Dibia, Dimgba, Dike, Diochi na ihe ndị ọzọ mkpụrụ okwu ‘Di’ pụtara n’ala Igbo

A bịa n’omenala nakwa n’asụsụ Igbo, mgbe ọbụla mmadụ n’ụrụ mkpụrụokwu a ‘di’, ihe mbụ na-abịa ya n’uche bụ nwoke lụrụ nwaanyị nke bụ ‘husband’ na Bekee.
Mana mkpụrụokwu a (di) nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ ọ pụtara, ọkachasị ma a gbakwụnyere ya okwu ọzọ ma kpọpụta ha n’uju.
Akụkọ a ga-eleba anya na ntọala mkpụrụokwu a bụ ‘di’ nakwa ihe ndị ọzọ ọ pụtara n’asụsụ Igbo.
Ihe ‘Di’ pụtara n’asụsụ Igbo

Ebe foto si, Chijioke Ngobili
Otu onye nkuzi n’ihe banyere asụsụ, omenala na akụkọ ndị Igbo na mahadum Naịjirịa dị na Nsukka (UNN) bụ Maazị Chijioke Ngobili kwuru na ‘di’ bụ mkpụrụ edemede abụọ mepụtara otu mkpụrụokwu mana ihe dị na ya dị ka osimmiri.
O kwuru “onye ọbụla chọrọ ịghọta asụsụ Igbo ga-ebu ụzọ gaa na ntọala maọbụ mgbọrọgwụ okwụ bụ ‘root word’ na Bekee.
“Di bụ mkpụrụ okwu n’onwe ya ma bụrụkwa mgbọrọgwụ okwu.”
Ngobili kwuru na mkpụrụ okwu a bụ ‘di’ na-akọwa onye maọbụ mmadụ.
“Mkpụrụokwu a bụ ‘di’ na-akọwa na e nwere onye dị, na o nwere ihe onye ahụ na-ahụ maka ya, nke mere na okwu ọbụla a kpọrọ ‘di’ n’asụsụ Igbo ga-enwe ihe so ya n’azụ, ọ naghị akwụrụ onwe ya.”

N’iji maa atụ, Maazị Ngobili kwuru “N’okwu dị ka ‘di na nwunye’; di ahụ pụtara ‘dibuụlọ’ nke bụ nwoke lụrụ nwaanyị ma bụrụ onyeisi ezinaụlọ ya. Ụlọ anaghị adị ma e nweghi ndị mejupụtara ya, nke bụ dibuụlọ na nwunye ya.”
O gara n’ihu nye ọmụmatụ ndị ọzọ dịka ‘dibia’ - onye maara ihe banyere ntọala, ọdịnala, omenala, ịgbafa, ịgọmmụọ na ihe ndị zoro ezo, ‘dinta’ – onye maara ihe banere ịgba nta, omenala na ihe mmụọ na-eso ịgba nta, ‘dinka’ – bụ onye na-akwa nka ọfụma n’ụzọ dị iche iche.
Maazị Ngobili sị na ihe mere ọtụtụ ndị Igbo ji ahụta ‘di’ ka ‘husband’ bụ n’ihi mkpọbiri a na-akpọbiri ọtụtụ okwu ugbua, na okwu dịka ‘Achebe’ bụ mkpọbiri okwu ‘Anachebe’.
Ọmụmatụ ndị ọzọ gosiri ‘Di’ na ihe ha pụtara

Dịka Maazị Chijioke Ngobili si kwuo na ‘di’ na-egosi onye nakwa ọnọdụ maọbụ njirimaara onye ahụ, ọmumatụ ndị a kọwara ya n’uju;
- Dimkpa – nke pụtara onye dị mkpa n’ezinaụlọ, n’otu, n’ọgbakọ maọbụ n’obodo – mgbe nwata tozuru ihe e ji nwoke eme.
- Diochi – onye maara ihe banyere ịkụ mmanya ngwọ maọbụ nkwụ nke ọma
- Diọkpara - onye bụ nwa nwoke mbụ a mụrụ n’ezinaụlọ, nwere ugwu na ikike pụrụiche.
- Diala – onye nwe ala, maọbụ nwafọ ala, nwere ikike iketa oke n’obodo n'ezinaụlọ maọbụ n'obodo
- Dimgba – onye maara nke ekwe na-akụ ọfụma n’egwuregwu ịgba mgba
- Dike – Onye nwere ikike pụrụiche n’ime ihe ọkachasị n’ịlụ agha
- Diji – Onye maara ihe banyere ịkụ ji, ịkọ ji, ike ji nakwa emume niile banyere ji (afọjiọkụ). E nwekwara ike ịkpọ ya Ezeji
- Diuru – onye baara ọgaranya, nwere ego nakwa onye bara uru n’ezinaụlọ nakwa n’obodo
E nwere ọtụtụ okwu ndị ọzọ a na-agbakwụnyere ‘di’ ka o nwee nghọta zuruoke n’asụsụ Igbo, obodo dị iche iche nwere olu ndị ha jiri akpọpụta nke ha mana ha niile pụtara otu ihe.








