Osu Caste system: Ndigbo agbakọọla na Nri maka imebi ya

Lee foto ka o si mee dịka ndị eze, ụmụafọ nakwa ndị ntaakụkọ gbakọrọ n'ala Nri ụbọchị Fraide maka imebi Osu n'Alaigbo.

Ndị eze
Nkọwa foto, Lee ndị eze so gbakọọ n'ala Nri ụbọchị Fraide maka imebi Osu n'Alaigbo
Ndị eze
Nkọwa foto, Ndị eze si Enugu, Abia, Imo, Rivers, Delta steeti so bịa ije ahụ nke bụ mmemme nke e mere n'obi Eze Nri, Eze Ikenna Onyeso bụ nke emere na ụdị Omenala nakwa usoro ndị ụka.
Eze Nri, Eze Ikenna Onyeso
Nkọwa foto, Eze Nri, Eze Ikenna Onyeso kọwara na ndị ọsọ bụ ndị achụbara ọsọ ha gbakwuru alụsị, a kpọbazịa ha nwa alụsị. Onyeso mere omenala dịka isi Igbo wee kụọ ọfọr na-ala iji kagbue ịkpa oke ahụ.
Ndị ntaakụkọ
Nkọwa foto, Ndị ntaakụkọ sokwa gbakọọ n'ala Nri maka emume a.
Ọkọlọtọ mgbasaozi megide ịkpa oke Osu, Oru nakwa ume
Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ala Igbo zukọtara na Nri mebie nkewa Ndigbo na-ekewa na onwe ha kpọọ ụfọdụ mmadụ osu, ohu ma ọ bụ ume.
Ndị Eze
Nkọwa foto, 'Osu, oru na ume bụ omenala dị ọjọọ'
Ndị mmadụ nọ n'ọgbakọ maka ikposa Osu na oru
Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị mmadụ gbakọrọ maka ikposa Osu na oru na Nri dị n'Anambara steeti. Otu n’ime ndị a na-akpọ osu biara na ya bụ mmemme bụ Evangelist Eugene Anaya Ogbuji, onye Isialambano kọwara na ndị be ha gbochiri ha ịlụkọ nwaanyị, ichi echichi nakwa ijekọ ụka n'ihi na a kpọrọ ha nwa alụsi.