

Ọ bụ ndị agha Ezrel gbaturu ụgbọelu Libya n'ụbọchị 21 nke ọnwa Febụwarị 1973.

A na-eche na onye nya ụgbọelu fụru ụzọ ka mmiri na-ezo were banye ala dị n'aka Ezrel.

N'ime mmadụ 113 nọ n'ime ya, sọsọ ise pụtara.

Ụgbọelu Cathay Pacific Airways C-54, July 1954

N'ụbọchị 23 nke ọnwa July 1954 ka agbaturu ụgbọelu Cathay Pacific C-54 Skymaster si bankọk aga Họng Kọng.

Mmadụ iri n'ime mmadị iri na itoolu no n'ime ya nwụrụ.

Chaịna sị na ọ bụ na-amaghị ama ka ha jiri mee ihe a.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Aha onyonyo, Ndị Igbo makụọ nụ omenala unu - Bob Manuel Udokwu