Drambi Vandi: Ụlọikpe amaala onye uweojii gbagburu Bolanle Raheem ikpe ọnwụ

Ebe foto si, BOLANLE RAHEEM/BBC
Otu ụlọikpe na Legọs amaala onye uweojii aha ya bụ Vandi Dramdi ikpe ọnwụ maka ịgbagbu otu nwaanyị onye ọkaiwu bụ Bolanle Raheem n'ụbọchị ekeresimesi nke afọ 2022.
N'ikpebi ikpe ahụ n'ụbọchị Mọnde, bụ ụbọchị itoolu nke ọnwa Ọktoba 2023, ọkaikpe kwuru na ndị uweojii abụọ so Vandi nọrọ ọrụ n'okporoụzọ n'ụbọchị ihe ahụ mere kwuru na ọ bụ ha kwụsịrị ụgbọala nke Bolanle Raheem nọ n'ime ya na mpaghara okpuru akwammiri n'Ajah, Legọs.
Ndị uweojii abụọ ahụ bụ ndị gbara akaebe n'ikpe ahụ kwuru na otu n'ime ha bu ụzọ kwụsị ụgbọala ahụ, mana ọ kwụsịghị ruo mgbe ọ garuru n'ebe onye uweojii nke ọzọ nọ tupu ọ kwụsị. Ndị uweojii ahụ kwuru na ha nụrụ ụda egbe mana ha ahụghị oge Vandi gbapụrụ ya bụ egbe.
Nnyocha 'autopsy' nke e mere n'ozu nwaanyị ahụ nwụrụ anwụ gosiri na ọ bụ mgbọ egbe gburu ya maka na e wepụtara mgbọegbe n'ahụ ya.
Vandi kwuburu na aka ya dị ọcha n'ebubo igbu Bolanle Raheem, ma na-ekwusi ike na ọ gbapụghị egbe ya.
Onye uweojii Vandi gwara ụlọikpe na ya nọ ihe dịka otu narị mita n'ebe ụgbọala Bolanle Raheem nọ n'ime ya, na onweghị ihe ga-eme ya ka ọ gbaa egbe AK-47 ya na nso dị etu ahụ.
O kwuru na ọ bụrụ na ya gbara egbe ahụ n'eziokwu, mgbọegbe ahụ ekwesịghị ịnọgide n'ime ahụ nwaanyị ahụ. Kama o kwuru na ụda ahụ a nụrụ bụ ụda 'banger' nke ụmụ ọkọrọbịa na-egwu egwu n'okporoụzọ na-agba.
Mana ụlọikpe kwuru na nnyocha ha gosiri na ọ bụ naanị Vandi kwuru na ya anụghị ụda egbe kama ihe ọ nụrụ bụ ụda 'banger'.
Ụlọikpe kwukwara na nnyocha gosiri kpọmkwem na ọ bụ mgbọegbe gburu Bolanle Raheem dịka mgbọegbe ahụ banyere n'ime obi ya. Ha kwukwara na ndị akaebe kwetara na ha nụrụ ụdaegbe nke gburu nwaanyị ahụ ozugbo.
Ọzọ bụ na ọ bụ naanị Vandi bụ onye nọ n'akụkụ ebe mgbọegbe si banye n'ahụ nwaanyị ahụ nwụrụ anwụ, ma kwukwaa na 'banger' ọbụla enweghị ike ịbanyenwu n'ime obi nwaanyị ahụ nwụrụ anwụ.
Nke a mere ụlọikpe ji kwuo n ikpe mara Vandi.
Bolanle Raheem na ndị ezinụlọ ya si n'ụlọụka na-ala n'ụbọchị ekeresimesi, bụ Disemba 25 2022 mgbe ọdachi ahụ mere na mpaghara Ajah.
Akụkọ kwuru na ọ bụ Di Bolanle na-akwọ ụgbọala ahụ dịka Bolanle n'onwe ya nọ n'akụkụ ya n'ihu ụgbọala ahụ, oge ndị uweojii kwụsịrị ha. Mana dịka ọ na-achọ ịkwụ ụgbọala ya nke ọma otu n'ime ndị uweojii ahụ gbara egbe ya mgbọ wee tụọ nwunye ya n'obi.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Oge ihe a mere, onyeisi ndị uweojii oge ahụ bụ Usman Alkali Baba nyere iwu ka akwụsịtụ onyeuweojii Vandi Dramdi ọrụ iji mee nnyocha gbasara ọdachi ahụ.
Onye bụ Bolanle Raheem

Ebe foto si, Bolanle Raheem
- Ewepụ na ọ bụ onye ọkaiwu, Bolanle Raheem bụkwa onye na-agba mgbere ụlọ na ala, nke a na-akpọ 'realtor' na Bekee.
- Ọ na-arụ n'ụlọọrụ 'Tribitat Real Estate'
- Ọ gụrụ akwụkwọ ma nweta ọzụzụ dịka ọkaiwu n'ụlọ akwụkwọ 'Ogun State University'.
- Ọ lụrụ di ma mụọ otu nwa, ụfọdụ sịkwa na ọ dị ime tupu ọnwụ ya.









