Mba India abanyela n'akwụkwọ dịka mba nke mbụ garuru nso na ndịda ọnwa

Ebe foto si, Inpho
Mkpu ọnụ na-ada n'ebe niile na mba India dịka ụgbọelu pụrụ iche a kpọrọ Chandrayaan-3 nke ndị sayensị mba ahụ rụpụtara garuru na mpaghara 'South Pole' nke ọnwa.
India bụ mba nke anọ ụgbọelu ha garuru n'ọnwa, ndị ọzọ bụ mba Amerịka, China na Soviet Union nke gboo.
Mana njem ndị a niile garuru nso na mpaghara 'equator' onwebeghị nke ruru nso na mpaghara 'South Pole' bụ ebe ụgbọelu Chandrayaan-3 nke mba India garuru taa.
Ndị nnyocha sayensị na-eche na e nwereike ịchọpụta mmiri na mpaghara ọnwa a.
Praịm Mịnịsta mba India bụ Narendra Modi nọ na mba South Afrịka ugbua ebe ọ na-esonye n'ọgbakọ Brics, mana o sonyeere n'onyonyo ịntanetị wee hụ oge ụgbọelu ahụ daturu.

Ebe foto si, Isro
Agaghị echefu ụbọchị taa echefu na mba anyị - Modi

Ebe foto si, Isro
"Mba India ga na-echeta anyị oge niile maka ụbọchị taa," Modi gwara ndị ọkachamara sayensi mba India. "Ihe mere taa ga-ajalite obi ụmụ India niile maka ọdịnihu kacha mma."
"Ụbọchị taa akụzierela anyị na anyị nwereike isi n'ọdachị anyị nwere n'oge gara aga mụta ihe ga-enyere anyị aka inweta mmeri n'ọdịnihu."
"Mmeri a India nwetara n'ịgaru n'ọnwa abụghị mmeri nke naanị India, ọ bụ mmeri nye ụwa niile na mmadụ niile dịka otu ezinụlọ."
"Ugbua, anyị nwereike ịrọ nrọ ịgaru n'ọnwe ma gafee ya."
Aṅụrị, ịkụ aka, na mkpu ọṅụ juputara n'ụlọọrụ 'Indian Space Research Organisation' (Isro) bụ ebe ọtụtụ ndị ọrụ sayensị gbakọrọ ikiri etu ụgbọelu Chandrayaan-3 si eme njem ya.
Mmeri a mba India nwetara na njem ụgbọelu Chandrayaan-3 ịgaru n'ọnwa bịara naanị abalị atọ ụgbọelu nke mba Russia a kpọrọ Luna-25 kpọkasịrị dịka ọ bịarutere nso n'ọnwa n'ụbọchị 20 nke ọnwa Ọgọst.
Nke ahụ bụ nke mbụ mba Russial na-eziga ụgbọelu n'ọnwa kamgbe afọ 1976 oge ha so n'otu Soviet Union mgbe ụgbọelu Luna-24 mere njem ma rute n'ọnwa n'udo.
Ihe i kwesịrị ịma maka ụgbọelu Chandrayaan-3
- Ọ bụ ụgbọelu nke atọ nke mba India na-ezipu ime njem gaa ọnwa
- Ụlọọrụ 'India Space Research Organisation' (Isro) rụpụtara ya dịka ụgbọelu Chandrayaan-2 kpọkasịrị n'afọ 2019 dịka o rutere nso n'ọnwa
- Ọ na-anyị arụ ruru kilogram 26, ma nwee ụkwụ taya isii
- Ọ malitere njem ya n'ebele elekere abụọ na ọkara nke ụbọchị 14 ọnwa Julaị 2023
- A na-eche na ego ole e ji rụọ ụgbọelu a bụ Chandrayaan-3 bụ ihe dịka nde dọla 75
- Ọ bụghị ụgbọelu nke mmadụ na-anọ n'ime ya, bekee na-akpọ ya 'unmanned space craft'








