Etu aka si kpara nwoke ji nkwa ọlụlụ gwuo ụmụnwaanyị isii chamdum nnukwu ego

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii Imo steeti anwụchiela nwoke ji nkwa alụmdinanwuye anapụ ụmụwanyi ego ha .
A nwuchiri Wisdom Mmaduka gbara afo 30 ụbọchị Satọde maka ebubo iji nkwa alụm di na nwanyi were zụo umunwaayi isii(6) ohi n’Imo steeti.
Ana- enyo Mmaduka maka ebubo na ọ napụrụ otu nwaanyi dabara n' aka ya ego ruru otu nde na ụma narị anọ(N1.4 m) .
Mmaduka nwere ndị ya na ya na-arụkọ ọrụ bụ ndị o ji eme nne na nna ya na Mbaise, Imo steeti bụ ebe ọ na-akpọ ụmụnwwanyị aga nke mere ụmụnwaanyị ndị o kwere nkwa na-ekwenye na nkwa ya n'ezie.
Nwa amadi ahụ sara asịsa sị na nke ahụ bụ usoro o ji a napụta ụmụnwaanyị ọkpụrụkpụ ego.
Ọ na-akpọ ụmụwaanyi aga, na ụdị ị kpọro ha ruo ụlọ nna ya ma gosi ha 'nne na nna ya'.
Oge na-adighị anya, ihe ọzọ ọ ga-eme bụ ị napụ ha ATM Kaadị, were ego nile dị'akpaego ha n'ụlọakụ.
Ndị uweojii Imo steeti kwuru na ya bụ akụkọ bụ eziokwu.
Mgbe BBC Igbo kpọrọ Ọnụ na-kwuru ndị uweojii Imo Steeti bụ Henry Okoye, ọ kwuru na akụkọ ahụ.
Okoye gbara ama na oge ndị uweojii nwụchirị nwa amadi ahụ na ụmụwanyị isii pụtara gbaa akaebe na ha danyere n' aka Mmadụka dịka o ji alụmdi napụha nnukwu ego.
Ndị uweojii napụtara ya otu ụgbọala 'Highlander SUV eboro na ọ napụrụ otu nwaanyi dabara na aka ya bụ Rose Mgbe,onye Krọs Rivas steeti.
Ha chọpụtakwara na Wisdom Mmaduka nwere nnukwu ụlọ ọ lụrụ na Naze Owere nke a siri na o ji ego o zutere n’ohi ruo.
Ọ gara n'ihu kwuo si,"A kpụpụla ya ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Owere dịka e jichiri ya n'ogige ndị uweojii."











