Ọgba mbọ: Etu m siri malite ịrụpụta akpụkpọụkwụ na-amụghị ya amụ - Anastasia Uzodinma
Otu nwaada aha ya bụ Chinomso Uzodinma Anastasian'Imo steeti akọwaala etu o siri ghara ịga ụlọakwụkwọ ọbụla ebe a na-amụ ọrụ ịme akpụ ụkwụ ma na-emepụtazi ya bụ ihe ugbua.
Nwaada Uzodinma kọwara na ọ mụrụ ya site n’ele ụfọdụ ụmụokorobịa ndị na-arụ ya n’akụkụ be ya n’oge gara aga anya.
O kwuru na o tinyere uchu malite rụpụtakwa ya nwayọ nwayọ ma ugbua, o nweela ụlọọrụ nakwa ụlọahịa ebe a na-arụ ma na-erekwa akpụ ụkwọ ugbua.

O gosipụtara usoro o ji arụ akpụ ụkwụ n’ihe onyonyo a ma kwuo na ya bụ ihe na-enye ya ego nke ukwu.
Ọ kọwakwara na ịbụ onye nwaanyị bịara dịtu ka ihe aka mgbe ya ọrụ a mana ọ naghị egbochi ya ịrụ ọrụ.
Nwaada Uzodinma kwuru na o nwere nzube na aka ọrụ ya nakwa ụlọọrụ ya ga-etolite ruo mgbe ọ ga na-arụpụta ọtụtụ akpụ ụkwụ ma na-enyekwa ndị ọzọ ọkachasị ndị ntorobịa ọzụzụ n’ọrụ aka a.
Kiri ihe onyonyo ka ị hụ aka ọrụ ya nakwa ihe o kwuru n’uju.



