Don Brymo Uchegbu: Ihe i kwesịrị ịma maka onye ejije Nollywood a lara mmụọ

Ebe foto si, Emeka Rollas /Instagram
Onye ihe ejije Nollywood a ma ama bụ Chukwuma Don Uchegbu a ma dịka 'Don Brymo' anwụọla ka ọ gbachara afọ 56.
Uchegbu, nwụrụ n'ụtụtụ Tozde ka ọ rịachara ahụ nwa oge.
Odogwu ahụ e ji ime agwa eze maọbụ okenye Igbo n'ihe ejije daara ahụ dịka ọ nọ ebe ha na-eme ihe ejije na Pọtakọt, e buga ya ụlọọgwụ ebe ọ nọ were nwụọ, dịka onyeisi otu jikorọ ndị ejije Nollywood bụ Emeka Rollas si gwa BBC Igbo.

Ebe foto si, Don Brymo Uchegbu/Instagram
Rollas gwara BBC Igbo na mkparịtaụka n'ekwentị na Don Brymo sị, "Maazị Don Brymo, onye na-eme ihe egwuregwu bụ onye nwụrụ n'ụtụtụ taa."
"Dịka ndị ya na ya na-arụ ọrụ si gwaa m, ọ bịara ọrụ, ha hụ na ahụ adịchaghị ya ka ọ na-adị ya, ha gwara ya gaa ụlọọgwụ, mana ọ sịrị na ya aṅụọla ọgwụ na ya ga-arụli ọrụ ha bịara."

Ebe foto si, Don Brymo Uchegbu
"Ha malitere ọrụ rue mgbe ebe Elekere 6 nke mgbede bụ mgbe ọ laghachiri n'ụlọ ndịna mana ebe elekere 10 nke abalị ndị ọrụ ụlọ ndịna ahụ kpọrọ onye otu anyị gwa ya na ahụ adịghị Don Brymo mma."

Ebe foto si, Emeka Rollas/Instagram
Ọ gbatara, e buru ya gawa ụlọọgwụ n'abalị ahụ. E mechaa ndị ezinaụlọ ya bịa buru ya buga n'ụlọọgwụ ọzọ."
" Nwunye rutere taa, kpọọ ma kwuo na di ya ahapụla."
Rollas , onye tụrụ arịrị na "ọnwụ ike Don Brymo tinyere ndị otu ha n'iru uju" kwuru n'akụkọ na-efegharị nke na-ekwu na Brymo tụpọrọ ebe ọ na-eme ihe ejije bụ akụkọ ụgha.
Ihe ndị ogbo ndị ejije kwuru maka ọnwụ ya

Ebe foto si, Harry Anyanwu/Instagram
Kemgbe akụkọ ọnwụ ya pụtara ihe, ọtụtụ ndị ihe ejije ibe ya egosila obi mwute ha n'ọnwụ Don Brymo.
Harry Anyanwu bụ ezi enyi ya kwuru na ọ dị ya ka ọ bụ na nrọ.
Zubby Michael, sị ya, "Ka chi fọ, nwokem".

Ebe foto si, Zubby Michael/Instagram
Ihe ndị ị maghị maka Don Brymo

Ebe foto si, DOn Brymo Uchegbu/Instagram
- Ọ bụ onye Enugwu-Ukwu, Anambara steeti
- Ọ banyere na Nollywood n'agbata afọ 2000.
- O meela ọtụtụ ihe ejije gụnyere "Ikemba, "Anger of a Wonder Girl", "Ritual of Vengeance", "Wedding in Nigeria", "Ọga Landlord".
- Ọ bụ onye Anambara steeti
- O rtiteela nturuugo dị iche iche n'ihe ejije.









