Asambodo Mahadum Chicago gosiri na Tinubu kpụrụ asambodo o nyere ndị Inec - Atiku Abuubakar

Onyeisiala Tinubu na Atiku Abubakar

Ebe foto si, Bola Tinubu/Atiku Abubakar

Ọkaiwu Atiku Abubakar ekwuola na asambodo onyeisiala Tinubu nyere ụlọọrụ Inec oge ọ na-azụ ọkwa onyeisiala Naịjirịa bụ adịgboroja a kpụrụ akpụ.

Ọkaiwu a bụ Kalu Kalu kwuru nke a Tọzde oge Atiku ji aha Peoples Democratic Party (PDP) zọọ ọkwa onyeisiala mere mgbasaozi pụrụiche mgbe ọ na-atachara asambodo agụmaakwụkwọ Tinubu site n’aka Mahadum Steeti Chicago, mba Amerịka.

N’agbanyeghi na Onyeisiala Tinubu na ndị nkwado ya agọọla n’ebubo ahụ ịkpụ asambodo mana ọkaiwu Kalu kwuru na asambodo ahụ ha ji gosiri na ọ bụ eziokwu.

Kedụ ihe asambodo a kwuru?

Ọkaiwu Kalu sị na ihe ndị dị n’asambodo a gụnyere;

  • Asambodo a gosiri na Bola Ahmed Tinubu kpụrụ asambodo o gosiri ndị Inec akpụ.
  • Asambodo nke si n’ụlọakwụkwọ South West College nke Mahadum Chicago gosiri bu aha nwaanyị nke pụtara na ọ bụghị Bola Ahmed Tinubu nwee ya.
  • Akwụkwọ ule e jiri nnabata Tinubu n’ime Mahadum Steeti Chicago gosiri na ọ gụrụ n’ụlọakwụkwọ Sekọndịri Government College dị na Legọs ma gụchaa n’afọ 1970 ebe e hiwere ụlọakwụkwọ ahụ n’afọ 1974.
  • Asambodo ahụ gosiri na ọ bụ nwafọ mba Amerịka isi ojii nwee ya ebe akwụkwọ Bola Ahmed Tinubu nyere ụlọọrụ Inec, ọ gọrọ na ọ bụghị nwafọ mba ọzọ nke pụtara na ọ bụghị ya nwee asambodo ahụ.
  • Akwụkwọ ahụ kwuru na mkpụrụ edemede A dị na Bola A Tinubu bụ Ahmed ebe akwụkwọ nke o nyere Inec gosiri na A pụtara Adekunle

Nke a o nwereike imetụta ikpe 'Supreme Court'?

Ọkaiwu Atiku bụ Kalu Kalu kwuru na sị “O doro anya site n’ọnụ ndị ọchịchị na Ụlọikpe Kachasị ekwuola na ha nwereike ịnabata akaebe ọhụrụ ma ọ bụrụ e mezuo ụfọdụ ihe ma site n’ihe mere n’ụlọikpe mba Amerịka ihe akaebe ndị a tozuruoke.

“Dị ka anyị na-ekwu, iwu anyị mere ka o doo anya na onye ọbụla dara iwu a ekweghi iri uru mpụ na nrụrụaka o mere.”

Atiku jikwa ohere ahụ kpọkuo Peter Obi ji aha Labour Party zọo ọkwa na Rabiu Kwankwaso ji aha ọzọ New Nigeria Peoples Party zọo ọkwa ka ha soro ya na mbọ ọ na-agba inwete ikpe ziri ezi n’okwu ahụ.

O kwuru na ọ na-akpọ oku maka ọ di mma Naịjirịa, ma sị na ndị niile ihe Naịjirịa na-amasị bịa soro ya na njem ahụ.

Etu Chicago University si wepụta asambodo mahadum Tinubu

Bola Tinubu meriri ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'ọnwa Febụwarị afọ a

Ebe foto si, Bola Tinubu/Facebook

Nkọwa foto, Bola Tinubu meriri ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'ọnwa Febụwarị afọ a
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Mahadum mba Amerịka bụ Chicago State University (CSU) ewepụtala akwụkwọ asambodo Onyeisiala Bola Tinubu dịka onye zọọrọ ọkwa Onyeisiala n'aha otu PDP si rịọ.

Na ngwụcha izuụka gara aga, ụlọikpe mba ahụ dị n' Illinois dị n'Amerika nyere iwu ka e nye Atiku akwụkwọ ndị ahụ.

N'ọsịsa, arịrịọ nke atọ Atiku rịọrọ, ka e nye ya akwụkwọ gosiri mpụtara ndị pụtara na mahadum ahụ n'afọ 1977, mahadum ahụ kwuru na ya na nke Tinubu Tinubu ji nke bu akara Juun afọ 1977 b u otu ihe.

Mahadum ahụ sịrị, "Dịka e mechaea nnukwu nnyocha,,mahadum CSU University ahụla ma nyefee akwụkwọ ndị a sị ka ewepụta nke akara ha bidoro na CSUO008 rue CSU0010.

"E wepụrụ aha ụmụakwụkwọ dị n'akwụkwọ ndị ahụ iji gbochie ịgba aha ha n'anwụ."

"CSU ga-eji akara CSU0011 na 0017 wepụta mpụtara ụmụakwụkwọ ndị dị ya nso ma etingye aha ha (n'ihi na e wepụrụ aha ha.)".

"Akwụkwọ ndị a dabara na nke Tinubu, bụ nwata akwụkwọ e zitere.".

Na mbụ, Tinubu na-ekwubu na sasambo o nwetara na mahadum ahụ furu efu nke mere ka ya inye Inec akwụkwọ ọzọ iji dochie anya asambodo mahadum ya dịka ọ banyere n'ọsọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2023.

N'abali 19, nke ọnwa Septemba afọ 2023, Ọkaikpe Majie bụ Jeffrey Gilbert nke Ụlikpe Majie mba Amerika nabatara arịrịọ inke rịọrọ ka o nye iwu ka ewepụta asambod Bola Tinubu na'ime awa 24.

Iji gbochie nke ahụ ime, Tinubu gbaghara ya bụ arị®ịọ Atiku rịọrọ si ka a ghara ịna Atiku ntị.

Nancy Maldonado nke Ụlọike Etiti kwuru n'ezie na Tinubu chọrọ ịgbagha arịrịọ ka e wepụta asambodo ndị ahụ.

Iji rube isi iwu nke Ụlọikpe nyere, ma mezuo ihe Atiku rịọrọ,,CSU kwuru na ha ahụghị kpọmkwem, asambodo ha nyere Tinubu n'afọ 1979.

Mahadum Chicago University sịrị," CSU anaghị edowe asambodo ụmụakwụkwọ ndị gụrụ na mahadum, ka a chọchara ya ogologo oge,, a hụghị nke e nyere Tinubu n'afọ 1979, ya bụ a hụghị nke ahụ kpọmkwem." However, the university has released the documents of some students whose names have been withheld,

Atiku Abubakar ch ọrọ iji asambodo ndị ahụ dịka ih e akaebe n'Ụlọikpe Kachasị nke Naijiria bụ ebe o wegara ikpe maka mpụtara Ntuliaka Onyeisiala nke afọ 2023.