Etu ndị 'unknown gunmen' si wakpoo ọdọ ndị 'custom' n'Abia steeti

Lee akụkọ ndị dị mkpa ị kwesịrị ịkọrita.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Mangosuthu Buthelezi, eze ndị Zulu,anwụọla ka ọ gbachara afọ 95

    Chief Mangosuthu Buthelezi

    Ebe foto si, AFP

    Onyeịsị obodo Zulu,Mangosuthu Buthelezi, nke South Africa anwuoola na afọ 95.

    Dika onyeịsịala South Africa Cyril Ramaphosa siri kwụ, Buthelezi nwụru na ụbochi Satode, nke mere ya ịzụụka abuọ ọ gbara afọ ịrị itoolu na ise (95)

    Cheta na na Mangosuthu Buthelezi bụ otu onye na ndi welitere ịsị na ochichi mba Saụt Afrịka oge ọchịchị mkpagbu ndị isiojii n'aka ndịọcha a kpọrọ, 'Apartheid' na Bekee.

    Ihe e jiri mara ya bụ na ọ bụ onye kepụtara pati nke a na-akpọ 'Zulu Inkatha Party' n'agbata afọ 1990s.

    Buthelezi bụ otụ onye n’ime ndị ndọrọndọrọ ọchịchi Saụt Afrịka na oge mbụ na-ha akwado mmegbu na mmekpa ndị ịsị ocha Saụt Afrịka.

    Cheta na afọ 1990s, Buthelezi na Nelson Mandela nwere nghọtahie nke mere Mandela jiri boya ebụbọ na o kwadoro ndị ịsi ocha Saụt Afrịka na mmegbu ha na-emegbu ndị ịsi ojii South Africa.

    He lụrụ Irene,onye na-agụ nọọsụ si Johannesburg.

    A sị na nna ya lụrụ nwaanyị 40 mana dịka onye ụkaa Anglikan na-akasi ụka ike, ọ jụrụ ịlụ ọtụtụ nwaanyị dịka eze na-achị ndị Zulu oge e chiri ya eze.

    Nelson Mandela na Mangosuthu Buthelezi

    Ebe foto si, Getty Images

  2. Ndị 'unknown gunmen' awakpoola ọdọ ndị 'custom' n'Abia steeti

    Ụgbọala ndị kọstọm a gbara ọkụ

    Ndị bu egbe amaghị ndị ha bụ wakporo ọdọ ndị Kọstọm dị n'okporoụzọ awraawara si Enugu gawa Aba na Pọtakọt n'Isiala Ngwa n'Abia steeti.

    Mwakpo ahụ bụ nke mere n'ebe Elekere Asatọ nke abalị Tọzde na nso ọnọdụ ndịagha mmiri dị na Umuika Junction.

    Ndị omekatara ihe daaụjọ ahụ suru ụgbọala ndị kọstọm ọkụ ma gbakanyere onye njem nọ n'ụgbọala pụtara oge ha na-akpa ike, merụọ ya ahụ.

    Akụkọ kwuru na e bugara nwa amadi ahụ ụlọọgwụ akpọghị aha ya.

    Otu onye nọ ebe ihe mere kwuru na ọ bụ ndịagha si Nigerian Army Ohafia 14 Brigade bụ ndị gbatar ọsọ enyemaka weta udo na mpn'ebe ya bụ ihe mere dịka njem n'akụkọ abụọ okporoụzọ ahụ nọrọ n'ọnọdụ ejeghị eje anaghị ana rue 144 Battalion,

    Mbọ BBC Igbo gbara ịnụta olu ndị agha 14 Brigade amịtaghị mkpụrụ.

    Ọge onye ntaakụkọ anyị kpọrọ ọnụ na-ekwuru ha bụ Lt Innocent Omale,n' ekwenti, o nwetaghị ya nke ọ na-asa ozi e zigara ya oge anyị wepụtara akụko.

    Ụgbọala ndị kọstọm ndị omekome gbara ọkụ
  3. Otti achụọla ndị ikpeazu were ọrụ n'ikpeazụ

    Alex Otti

    Ebe foto si, Alex Otti/Facebook

    Aka na-achị Abịa steeti bụ Alex Otti enyela ntuziaka ka a chụọ ndị ọrụ Bekee steeti ahụ e were n'ọrụ malite n'ọnwa Disemba afọ 2022.

    Ntuziaka ahụ dị n'akwụkwọ ozi nke onyeisi ọrụ steeti ahụ bụ Joy maduka binyere aka ma zigara ndị kọmishona nakwa ndị nnukwu odeakwụkwọ na mịnistri dịga na steeti ahụ.

    Ozi ahụ sịrị, "Dịka nhaziriharị usoro Ọrụ Bekee Abia na-aga n'ihu, nke a bụ iji zi gị ozi nke Gọvanọ Abia steeti ziri ka achụọ ndị nile e were n'ọrụ malite n'ọnwa Disemba afọ 2022."

    Dịka ụlọntaakụkọ Nation siri kwuo, ndị Gọvanọ steeti ahụ pụrụ apụ na nsonso a bụ Okezie Ikpeazu were n'ọrụ na njedebe ọchịchị ya so na ndị anatabeghị ụgwọọnwa ha kemgbe gọọmentị nọ ugbua malitere nnyocha onye bụ onye n'ọrụ Bekee steeti ahụ.

    Cheta na abalị ole na ole gara aga, ndị ọrụ Bekee wakporo ụlọrụ odebe ego nke steeti bụ onye ha kpọchigidere ụzọ sị ka a gwụọ ha ngwọọnwa ndị eji ha.

    Akwụkwọ ozi si n'aka Gọọmentị Abia

    Ebe foto si, Abia Govt

  4. Electricity Tariff: Ndị ọkwaakwa emeela ngagharịiwe n'Aba

    Ndị ọkwaakwa Aba

    Ndị ọkwaakwa bi n'Aba, Abia steeti emela ngaghịiwe maka enweghị ọkụ nakwa nnukwu ego ha na-akwụ n'ụgwọ ọkụ.

    Ha kwuru na akwụkwọ ụgwọ ọkụ a na-ebutere ha na ọkụ a na-enye ha n'ụbọchị adabaghị.

    Ụfọdụ akwụkwọ ha bu ha ji ekwupụta iwe na-ekwu sị, Aba Power, kweenụ ka ndị ọkwaakwa kuru ume, anyị abụghị ndị omekome;'" Aba Power' egbuola anyị';'O zuola bụ na ozuola" wdgz.

    Ha kpokuru gọọmentị steeti ahụ ka ọ gabatara ha ọsọ enyemaka.

  5. ‘Ọ bụ ọgwụ ka m gara ịzụ oge nkịta tagburu nwa m’

    Nkịta na nwaanyị nkịta tara

    Ebe foto si, Iwaria/BBC

    NdỊ uweojii Osun state ekwuola na ha anwụchiela onye nwe nkịta tagburu nwa nne ya kwọ n’azụ nan so nso a.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Osun bụYemisi Opalola bụ onye kwuru nke a n’ozi o wepụtara kwuru na ha ka akpụpụ ya ụlọikpe.

    Nkita wakporo otu nwaanyi kpọ nwa ya aga n’ụzọ, tagbuo nwa ọ kpọ aga ma merụọ nwaanyị ahụ ahụ na Hazlleluyah Estate dị n’Osogbo na nsonso a.

    Nafisat Oyebade kwuru na ya na-aga ọdọ ọgwụ ịzụtara onwe ya nakwa nwa ya ahụ adịghị ọkwụ oge nkịta dọọrọ ma tagbuo nwa ya.

    Nafisat kwuru na nkịta ahụ merụrụ ya ahụ tupu ndị mmadụ abịa zọpụta yuya.a na-ere

    “ Agara m ịzụta ọgwụ, nkịta chụwa nwa m, tagbuo ya merụkwa m ahụ.”

    “Amaghịdị m oge e bugara m ụlọgwụ mana arị®rị m riri elu oge a gwara m na nwa m anwụọla.”

    ọ gara n’ihu bekuo gọọmentị nakwa ndị uweojii ka há nye ya ikpemnkwụmọtọ n’ebe onye nwe nkịta ahụ nọ.

  6. Ndewoonu!

    Igbo ndị ọma, soro anyị maka akụkọ dị mkpa!