Ọgba mbọ: Etu m siri malite ịrụpụta akpụkpọụkwụ na-amụghị ya amụ - Anastasia Uzodinma

Aha onyonyo, Etu m siri malite imepụta akpụ ụkwụ ma na-amụghị ya amụ - Nwaada Chinomso Uzodinma
Ọgba mbọ: Etu m siri malite ịrụpụta akpụkpọụkwụ na-amụghị ya amụ - Anastasia Uzodinma

Otu nwaada aha ya bụ Chinomso Uzodinma Anastasian'Imo steeti akọwaala etu o siri ghara ịga ụlọakwụkwọ ọbụla ebe a na-amụ ọrụ ịme akpụ ụkwụ ma na-emepụtazi ya bụ ihe ugbua.

Nwaada Uzodinma kọwara na ọ mụrụ ya site n’ele ụfọdụ ụmụokorobịa ndị na-arụ ya n’akụkụ be ya n’oge gara aga anya.

O kwuru na o tinyere uchu malite rụpụtakwa ya nwayọ nwayọ ma ugbua, o nweela ụlọọrụ nakwa ụlọahịa ebe a na-arụ ma na-erekwa akpụ ụkwọ ugbua.

Nwaada na-emepụta akpụ ụkwụ
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

O gosipụtara usoro o ji arụ akpụ ụkwụ n’ihe onyonyo a ma kwuo na ya bụ ihe na-enye ya ego nke ukwu.

Ọ kọwakwara na ịbụ onye nwaanyị bịara dịtu ka ihe aka mgbe ya ọrụ a mana ọ naghị egbochi ya ịrụ ọrụ.

Nwaada Uzodinma kwuru na o nwere nzube na aka ọrụ ya nakwa ụlọọrụ ya ga-etolite ruo mgbe ọ ga na-arụpụta ọtụtụ akpụ ụkwụ ma na-enyekwa ndị ọzọ ọkachasị ndị ntorobịa ọzụzụ n’ọrụ aka a.

Kiri ihe onyonyo ka ị hụ aka ọrụ ya nakwa ihe o kwuru n’uju.