Mrs Bolanle Raheem: Ihe anyị chọrọ bụ opeketekmpe ijeri N5 na ikpe ekpere ọsịsọ - NBA

Bolanle raheem

Ebe foto si, Twitter

Nkọwa foto, Bolanle Raheem

Otu jịkọrọ ndị ọkaiwu na Naijirịa bụ Nigerian Bar Association ekwuola na ihe ha chọrọ bụ ka akwụọ ezinụlọ Bolanle Raheem ijeri naịra ise ya na ikpe ekpere ọsịsọ dịka onyeuweojii gbagburu Raheem na Legọs steeti n'ụbọchị 25 nke ọnwa dịsemba a nke bụkwa ụbọchị ekeresimesi.

Ọ bụ n'akwụkwọ ozi nke ọkaiwu ukwu bụ Ebun-Ola Adegboruwa depụtara n'ụbọchị tọzde ka ha kwuru nke a.

Adegboruwa kwuru sị ka gọvanọ Legọs steeti bụ Babajide Sanw-Olu were usoro esiri hiwe nzụkọ ikpe oge EndSARS nye ndị ezinụlọ a ego iti aka n'obi.

Ọ gara n'ihu kwuo, " Ọ dịghị mma na gọọmentị kwere nkwa ịkwụsị ihe gbatara ndị ntoroọbịa jiri mee ngagharịiwe EndSARS n'afọ 2020, kama ihe na-ebe ka na ebe kwa".

Adegboruwa kwukwara ka gọọmentị mezue ndụmọdụ nzụkọ ehiwere maka EndSARS nyere nke gụnyere ikuziri ndị uweojii maka ikike dịịrị onye.

Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa chọrọ ka a kwụsị Drambi Vandi gbagburu Bolanle Raheem ọrụ nwa mgbenta

Nigerian Police Force/Bolanle

Ebe foto si, Nigerian Police Force

Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa bụ Usman Alkali Baba ezipụtala ozi ọhụrụ n’okwu mgbagbu ọkaiwu Omobolanle Raheem nke kwuru na ọ na-achọ ka a kwụsị Drambi Vandi gbagburu ya ọrụ nwa mgbenta ma mee nke a ngwa ngwa.

N’ozi a nke ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naịjirịa bụ Olumuyiwa Adejobi binyereaka ma zipụta taa bụ Wenezde, abalị 28 nke ọnwa Disemba, 2022, Alkali Baba kwuru na"‘Nke a bụ iji hụ na e nyere ohere zuruoke n’ikpe a ma nweta ikpe ziri ezi nke ihe ọbụla agaghị echere aka mgba.”

Ọ gara n’ihu kwuo “Nkwụsị n’ọrụ nwa mgbenta a so n’usoro ntaramahụhụ ndị uweojii Naịjirịa.”

Ọ gakwara n'ihu gbaa ọha ume n’okwu ikpe a ma kọwa na ha ga-ahụ na ikpe ziri ezi pụtara na ya nke ga-egbochi ụdịrị ihe a ime ọzọ n’ọdịnaịhụ.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legọs steeti bụ Benjamin Hundeyin zipụkwara ozi gosiri foto onye uweojii a a sị gbagburu Bolanle.

N'ozi ya n'akara Twitter ya n'abalị Wenezde, o dere: "E ziagala mpụtara nnyocha anyị mere n'isi ya n'isi ụlọọrụ ndị uweojii n'Abuja".

Nke a na-abịa dịka o kwu bụrụ n'ụbọchị 26 nke ọnwa Disemba na ha nyefere okwu inyocha ọnwụ Bolanle n'aka ngalaba ndị uweojii pụrụiche bụ 'State Criminal Investigation and Intelligence Department' (SCID).

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2

Atara m ahụhụ, ree oroma iji zụlite nwa m a ndị uweojii gburu - Nne Bolanle Raheem

Bolanle Raheem

Ebe foto si, Bolanle Raheem

Nkọwa foto, Otu onye uweojii gbagburu Bolanle Raheem n'ụbọchị ekeresimesi 2022 na Legọs

Nne Bolanle Raheem, bụ onye ọkaiwu otu onye uweojii gbagburu n'ụbọchị ekeresimesi n'Ajah, Legọs, akọọla akụkọ etu o si taa ahụhụ iji zulite nwa ya nwaanyị a ndị uweojii gburu.

Ọ kọrọ akụkọ a oge Kọmishọna ndị uweojii Legọs bụ Abiodun Alabi gara njem iti aka n'obi n'ezinụlọ Raheem n'ụbọchị Tuzde.

"Onweghị ihe mụ emeghị iji zụlite nwa m nwaanyị a ka ọ bụrụ onye ọkaiwu," nne Bolanle kwuru.

"Atara m ahụhụ n'isi ya, bugharịa oroma n'okporoụzọ, ugbua ka m kwesịri ị na-enwe aṅụrị ma na-eri uru ahụhụ m tara. Chineke biko lụọrọ m ọgụ a."

N'okwu nke ya Kọmishọna ndị uweojii ahụ kwere nkwa na onye uweojii mere ihe a ga-anatarịrị ntaramahụhụ kwesịrị ya.

"Nwa m dị ime ejima tupu ndị uweojii egbuo ya"

Kọmishọna uweojii na-akasi nne Bolanle Raheem obi

Ebe foto si, Ezinụlọ Bolanle

Nkọwa foto, Kọmishọna ndị uweojii na Legọs (yi akwa ọbara ọbara) na-akasi nne Bolanle Raheem obi

Nne Bolanle Raheem gara n'ihu kwuo na nwa ya dị ime ejime oge onye uweojii ahụ gbara ya egbe.

"Agaghị m ahụkwa ọkaiwu m ọzọ. Ndị mmadụ na-akpọ ya 'The Law'. Ha anapụla mụ nwa m. Ọ dị ime ejima," nne Bolanle na-ekwu dịka ọ na-ebe akwa.

"Ọ nwụọla n'otito ya niile. Ọ hapụrụ nwata nwaanyị dị afọ ise. Ha anapụla m ya."

"Ọ dịghị mfe ichefu ya maka ihi ahụhụ m tara iji zụlite ya."

Ogbugbu onye otu anyị gburu Bolanle Raheem jọgburu onwe ya - Onyeisi ndị uweojii

Usman Alkali Baba na Bolanle Raheem

Ebe foto si, Nigerian Police/Bolanle Raheem

Onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Usman Alkali Baba akatọọla ogbugbu otu onye uweojii gburu ọkaiwu bụ Bolanle Raheem n'ụbọchị ekeresimesi bụ 25 Disemba na mpaghara Ajah dị na Legọs Steeti.

Alkali Baba nyere iwu ka e mee nyocha ngwa ngwa ma kpee onye uweojii ahụ ikpe ma sị na nke a megidere usoro ndị uweojii ji arụ ọrụ.

O tikwara ndị ezinaụlọ, ndị enyi nakwa ndị ọrụ Bolanle aka n’obi maka ọnwụ ya ma kpee ekpere sị ka obi ya laa na ndokwa.

O kwekwara ọha na eze nkwa inwete ikpe ziri ezi ma dọọ ndị uweojii aka na ntị ka ha were usoro iwu na-arụ ọrụ ha.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Akụkọ kwuru na ọkaiwu a, onye a sị na ọ dịkwa ime, na ndị ezinụlọ ya si n'ụlọụka na-ala dịka ha gachara ụka ekeresimesi oge ya bụ ihe mere.

Amabeghị aha onye uweojii mere ihe a, mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legọs bụ Benjamin Hundeyin kwuru na ha anwụchiela onye uweojii ahụ nakwa ndị uweojii abụọ ọzọ ha na ya nọ ọrụ oge ya bụ ihe mere.

Ndị hụrụ ihe merenụ kwuru na onye uweojii ahụ gbara Bolanle Raheem egbe n'ime ụgbọala ya na nso 'Ajah Bridge'.

"Anyị anwụchiela onye uweojii gbara egbe ahụ na ndị uweojii abụọ ọzọ ya na ha nọ," Hundeyin kwuru site n'akara Twitter ya.

"A kpọfeela ha na ngalaba nnyocha SCID maka nnyocha miri emi."

Nke a ga-eme ugboro abụọ ndị uweojii ga-agbagbu ndị nkịtị na mpaghara Ajah Legọs n'ime ọnwa Disemba afọ 2022.

N'ụbọchị 6 Disemba, onye uweojii gbagburu otu nwoke a kpọrọ Gafaru Buraimoh bi n'ogige Happy Land Estate dị n'Ajah.

Benjamin Hundeyin n'ekwuru ndị uweojii sị na a nwuchiela onye uweojii a ebe nyocha na-aga n'ihu ugbua.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 3

Ihe ndị NBA kwuru

Otu jikọrọ ndị ọkaiwu na Naịjirịa bụ 'Nigeria Bar Association', ngalaba nke Legọs steeti, kwuru na ha ga-ahụrịrị na ezinụlọ Bolanle Raheem nwetara ikpe ziri ezi.

Ode akwụkwọ mgbasaozi otu a bụ Akorede Lawal kwuru na ya bụ ihe dị mwute nke ukwuu, mana na ha ga-agba mbọ nweta ikpe kwụ ọtọ.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 4

Aka ike ndị uweojii na Naịjirịa

Skip X post, 5
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 5

Ogbugbu ndị mmadụ n'aka ndị ọrụ nchekwa na Naịjirịa na-arị elu n'ọdị nso a dịka ngụkọ si gosi.

N'afọ 2021, nnyocha nke otu 'Centre for Democracy and Development' mere gosiri na ihe ruru mmadụ 13,000 anwụọla n;aka ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa n'ime afọ iri gara aga.

Ọ bụ eziokwu na ndị uweojii, ndị agha na ndịọrụ nchekwa ndị ọzọ na-ekwu na ha na-enye ndị otu ha ntaramahụhụ n'ihi imekpa ndị mmadụ ahụ n'ụzọ ezighi ezi, mana nke a emebeghị ka ya bụ ihe kwụsị kpamkpam.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia

Skip X post, 6
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 6

Ọtụtu ndị mmadụ na soshal midia akatọọla ihe ha kpọrọ aka ike ndị uweojii ji akpaso ndị mmadụ agwa na Naịjirịa.

Cheta na ọ bụ n'ihi aka ike ndị uweojii ka ndị ntorobịa Naịjirịa ji mee ngagharịiwe kpụ ọkụ n'ọnụ n'afọ 2020 nke a kpọrọ 'End SARS'.

Otu onye a ma ama n'ịkpa ọchị bụ Debo Adebayo, onye e ji Mr Macaroni mara, kọwara ogbugbu Bolanle Raheem dịka nnukwu ihe ọjọọ.

Macaroni kwuru na ọ bụkwa otu onye uweojii si n'ụlọọrụ Ajiwe gburu otu nwoke aha ya bụ Gafaru Buraimoh ihe dịka izuụka abụọ gara aga.

Lee ihe ọzọ ndị mmadụ kwuru:

Skip X post, 7
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 7

Skip X post, 8

End of X post, 8

Skip X post, 9

End of X post, 9

Onye bụ Bolanle Raheem

Bolanle Raheem

Ebe foto si, Bolanle Raheem

  • Ewepụ na ọ bụ onye ọkaiwu, Bolanle Raheem bụkwa onye na-agba mgbere ụlọ na ala, nke a na-akpọ 'realtor' na Bekee.
  • Ọ na-arụ n'ụlọọrụ 'Tribitat Real Estate'
  • Ọ gụrụ akwụkwọ ma nweta ọzụzụ dịka ọkaiwu n'ụlọ akwụkwọ 'Ogun State University'.
  • Ọ lụrụ di ma mụọ otu nwa, ụfọdụ sịkwa na ọ dị ime tupu ọnwụ ya.