Tinubu achụọla ndị isi ọrụ nchekwa niile, tinye ndị ọhụrụ

Ndị isi ọrụ nchekwa Naịjirịa

Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu achụọla ndị isi ọrụ nchekwa Naịjirịa niile, tinyere ndị isi ndị agha ala, ndị agha elu, ndị agha mmiri, na ndị uweojii.

  • Maj. Gen. Christopher .G Musa nọchiri anya Lucky Irabor onye jibu ọkwa 'Chief of Defence Staff'
  • Maj. Gen. Taoreed. A Lagbaja nọchiri anya Faruk Yahaya onye jibu ọkwa 'Chief of Army Staff'
  • Rear Admirral E. A Ogalla nọchiri anya Awwal Zubairu Gambo onye jibu ọkwa 'Chief of Naval Staff'
  • Hassan Bala Abubakar nọchiri anya Oladayo Amao onye jibu ọkwa 'Chief of Air Staff'
  • DIG Kayode Egbetokun nọchiri anya Usman Alkali Baba jibu ọkwa 'Inspector General of Police'
  • Adeniyi Bashir Adewale ga-abụ onyeisi ngalaba 'Customs' ọhụrụ na nchereoge iji nọchie anya Hameed Ibrahim Ali bụbu onyeisi ngalaba ahụ
  • Maj. Gen. Emmanuel Akomaye Parker Undiandeye nọchiri anya Samuel Adebayo bụ onye jibu ọkwa 'Chief of Defense Intelligence'
  • Nuhu Ribadu (bụbu onyeisi ngalaba EFCC n'oge gara aga) nọchiri anya Babagana Monguno dịka 'National Security Adviser'
Onyeisiala na ndị isi ọrụ nchekwa

Ebe foto si, Nigeria Presidency

Lee ndị ọzọ Tinubu họrọ n'ọrụ taa bụ Jun 19

  • Col. Adebisi Onasanya ọchịagha ga na-elekọta 'Brigade of Guards'
  • Lt. Col. Moshood Abiodun Yusuf ga-abụ onyeisi '7 Guards Battalion' dị n'Asokoro, Abuja
  • Lt. Col. Auwalu Baba Inuwa 177 ga-abụ onyeisi 'Guards Battalion' dị na Keffi, Nasarawa Steeti
  • Lt. Col. Mohammed J. Abdulkarim ga-abụ onyeisi '102 Guards Battalion' dị na Suleja, Niger Steeti
  • Lt. Col. Olumide A. Akingbesote ga-abụ onyeisi '176 Guards Battalion' dị na Gwagwalada, Abuja
  • Maj. Isa Farouk Audu ga-abụ onyeisi 'State House Artillery'
  • Capt. Kazeem Olalekan Sunmonu ga-abụ osote onyetet 'State House Artillery'
  • Maj. Kamaru Koyejo Hamzat ga-abụ onyeisi 'State House Military Intelligence'
  • Maj. TS Adeola ga-abụ onyeisi 'State House Armament'
  • Lt. A. Aminu ga-abụ osote onyeisi 'State House Armament'

Tinubu kpọpụtakwara aha ndị ndụmọdụ pụrụ iche anọ. Ha gụnyere:

  • Hadiza Bala Usman - onye ndụmọdụ pụrụ iche na ngalaba Policy Coordination
  • Hannatu Musa Musawa - onye ndụmọdụ pụrụ iche na ngalaba okwu ọdịnala na ịkpa obi ọma, nke a na-akpọ na bekee 'Culture and Entertainment Economy'
  • Abdullahi Abubakar Gumel -Nnukwu onye ndụmọdụ pụrụiche n'okwu gbasara ndị omeiwu Sinetị
  • Olarewaju Kunle Ibrahim Nnukwu onye ndụmọdụ pụrụiche n'okwu gbasara ndị omeiwu 'House of Reps