Akwakanti, ntụrịkọ mkpụrụamụ na ọrịa ụmụaka ndị ọzọ nwere ike bute atụghị ime maọbụ atụnyelighị nwaanyị ime n'ọdịnihu

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Uche Akolisa
- Ndị mere akụkọ a, Senior journalist
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6
Amụtaghị nwa bụ nsogbu na-emetụta otu n'ime mmadụ isii n'ụwa dum., dịka ụlọrụ ahụike mba ụwa bụ WHO si kwuo.
E kwube okwu nsogbu amụtaghị nwa, ebe ọtụtụ ndị mmadụ na-elegara anya bụ ndị okenye na ndị toroola eto.
Mana ị matara na e nwere ụfọdụ nsogbu amụtaghị nwa ntọala ha si n'oge mmadụ dị na nwata?
Dịka Dkta ahụike ụmụnwaanyị bụ Dkta Nkiru Uche-Nwidagu si kwuo, e nwere ọrịa ụmụaka na-arịa nwere ike igbochi ha ịtụ ime maọbụ ịtụnyeli nwaanyị ime n'ọdịnihu.

Ebe foto si, Iwaria
"Ọmụmu na-amalite oge a tụụrụ ime mmadụ, oge ọ ka nọ n'afọ."
Lee ụfọdụ ọrịa ndị a na ihe ndị ị maghị maka ha dịka ndị dọkịta ọkaibe si kọwaa ha:
1. Ọrịa kansa ụmụaka

Ebe foto si, Getty images
Igbo kwuru sị na a gwọchaa onye ara, a naghị agwọta ya igbu n'iku.
A gwọcha ụfọdụ ọrịa, a naghị agwọpụ ihe so ya.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Mgbe ụfọdụ a na-agwọta mmadụ ọrịa kansa.
Mana amụghị nwa so na ndapụta na-eso nwata ịrịa ọrịa kansa.
Dịka ọkachamara n'ọrịa kansa bụ Dkta Nkolika Nwankwo si kọwaa, ụfọdụ kansa na ụsoro e ji agwọ ha nwere ike ime nwata o nwee nsogbu amụghị nwa.
Dkta Nwankwo, onye na-arụ n'ụlọọgwụ 'University of Kansas Medical Center' Amerịka, kwuru sị, "Kansa nke metụtara akụkụ ahụ nwoke jiri bụrụ nwoke maọbụ nwaanyị ji bụrụ nwaanyị na-emetụta ọmụmụ karịa kansa ndị ọzọ."
"Kansa na ihe na-eme akụkụ ahụ ebe o mere mmadụ dị oke mkpa."
"Ụmụaka ụmụnwaanyị a na-eji ihe nile ha bụtara eku ume."
Otu "American Cancer Society' kwuru sị, "A na-atụ uche na ndị a gwọrọ kansa na nwata maọbụ oge ha na-etolite etolite na-enwe nsogbu ọmụmụ".
Mana Dkta Nwankwo kwuru sị, "Ọ bụrụ na nleta site na ịwa ahụ nakwa ịcha ọkụ-(radiation), nwa ahụ ga-enwe nsogbu ọmụmụ."
Ụlọọrụ na-eme nchọpụta maka ọrịa kansa n'ụwa bụ 'International Agency for Research on Cancer' na-ekwu na n'afọ 2022, a chọpụtara na ụmụaka na ndị na-etolite etolite dị rue afọ 19 na-arịa ọrịa kansa n'ụwa karịrị 275,000.
Dịka ihe ruru ọkara ha, bụ 105,00 na-anwụ site n'ọrịa, e nwere atụmuche na ndị dị ndụ n'ime ha rue okenye ga-eso na ndị ọmụmụ ga-enye nsogbu.
2. Akwakanti

Ebe foto si, Getty Images
Akwakanti bụ ọrịa na-efe efe nke ihe e ji mara ya bụ agba ịza aza, ahụọkụ, ike ọgwụgwụ na agụ agụghị.
Ụfọdụ na-eche na ọrịa akwakanti bụ obere ihe ga-abụ o mee nwata, ọ laara onwe ya na-enweghị nsogbu.
Mana ọtụtụ amaghị na nsogbu a nwere ike ị nara nwata rịara ya ụra rahụọ n'oge okenye ya ọ ga ọ ga-achọ ịmalite ezinaụlọ.
Dkta Nwidagu kwuru s ị, " Ọ bụrụ na agwọghị ọria akwakanti ọfụma, ọ banye n'akpaamụ nwata nwoke, ọ na-eme ka mkpụrụ amụ zaa aza ma mee ka mmepụta olulu sie ike."
Ọ bụghị naanị nwa nwoke ka ọrịa akwakanti na-emebiri ihe, O nwere ike igbochikwa nwa nwaanyị ịtụ ime.
Dịka Dkta Nwidagu sị kọwaa, akwakanti nwaanyị nke Bekee kpọrọ "mumps overatis' "na-eme ka 'ovary 'zaa aza ma gbochie akwa dị n'ahụ nwaanyị ito etu o kwesịrị."
"Nke a nwere ike ibute nsogbu 'ovulation' na atụghị ime."
3. Ọnọdụ enweghị akpanwa

Ebe foto si, Getty Images
Ọnọdụ enweghị akpa nwa nke Bekee kpọrọ 'Mayer-Rokitansky-Küster-Hauser (MRKH) Syndrome' bụ ọrịa na-eme ka a mụọ nwa nwaanyị enweghị ọtụ maọbụ akpanwa.
Dịka Dọkịta Nkiruka Uche-Nwidagu si kọwaa ọrịa, "Nke a bụ enweghị akpanwa, enweghị ọtụ maọbụ ọtụ emepeghị emepe."
Ụfọdụ nchọpụta na-egosi na nwaanyị nwere ọrịa a anaghị ahụ nsọ ha n'ihi enweghị akpa nwa.
4. Ọrịa ntụrịkọ akpa amụ (testicular torsion)

Ebe foto si, Getty Images
Nke a bụ mgbe akwara ji akpa amụ tụrịkọrọ n'onwe ya nke nwere ike igbochi ọbara ịgazu n'akpa amụ nke nwere ike ime ka amụ nwụọ ma ọ bụrụ na emeghị ngwangwa leta ya.
Ụfọdụ nnyocha e merela gosiri na ọrịa ntụrịkọ akwara akpa amụ nwere ike ibute uhi adịghị mma ( low sperm counts/poor sperm motility).
Dọkịta Nkiruka Uche-Nwidagu sịrị, "Mgbe nwa nwoke maọbụ okenye na-enye mkpesa na akpa amụ na-afụ ya ụfụ, inye ya ọgwụ ahụ mgbu, na-agaghị chọpụta ihe butere ahụmgbu ahụ, ntụrịkọ akpa amụ ga-egbochi ọbara na-agagharị n'akpaamụ nke ga-emetụta ọmụmụ."
"Ya bụ na nke ga-egbochi onye ahụ imepụta ọlụlụ nke ga-ebutere ya nsogbu amụghị nwa n'ọdịnihu."
Ọnọdụ otu onye inwe ahụ nwoke na ahụ nwaanyị
Nwata inwekọta ahụ nwoke na ahụ nwaanyị bụ nsogbu ọzọ dị n'ụmụaka nke nwere ike igbochi ọmụmụ n'ọdịnihu, dịka Dkta Nwigagu si kọwaa.
5. Mkpụrụamụ ikoro n'elu (Undescended testes)

Ebe foto si, Getty Images
Ọrịa ụmụaka ọzọ nwere ike ịnapụ mmadụ ohere ịmụta nwa bụ ọrịa inwe akpa amụ mkpụrụ amụ adịghị, nke Bekee kpọrọ 'undescended testes.
Mgbe ụfọdụ a mụọ nwa nwoke, o nwere ike mkpụrụ amụ ya e koro ekoro, agaghị ahụ ya n'ime akpa amụ.
Ụfọdụ a na-ahụ otu mkpụrụ amụ mana mgbe ụfọdụ anaghị ahụ mkpụrụ amụ mancha bụ nke nwere ike bụụrụ nwata ọgbatauhie ma o tozuo ihe e ji nwoke eme.
Ya mere dịka Dkta Uche-Nwidagu si kwuo, "Ọ dị mkpa na a mụọ nwa, 'midwife' elee akpa amụ nwata, mara ma mkpụrụ amụ ya adịkwa n'ime akpa amụ ya."
"Ọ bụrụ na mkpụrụ amụ adịghị n'akpa amụ, o nwere ike imetụta ọmụmụ n'ihi na ọkụ dị n'ime afọ ebe akpa amụ si topụta adịghị mma maka mmepụta ọlụlụ (spermatogenesis) nke pụtara na onye ahụ agaghị na-emepụtali ọlụlụ (sperm)."
"Ọ bụrụ na a mụpụta nwanwoke na-achọpụtaghị na mkpụrụ amụ adịghị n'akpa amụ, mkpụrụ amụ ya ga-anọ ebe ahụ, ọ gaghị eto dịka o kwesịrị, nke ga-ebutere ya nsogbu oge ọ ga-etozu okorobịa ma mee ka o nwee nsogbu ịtụnyeli nwaanyị ime."
Ngalaba na-ahụ maka ahụike mba Briten bụ NHS kwuru na webụsaịt ha na otu n'ime ụmụaka nwoke 25 bụ ndị e ji nsogbu mkpụrụ amụ kooro ekoro mụọ.
Ụlọọrụ ahụ rụtụkwara aka na ndị nwere nsogbu ahụ na nwata nwere ike inwe nsogbu kansa nke mkpụrụ amụ maọbụ nsogbu amụtaghị nwa ma ọ bụrụ na a gwọghị ya oge ọ dị na nwata.












