Alaba Market: Gọọmentị Legọs ebidola ikuri ụlọ dị icheiche na mpaghara ahịa Alaba

Alaba

Ebe foto si, Screengrab

Gọọmentị Legọs Steeti amalitela ikuri ụfọdụ ụlọ na mpaghara ahịa Alaba International Market n'ụbọchị Sọnde, dịka ha kwuru na ụlọ ndị ahụ emeela ochie, ma na-achọ ịda ada.

Nke a na-abịa dịka ụfọdụ na-akatọ atụmatụ ikutu ụlọ ndị a, ma na-ekwu na nke a gosiri mmegbu a na-emegbu ndị si mpaghara Ọwụwa Anyanwụ bi ma na-azụ ahịa na Legọs.

Mana gọọmentị Legọs na ndị isi otu jikọrọ ndị ahịa n'Alaba kwuru na ọ bụghị ahịa 'Alaba International Market' kpọmkwem ka a na-akutu, kama ọ bụ ụfọdụ ụlọ dị n'okirikiri ahịa ahụ bụ ndị esizighi ike.

Ụfọdụ ndị nkutu ụlọ a metụtara ụlọahịa ha gwara BBC na ọ bụ eziokwu na gọọmentị enyebuola ndị nwe ụlọ ndị ahụ akwụkwọ ịdọ aka na ntị, mana ha na gọọmentị na-enwe mkparịtaụka iji mara ihe ha nwereike ime iji gbochie nkụtu ụlọahịa ha.

ndị a gwara anyị na ha akwụọla ụgwọ ruru nde kwuru nde naịra n'aka ụfọdụ ndịọrụ Legọs steeti n'ihi okwu a.

Lee ihe ụfọdụ na-ekwu maka nke a na soshal midia

Otu onye aha ya na Twitter bụ Ikechukwu Ude kwuru na ihe karịrị ụlọ 10 nke nwere ụlọahịa ruru 60 na ha ka a kụturu taa.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Aloy Ejimakor, bụ onye ọkaiwu nke otu Ipob, bụ otu na-azọ maka nnwereonwe nke mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa, kwuru na nkutu ahịa a bụ mmegide nye ndị Igbo.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2

Otu onye aha ya bụ Amaechi Daniel gwara ụlọ ntaakụkọ Channels TV na ọ bụ eziokwu na gọọmentị dọrọ ha aka na ntị, mana ha na-arịọ ka gọọmentị meere ha ebere nye ha ego enyemaka.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 3

Ụfọdụ, dịka otu onye a na-akpọ Henry_Rony na Twitter, kwuru na ụfọdụ ụlọ ndị a kụturu emeghị ochie nke ha na-achọ ịda ada.

Akụkọ na gọọmentị Legos na-akụri ahịa Alaba bụ ụgha-Ohaneze

Ahịa Alaba

Ebe foto si, Getty Images

Otu Ohaneze Ndigbo agwala ndị Ọwụwa Anyanwụ Naijiria ka ha dere jụụ ma leghara akụkọ na-efegharị nke na-ekwu na Gọọmentị Legọs Steeti na-akwado ịkụrị Ahịa Alaba na Legọs iji taa ndị si mpaghara ahụ ahụhụ maka etu ntuliak 2023 si gaa.

Ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia ụbọchị Satode gosiri ebe e chere bụ Alaba ka ndị mmadụ na-ebu ngwahia ha aghara aghara.

N'ihe onyonyo ahụ, otu nwoke kọwara na ihe mere ndị mmadụ ji ebu ahịa ha aghara aghara bụ na e nyere ha awa ole na ole iji kwapụ ahịa ha dịka gọọmentị chọrọ ikutu ahịa ahụ.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Onye ahụ gara n'ihu boo ebubo na nke ahụ bụ iji taa ndị si Ọwụwa Anyanwụ ahụhụ maka etu ha siri tụọ vootu na Ntuliaka 2023.

Mana Ohaneze kwuru na nchọpụta ha mere gosiri na akụkọ ahụ bụ ụgha.

N'ozi nke ọnụ na-ekwuru Ohaneze bụ Alex Ogbonnịa binyere aka ma wepụta ụbọchị Satode, Ohaneze kọwara na ọ bụ ọdọahịa ndị e wuru n'ọkwa mmiri ka Gọọmentị Legọs chọrọ ịkwatu, na ọ metụtaghị ntuliaka.

"Anya Ohanaeze Ndigbo eruola ọtụtụ akụkọ ụgha na-efegharị na soshal midia nke na-ebo ebubo na Gọọmentị Legọs chọrọ ịta ndị Igbo bi na Legọs ahụhụ."

"Ka anyị nụrụ akụkọ ahụ, anyị mere nchọpụta iji mata nke bụ eziokwu."

" Ọ gara n'ihu kwuo na ozi ha nwetara bụ " ọ bụ ọdọahịa ndị na-egbochi mmiri ịga nke ọma n'ọnwa mmiri."

Dịka Ohaneze na-arịọ ndị Igbo ka ha deere jụụ, ha gara n'ihu rịọ ngalaba gọọmentị ọ dị n'aka 'Lagos State Environment and Development Authority' ka ha were ezi obi rụọ ọrụ dịịrị ha.

Otu jikọrọ ndị na-azụ ahịa n'ahịa a kpọrọ 'Alaba International market' na Legọs, ekwuola na ọ bụghị eziokwu na gọọmentị Legọs Steeti na-akụtu ahịa ahụ.

Theo Ezeani, bụ ọnụ na-ekwuru otu 'International Market Association Electronics' n'Alaba, kwuru nke a n'ozi o ziteere BBC Igbo n'ehihie Satọde.

Nke a na-abịa dịka akụkọ na-efegharị na soshal midia nke na-ekwu na gọọmentị Legọs Steeti na-achọ ịkuri ahịa Alaba.

Ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ maka iwe na ndị ahịa ahụ, ọ kachasị ndị Igbo nọ na ya, enyeghị gọọmentị nkwado na ntuliaka 2023 nke e mechapụrụ ọnwa olemole gara aga.

Mana Ezeani kwuru na nke a bụ nnukwu okwu ụgha, maka na "enwghị ihe ọbụla na-esere gọọmentị Legọs na ndị ahịa Alaba".

"Ọ bụghị Eziokwu na gọọmentị na-akuri ahịa Alaba. Ọ bụ ụlọ olemole merela ochie ka gọọmentị kwuru na ha ga-akụtu. Ndị nwe ụlọ ndị ahụ na ndị ọrụ gọọmentị na-enwekwa mkparịtaụka."

"Ihe a agbasaghị mpụtara ntuliaka 2023 chaachaa. Akụkọ na-efegharị na soshal bụ ụgha, ndị mmadụ kwụsị ikesa akụkọ ụgha."

Ihe mere n'ahịa Alaba n'ụbọchị Fraịde

Ụlọahịa Alaba nke gọọmentị Legọs sị na a ga-akutu

Ebe foto si, Gọọmentị Legọs

Ndị na-azụ ahịa n'alaba gwara BBC Igbo na ndị ọrụ gọọmentị kpọ ọtụtụ ndị uweojii na ndị agha ọnụọgụgụ ha karịrị otu narị bucha egbe bịa n'ahịa ahụ n'ụbọchị Fraịde, ma gwa ha ka onye ọbụla buru ngwaahịa ya pụọ maka na ha na-abịa ịkuri ya.

Otu onye ahịa aha ya bụ Chidi kwuru na ndị uweojii ya hụrụ karịrị otu narị, "ọ dị ka ebe a na-alụ agha".

O kwuru na ụlọahịa ya esoghị na ndị a ga-akụtu, mana ya hụrụ ebe ndị mmadụ na-ebupu ngwaahịa ha n'ihi ihe

Ebe ịkụtu ụlọ a ga-emetụta bụ mpaghara 'Alaba Rago' dị nso n'ebe ọwa mmiri 'canal'.

Onye ọzọ gwara BBC Igbo kwuru na ọ bụ eziokwu na ha e nyere onye nwe ụlọ akwụkwọ gbasara ụlọ ya merela ochie, mana ha na-akwụ ụgwọ gọọmentị sị ha kwụọ iji hụ na akụtughị ụlọahịa ha.

Onye a na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na akwụọla ụgaọ ahụ ruo pasentị 70, mana ụfọdụ ndị ahịa na-atụ egwu na gọọmentị ka nwereike ịkutu ụlọ ahụ n'agbanyeghị na ha akwụọla ụgwọ a sị ha kwụọ.

"Mụ onwe m na-ebupugodi ngwaahịa nke m maka adịghị ama ama," ka o kwuru.

Anyị enyela ha ịdọ aka na ntị kamgbe 2016 - Gọọmentị Legọs

LASBCA

Ebe foto si, Gọọmentị Legọs

Gọọmentị Legọs Steeti kwuru na ha ga-akutu ụlọ ụfọdụ na mpaghara ahịa Alaba dịka ha kwuru na ụlọ ndị ahụ emeela ochie ma na-achọ ịda ada.

N'akwụkwọ ozi si n'aka onyeisi ngalaba n'ahụ maka iwu ụlọ na Legọs bụ Gbolahan Oki n'ụbọchị Fraịde, o kwuru na o teela aka gọọmentị ji dọọ ndị ahịa ahụ aka na ntị ka ha kwara pụọ maka na ụlọ ha na-achọ ịda.

"Ụlọ 17 ka anyị kara akara anyị ga-akụtu n'ihi na ha emeela ochie, anyị nyere ndị ahịa nọ n'ụlọ ndị a akwụkwọ ịdọ aka na ntị kamgbe afọ 2016," Gbolahan Oki kwuru.

Ọ kọwara na gọọmentị Legọs wepụtara akwụkwọ gosiri ụlọ 349 bụ nke ha nyochara ma chọpụta na ha esighi ike mmadụ ibi na ha.

"Anyị depụtara nke a n'akwụkwọ ntaakụkọ dị icheiche n'afọ a, mana n'ihi na ndị ahịa anaghị enye anyị ohere ịbịa nyochaa ịlọ ndị dị n'ahịa ahụ, ụlọ 17 ndị ahụ esoghi na ngụkọ 349 ndị nke anyị biputara," ka ọ kọwara.

"Oge ọbụla ndị ọrụ anyị gara inyocha ụlọ ndị a, ndị ahịa ga-achọ ịluso ha ọgụ.

"Ọ bụ ya mere anyị ji kpọrọ ndị ọrụ anyị niile tinyere ndị ọrụ nchekwa gaa n'ahịa hụ, anyị ga-akụtu ụlọ ndị ahụ.

"Anyị ma na mpaghara ahụ bụ ebe a na-azụ ahịa, ma sorokwa n'ahịa kacha buo ibu na Legọs steeti, mana anyị agaghị agbachị nkịtị ruo mgbe ihe ọdachi mere ma laa ndụ ndị mmadụ n'iyi, n'ihi na mmadụ olemole ekweghị ka gọọmentị rụọ ọrụ ha etu o kwesịrị.

Gbolahan Oki ekwughị kpọmkwem mgbe ha ga-amalite ịkutu ụlọ ndị a.

Anyị ahụghị ihe ịdọ aka na ntị ọbụla si n'aka gọọmentị - Otu jikọrọ ndị ahịa

Na mkparịtaụka ekwentị, Theo Ezeani, bụ ọnụ na-ekwuru otu jikọrọ ndị ahịa 'electronics' n'Alaba kwuru na dịka otu, ha amabụghị na gọọmentị adọbuola aka na ntị na ha ga-akuri ụlọahịa ụfọdụ n'ahịa ahụ.

Ezeani kwuru sị: "Kamgbe m bidoro ọrụ dịka ọnụ na-ekwuru otu 'union' a, anyị anụbeghị na enwebuola mgbe gọọmentị dọrọ aka na ntị na ha ga-akwatu ụlọ n'ahịa a."

"Ọ bụ oge m na'ekiri akụkọ ụwa na TVC n'abalị ka m nụrụ ebe gọọmentị na-ekwu na ha adọọla ndị nọ n'ụlọ ndị a aka na ntị kamgbe 2016, mana anyị bụ ndị isi ahịa a anụbeghị maka ya mbụ, anyị akpabeghịkwa maka ihe dị otu a n'ọgbakọ anyị.

"Ọ bụladị oge mụ esonyebeghị na ndị isi otu 'union', anụbeghị ma maka ya mbụ. Ndị isi anyị chịburu achị ma rituo enweghị mgbe ha kwutere ụdị okwu a."

Mazị Ezeanị kwuru na ya nụrụ na ọ bụ ndị nwe ụlọ ndị ahụ a chọrọ ịkutu ka gọọmentị nyere akwụkwọ ịdọ aka na ntị, mana akwụkwọ ahụ erughị ha bụ ndị isi ahịa aka.

Ọbụghị ahịa Alaba niile ka a chọrọ ịkụtu - Ndị isi ahịa

Theo Ezeanị mechara zitere BBC Igbo akwụkwọ ozi si n'aka otu jikọrọ ngalaba ndị na-azụ 'electronics' n'ahịa alaba, bụ nke kwuru na ọ bụghị eziokwu na ọ bụ ahịa Alaba ka gọọmentị chọrọ ịkutu.

Akwụkwọ ozi a kwuru na ọ bụ ụlọ a na-akpọ 'Superlative Plaza' nke onye nwe ya bụ Mazị Eze Emerem, ka gọọmentị kwuru na a ga-akụtu, "mana onye nwe ụlọ ahụ agwala ndị isi anyị na ya na gọọmentị Legọs steeti akpaala maka ihe ha a ga-eme iji gbochie ịkụtu ụlọ ahụ".

"Anyị chọrọ ikwu na ụlọ ndị gọọmentị chọrọ ịkụtu bụ ụlọ nke ụfọdụ ndị mmadụ nwe, bụ ndị kwuru na ha na gọọmentị na-enwe mkparịtaụka," ka akwụkwọ ozi ahụ kwuru.

"Ndị a kwukwara na ha na ngalaba gọọmentị na-ahụ maka iwu ụlọ enweela nkwekọrịta maka ụlọ ndị ahụ, dịka ha kwesịrị ịkwụ ụfọdụ ụgwọ.

"Ndị nwe ụlọ a kwuru na ha ekwesịla ịkwụchapụ ụgwọ ahụ, mana ha na-eche ka e duo gọọmentị n'iyi ọrụ na Mee 29, ka ha ghara ịkwụnye ụgwụ n'aka ndị ọrụ gọọmentị na-apụ apụ."

"Anyị nwere olileanya na ihe niile a ga-ebi n'ọṅụ."