Ihe jikọrọ akụkọ ifo ndị Igbo na ụfọdụ akụkọ ndị dị na 'Bible'

Akụkọ ifo bụ ụzọ ndị Igbo ji akuziri ụmụ ha ihe. Enweghị onye ma ebe maọbụ etu akụkọ ifo ndị Igbo siri bido. A na-esite n’okenye maọbụ nna maọbụ nne nyefee n’aka ụmụaka.
Kama ụfọdụ ndị ọkaibe n’ihe gbasara akụkọ ndị Igbo na-ekwu na e nwere ụfọdụ akụkọ ifo ndị Igbo yiwere ụfọdụ akụkọ a kọrọ n’akwụkwọ nsọ okpukperechi ndị Kraịst.
Ọkammụta n’ihe gbasara asụsụ Igbo bụ Chigozie Nnabuihe kọwara ụfọdụ akụkọ ndị na Bịbụlụ nke yiri akụkọ ifo ndị Igbo.
Nnabuihe kwuru na e nwere akụkọ ndị dị n'akwụkwọ nsọ yiri akụkọ ifo ndị Igbo, mana sị na akụkọ ifo adịrịla tupu a kọwa akụkọ ndị a nọ n’akwụkwọ nsọ.
Ụfọdụ akụkọ ndị a gụnyere;
Mmiri izo akwụsịghị akwụsị

Ebe foto si, Getty Images
Nnabuihe kwuru sị, “E nwere akụkọ dị n’akwụkwọ nsọ nke na-ekwu na mmiri zoro akwụsịghị akwụsị, ndị igbo nwerekwara nke ha”.
Ọ sị na Igbo nwere akụkọ ifo nke kwuru na mmiri zoro akwụsịghị akwụsị abalị asaa nke mere na azụ si n’elu igwe na-ada.
O kwuru sị, “Mmiri akụkọ ifo a nke zoro abalị asaa na mmiri nke zoro oge Noah nke riri ụwa niile, ha abụọ yiri onwe ha”.
Akụkọ mgbe e nwere oke ọkọchị
E nwere akụkọ ifo ndị Igbo nke kwuru na Nwakaibeya nyere Okonkwo mkpụrụ ji kama oke ọkọchị bịara nke mere na ọkụ ala gburu ihe Okonkwọ kọrọ.
Nnabuihe kọwara sị, “Ọ dị kwa n’akwụkwọ nsọ mgbe Eze Egypt hụrụ ọhụ nke enweghị onye ga-akọwa ya”.
Nnabuihe kwuru na ọ bụ Joseph dịka akwụkwọ nsọ siri dee si ụlọ nga bịa kọwaa na a ga-enwe afọ asaa oke ọkọchị ma nwee afọ asaa ihe ga-adị.
Akụkọ onye kere ụwa na akụkọ Noah

Ebe foto si, Thinkstock
Nnabuihe kwuru sị, “ Dịka e siri dee n’akwụkwọ nsọ na mbụ na Chinkere kere eluigwe na ụwa, ụwa tọgbọrọ n’efu na nkịtị, ị gụọ akụkọ a kpọrọ 'Ọjadịlị' site na isi nke mbụ ruo isi nke isii, ị ga-ahụta na mgbe Chineke kere ụwa na mmiri jupụtara ebe niile”.
Ọ gara n’ihu kọwaa na akụkọ ifo Ọjadịlị kwuru na Chineke na ihe ekere eke nọ n’ebe a na-akpọ Igweala were na-eche ka ala nkịtị sịte na mmiri pụta ka Chineke nwee ohere kechaa ihe niile ọ chọrọ ike.
Nnabuihe kọwara na Chineke bu ụzọ zipụ Okpoko. Kama dịka Okpoko ahụghi ebe ọ ga-ebe, o puo nku ma bụrụ anụ mbụ na-efe efe.
Cheta na ọ bụ nnụnụ bụ anụ mbụ Noah zipuru n’ụgbọ mmiri ịmata ma ala apụtala dịka Bịbụlụ siri kwuo.
Akwụkwọ nsọ na-ekwu na e kere ụwa abalị isii, Chineke ezụọ ike n'abalị nke asaa ebe Igbo kwuru na Chineke kere ụwa abalị anọ nke bụ Eke, Orie, Afọ na Nkwọ.
Akụkọ Moses na nke e nwere n’akụkọ Ifo igbo
Dịka akwụkwọ nsọ siri kọọ akụkọ maka nwa a kpọrọ Moses a gụpụtara na mmiri, Nnabuihe kwuru na Igbo nwere ọtụtụ akụkọ ifo maka onye a kpọrọ “Nwa a gụtara na mmiri”.
Ọ kọrọ sị, “ Igbo nwere akụkọ ifo maka otu nwunye Eze mmadụ niile kpọrọ asị, ndị kpọrọ ya asị achọghị ka ọ bụrụ ya ga-amụtara Eze nwa nwoke. Ha tinyere iwu nke siri na nwaanyị ọbụla di Ime ga-amụ nwa n’akụkụ mmiri, ma ọ bụrụ nwaanyị ka ọ mụrụ si tụba ya na mmiri ma ọ bụrụ nwoke sị kpọlata ya”.
Nnabuihe kwuo sị, “Kama mgbe nwaanyị a mụrụ nwa, a tụbara ya na mmiri, e mechara gụpụta ya. Ihe anyị mara bụ na Igbo nwere akụkọ ifo ebe a gụpụtara nwa a tụbara na mmiri”
Njem Mbiri
Nnabuihe rụtụrụ aka were kọwaa na dịka e siri dee na bịbụlụ na Abraham mere njem sị ebe nna ya pụọ nke mekwara na ndị agbụrụ ya mere njem nke ha ji gaa ebe ọzọ bịrị. Agbanyeghị na nke a adịghị n'akụkọ ifo ndi Igbo, Nnabuihe kọwara sị, " dịka e siri dee n'akwụkwọ nsọ, agbụrụ Abraham na-eme njem mbiri dịka ndị Igbo si eme ruo taa".
Akụkọ ifo Nwaezuruonyeọgụ n'akụkọ Jesus na nke Samson
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Nnabuihe kwuru na e nwekwara akụkọ ifo yiri nke Jesus dị n'akwụkwọ nsọ. Akụkọ Jesus bụ nke na-akọwa na e gburu ya, o mechaa site n'ili bilie.
Ọ kọwara sị, "E nwere akụkọ ifo ndị Igbo nke a kpọrọ Nwaezuruonyeọgụ, ya bụ akụkọ ifo na-ekwu na nna Ezuruonyeọgụ bụ Eze obodo ha. Kama mba ndị ọzọ na-enwere ha anya ụfụ ma na-alụsọ ha ọgụ.
Mana mgbe ọbụla ha bịara, nna Nwaezuruonyeọgụ kpọkuo ya ọ bịa lụọ ọgụ ma merie ndị iro ha".
Nnabuihe kwuru sị, " Ọkwa akụkọ siri na Jesus zọpụtara ụmụ Izrel? Nwaezuruonyeọgụ na-azọpụta kwa ụmụnna ya".
Nnabuihe kọkwara na nna Nwaezuruonyeọgụ bụ anya-ahụ-nwaanyị, nke mere na ndị iro ha ji nwaanyi gbaara ya ọnya dịka akụkọ Samson na Delilah dị n'akwụkwọ nsọ.
O kwuru na mgbe nna Nwaezuruonyeọgụ hụru nwata nwaanyị a eji siere ya ọnya, onweghị ike ijikọlata onwe ya ma rịo nwaanyị ahụ ka ha abụọ dịnaa.
Nnabuihe kwuru sị, " Nwaanyị gwara nna Nwaezuruonyeọgụ na ọ chọrọ ka o gbuo nwa ya nwoke n'ihi na ụjọ na-atụ ya na nwa ya nwoke bụ Nwaezuruonyeọgụ ga-egbu ya etu o si egbu ndị iro ha".
O kwuru na nna Nwaezuruonyeọgụ mechara kweta kpọọ nwa ya nwoke ma gbuo ya.
Ọ kọrọ sị na mgbe ya na nwata nwaanyị ahụ dịnachara, nwata nwaayị ahụ a sị ya ka ọ laa ga-bute ngwongwo ya ka ha abụọ biri. Kama ọ lara gaa gwa ụmụnna ya na Nwaezuruonyeọgụ anwụọla.
Nnabuihe kọkwara sị, " Mgbe ndị a bịara ịwakpo ụmụnna Nwaezuruonyeọgụ, nna ya kwara akwa arịri ma kpọkuo nwa ya nwoke, ọ bere akwa ma kpọo ya ugboro ugboro nke mere ka Nwaezuruonyeọgụ sị n'ọnwụ bilie me memilie ndị na-alụsọ ụmụnna ya ọgụ".
Nnabuihe kọwara n'akụkọ a yiri akụkọ Jesus si n'ọnwụ bilie ma yie kwa nke Samson dịka ya bụ nwaokorobịa n'ọgụ ikpeazụ ya gburu ọtụtụ ndị iro ha karịa mgbe ọ di ndụ dịka akụkọ Samson siri mee.
O kwuru sị, " Etu Jesus siri site n'ili pụta ka Nwaezuruonyeọgụ siri site n'ili pụta kwa".









