Anyị na-eti mkpu ndị ọcha ịkpagbu ndị ojii, kedụ ihe mere anyị ji akpagbu ndị osu? - Nuzo Onoh

- Onye dere ya, Uche Akolisa, Kelechi Anozia, Marco Oriuto
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist, Video Journalist, Producer

Ebe foto si, Nuzo Onoh
Nuzo Onoh bụ nwaafọ aha ya na-ada ụda n'ala Bekee maka ide akwụkwọ na-eyi egwu banyere ihe na-eme n'Afrịka(African horror.)
Na nsonso a, Nuzo Onoh ritere akatamkpo nturuugo, "Bram Stoker's Life Achievement Award,' maka ọtụtụ akwụkwọ na-eyi egwu banyere Afrịka o deerela.
Na nsonso a, Nuzo Onoh ritere akatamkpo nturuugo, "Bram Stoker's Life Achievement Award,' maka ọtụtụ akwụkwọ na-eyi egwu banyere Afrịka o deerela.
Ndị nwere agba riterela nturuugo ahụ gunyere odee akwụkwọ oyiegwu dịka Stephen King, Anne Rice na omee ihe ejije na-eyi egwu a ma bụ Christopher Lee, onye eji agwa 'Dracula' mara n'ọtụtụ ihe ejije.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere Nuzo kọwara ihe o jiri dee maka ndị Osu n'ala Igbo n'otu n'ime akwụkwọ o dere ọ kpọrọ , "Dance for the Dead'.
Ọ sịrị, "Ohu abụghị osu mana ọ dị ka ọnya. Ihe a na-eme ndị ohu ka a na-eme osu. A naghị ekwe ha gaa iyi ebe nwadiala na-aga iyi. A naghị ekwe ha lụkọta nwadiala. Ihe a nile a na-eme na-ewutesi m ike."
"Ndị a na-akpọ ndị osu, ha nile bụ ndị ojii ka anyị. Ha bụkwa ụmụnne anyị, mana anyị na-akpagbu ha.
"Mgbe anyị na-akpagbu ha, kedụ ọnụ anyị ga-eji pụta sị na ndị ọcha na-akpagbu anyị maka na anyị bụ ndị ojii?....Ọ bụghị sọ be anyị ka ọ dị, ọ dị n'India, Pakistan, Moroco, Egypt. Ọkọtọkọ obodo nwere ya mana ọ dịghị mma.”
Onye budi Nuzo Onoh?
- Nuzo Onoh bụ onye na-ede akwụkwọ na-eyi egwu a ma ama n'ụwa.
- Ọ bụ onye Ngwọ, Enugwu steeti, nwa nke atọ n'ime ụmụ asatọ gọvanọ Anambra steeti ochie bụ CC Onoh na Nwunye ya bụ Caroline Onoh mụrụ.
- Ụmụnne ya gụnyere nwunye odmegbu Ojukwu bụ Bianca Ojukwu,
- O toro n'Enugwu, gụtụ akwụkwọ na Naịjirịa tupu ọ gawa ala Bekee ebe ọ gụchara Sekọndịrị ma gụkwaa mahadum na Warwick University bụ ebe ọ gụrụ Iwu maka asambodo mbụ.
- Ọ gụkwara nka edemede (Creative Writing) n'otu mahadum ma nwete asambodo nke abụọ ( Masters degree) ya.
- Nwada a ma dịka "Ezenwanyi ṅdị na-ede akwụkwọ na-eyi egwu" edeela ọtụtụ akwụkwọ gụnyere ; 'The Reluctant Dead' (2014) ; 'Unhallowed Graves'(2015) ; 'The Sleepless' (2016) ; 'Dead Corpse' (2017) ; 'The Unclean' (2020) na 'Dance for The Dead' (2022) bụ akwụkwọ o jị akatọ mmegbu a na-emegbụ ndị a kpọrọ osu.
Gee ihe o kwuru n'uju n'ihe onyonyo di n'elu:






