Happy New Year 2023: Etu ndị Igbo si achụ afọ ochie ma nabata afọ ọhụrụ

Ụbọchị mbụ nke afọ ọhụrụ kwa afọ bụ ụbọchị ọtụtụ ndị mmadụ na-atụ anya ya nke ukwuu n'ụwa gbaa gburugburu.
Ọtụtụ mba, na-agbanyeghi okpukperechi ha, nwere emume ha na-eme n'abalị ga-abọta ụbọchị ahụ (New year eve) iji nabata afọ ọhụrụ.
Kedụ etu ndị Igbo si ahụta afọ ọhụrụ?
Ndị Igbo n'aka nke ha anaghị ekpete azụ n'emume na-eso nnabata afọ ọhụrụ.
Ha na-ahụta ụbọchị mbụ nke afọ ọhụrụ dịka ụbọchị kachasị oke mkpa n'ime afọ n'ihi olileanya ha nwere na ọ ga-aka mma karịa afọ gara aga.
Ọ na-amasị ndị Igbo nke ukwuu ịnọ n'obodo ha achụ afọ ochie ma nabata nke ọhụrụ.
Nke mere ọtụtụ ndị Igbo ji emechi ọrụ ha, azụmaahịa na ọdọahịa ha niile ma lawa obodo ha iji gbaa afọ ọhụrụ.
Kedụ emume ndị ha na-eme maka afọ ọhụrụ?

Onye ọkammụta n'asụsụ nakwa omenala Igbo bụ Maazị Chigozie Nnabuihe sị na ịchụ afọ bụ ihe dịịrị onye ọbụla n'obodo.
Na ọ bụ ihe ndị Igbo ji ekele Chineke maka afọ nke gara aga nakwa ị rịọ ya ọ dị mma nke afọ na-abịa abịa.
Maazị Nnabuihe sị na mgbe gboo na a na-emere ya omenala pụrụiche mana dịka ọ dị ugbua na ọ bụzi onye ọbụla maọbụ ezinaụlọ ọbụla na-agọ ọfọ ọma n'isi onwe ha.
Ndị dịka dibia ụlọ, ndị okenye ọha obodo maọbụ ezemmụọ na-atụpụ mmanya ma gọọ ọfọ n'isi ezinaụlọ, ọha obodo nakwa ndị na-efe chi ha.
Kedụ ụdị ọfọ a na-agọ iji nabata afọ ọhụrụ?

Maazị Nnabuihe sị na ụfọdụ ekpere na ọfọ a na-agọ n'elu afọ ọhụrụ gụnyere;
- Nchekwa - Ka afọ ọhụrụ chekwaa ha dịka ndị gaara aga si chee ha.
- Ọmụmụ - Ka a mụta ụmụ ma zụọ ụmụ ndị a.
- Nkụta akụnaụba - Ka a kụta akụnaụba n'afọ ọhụrụ.
- Owuwe ihe ubi - Ka a kọpụta ihe n'ubi ma riekwa ya, maka na isi ọrụ ndị Igbo bụ ọrụ ubi.
- A na-arịọ Chineke ka ihe a ga-eri ghara ịkọ kama ka ihe ga-eri isi mmadụ aghara ịbịa.
- A na-arịọ ka echiche ọjọo mmadụ maọbụ mmụọ na-echere ha ghara ịbịa na mmezu.
- A na-agọ ọfọ ndụ nwoke na nwaanyị, ọ dị mma nwoke na nwaanyị. Ka ihe niile gaa nke ọma.
- A na-agọ ọfọ ka afọ ochie gbara aka ma buru ihe ọjọọ ya niile lawa ka afọ ọhụrụ buru ihe ọma bịa.
O nweghi kpọmkwem oge a ga-asị kachasị mma ịgọ ọfọ maọbụ ikpe ekpere kama ọ na-abụkaarị awa ole na ole ka abanye afọ ọhụrụ.

Ebe foto si, Getty Images
Dịka ọ dị ugbua, ndị okpukperechi Kraịst na-agazi n'ụlọụka ha dị iche iche iji kpee ekpere ịnabata afọ ọhụrụ.
Ekpere ha na-ekpe n'ụlọụka adịchaghị iche na nke dibia ụlọ, ndị okenya ọha obodo maọbụ nke Ezemmụọ n'ekpe.
Ekpere na ọfọ niile a na-ekpe maọbụ na-agọ bụ ikele Chineke maka afọ gara aga ma rịọ maka ọ dị mma afọ ọhụrụ.










