Ọgba Mbọ: Ekweghị m ka isi m kpuru gbochie iji aka m emepụta ihe dị mma - Ifeanyi Ukwueze

Aha onyonyo, Ọgba Mbọ: Ekweghị m ka isi m kpuru gbochie iji aka m emepụta ihe dị mma - Ifeanyi Ukwueze
    • Onye dere ya, Ebere Ekeopara na Vining Ogu
    • Ndị mere akụkọ a, Reporter na Shoot/Edit
    • Ebeg o si, Enugu

Ọtụtụ mgbe ka ndị kpuru isi na arịọ arịrịọ n'okporoụzọ dị icheiche na Naijiria, n'ihi enweghi ọrụ ha nwere ike ịrụ.

Mana otu nwa agbọghọ anaghị ahụ ụzọ aha ya bụ Ifeanyi Ukwueze egosiputala na onye kpuru isi nwere ike ịrụ ọrụ nke oma.

Nwada Ifeanyi, bụ onye si n'okpuru ọchịchị Igboeze South n'Enugwu steeti kọwara na ya jisiri ike ga mụọ ka esi arụpụta ncha, isisi oma (air freshner) ncha ntụ (detergent), ncha mmiri (Liquid soap) na ihe ndị ọzọ, bụ nke o nyere aha 'deep love'.

Ọ mụtara ihe ndị a n'ụlọ nkuzi 'Potters wheels foundation' dị n'Enugwu, ebe otu ụkọchukwu aha ya bụ Godson Onuzulike na-akụziri ndị ntorobịa nakwa ndị ọrụsi, na-anaghị ha ego ọbụla, etu ha nwere ike iji aka ha na-emepụta ihe di icheiche iji enyere onwe ha aka.

Ugbua nwada Ifeanyi nọ n'ụlọ ya na-emepụta ihe ndị ahụ ma na-ere ha n'ahịa dị icheiche n'Enugwu nke mere ka ọ bụrụ onye a ma ama.

Gere akụkọ nwaada Ifeanyi Ukwueze n'ihe onyonyo a dị n'elu. 

Ifeanyi Ukwueze