Fuel subsidy removal: Ego ole m na-ejibụ agba ụgbọala aga ọrụ anaghịzị ezu

Aha onyonyo, Fuel subsidy removal: Ego ole m na-ejibụ agba ụgbọala aga ọrụ anaghịzị ezu

Otu onye ọrụ BBC na Legọs Steetị setere onwe ya n'ihe onyonyo iji gosi ma nyekwa nkọwa zuruoke ihe ndị mmadụ na-agabiga ime njem na steeti ahụ kemgbe okwu mwepụ ego mbelata mmanụ ụgbọala dapụtara.

Onyeisiala ọhụrụ Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu kwuru na a ga-ewepụ ego a, nke a mere ọnụ mmanụ ụgbọala jiri rie elu.

Ụfọdụ ndị mmadụ anaghịzị aga ọrụ n'oge a n'ihi iri elu ego ime njem aga ọrụ
Nkọwa foto, Ụfọdụ ndị mmadụ anaghịzị aga ọrụ n'oge a n'ihi iri elu ego ime njem aga ọrụ

Tinubu kwuru n'ụbọchị e duru ya iyi n'ọrụ sị:

"Ọ (ịkwụ ego mbelata a) na-akwado naanị ndị ọgaranya ọ naghị enye ndị ogbenye nkwado ọbụla, ihe a bụzị ihe dị oke ọnụ ịga n'ihu na-eme."

Naịjirịa weputara ijeri dọla 7.5 maka ịkwụ ụgwọ enyemaka mbelata mmanụ ụgbọala site n'ọnwa Jenụwarị ruo etiti afọ 2023 mgbe ọchịchị onyeisiala Muhammadu Buhari onye nyere Tinubu ọchịchị.

Ugbua, ihe a emetụtala ime njem, ego ime njem, ego nri nakwa ọnụego ihe ahịa.

Kirie ihe onyonyo a ka ị soro Makuochi Okafor mee njem gaa ọrụ ka ọ kọwaa okwu a n'uju.