Dinta ahụ kwesiri ịta ahụhụ-Onyeisi NCF
Na mkparịtaụka ya na onye ntaakụkọ BBC nwere, Joseph Onoja, onyeisi ngalaba na-ahụ maka nchekwa ụmụanụmanụ na-achọ mkpochapụ nke a kpọrọ NCF n'aha ịchafụ gosirị obi mwute ya na mgbagbu otu dinta gbagburu enyi ọhịa n'Ondo steeti.
Onoja rịọrọ gọọmentị Ondọ steeti ka ha taa nwoke ahụ ahụhụ iji kuziri ndị ọzọ na-eche ụdị echiche ahụ nke ọ kọwara na 'ọdị oke njọọ' ihe.