Hunting: Lee ka e si achụ nta n'ala Igbo
Ịchụ nta bụ omenala Igbo dịwara mgbe gboo.
Ndị Igbo na-achụ nta iji nweta anụ ha ji eri ihe n'ụlọ nakwa nke ha na-ere n'ahịa.
Onye ọbụla topụtara okoroọbịa n'Igbo nwereike ịchụ nta.
Dinta maara ọhịa na ụzọ niile maka na ha na-eso ụzọ ndị ahụ achụ nta mgbe niile.
Ha na-ejikwa egbe, mma na nkịta ga-achụ nta ha.
Akụkọ ga-amasị gị:
Soro anyị dịka anyị soro ndị nta chụọ nta n'Olo, Ezeagu dị n' Enugwu steeti.